Biafra Separatists: Ebubo Gọọmenti etiti boro Ipob bụ ebubo ụgha - Ikokwu

Guy Ikokwu na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Guy Ikokwu na Nnamdi Kanu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Guy Ikokwu bụ otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu ekwuola na ebubo gọọmentị Naịjirịa boro otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ "okwu ụgha."

Nke a na-abịa dịka gọomentị boro Ipob ebubo igobi ndị ọcha ka ha were akụkọ ụgha na-etisa mmekọrịta dị n'etiti Naijiria na mba Briten, Amerika na ndị ọzọ.

Ụlọọrụ onyeisiala boburu ebubo na nnyocha ha mere gosiri na Ipob ji mbombo ego na-agbasa ozi ụgha nke kwuru na a na-akpagbu ndị otu Kraisti na Naijiria nke ha ji etisa ezigbo mmekọrịta dị n'etiti gọọmenti Naịjirịa, mba Amerịka, UK nakwa Yurop.

Mana Ikokwu, onye bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchi n'oge agba nke abụọ ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria (Second Republic) kwuru na ebubo ahụ bụ okpotokpo asị.

"Ihe ha na-ebo Ipob sị na Ipob were nde dọla iri asatọ na ise (85 million dollar) nye ndị ọcha bụ oke asị.

Ihe a bụ ka ha were tinye aghara na be anyị. Ka ndị mmadụ were jụwazie Ipob e nwere ụdị ego a?"

Guy Ikokwu

Ebe foto si, Guy Ikokwu

Nkọwa foto, Guy Ikokwu bụ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'oge agba nke abụọ ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria (Second Republic)

O boro ebubo na gọọmenti gbara nkiti ndị na-eyi ndụ egwu na ndị ochiehi na-egbusi mmadu, na-emebi ihe ndị mmadụ kọrọ ọkachasị ndị otu Kraist kọrọ na enweghị ntaramahụhụ ọbụla.

Ikokwu onye bụ onye ndọrọndọrọ welitara isi n'ọchịchị oge ndị agbada agba nke abụọ na Naijiria (second republic) dọọ ndị Igbo aka na ntị ka ha mụrụ anya dịka azụ n'ihi na "Onye ndị iro gbara gburugburu na-eche ndụ ya nche mgbe niile."

"Ha ji ọkwa, jide ihe e ji alụ ọgụ na ihe niile e ji achị ọchịchị," na-akpọbata ndị be si mba ndị ọzọ na Naijiria iji weghara naijiria. eme ihe masiri ha ma gba nkikiti ka ndị ụka alakuba na-emekpa ndị otu Kraisti ahụ.

O kwuru na mkpu Ipob na-eti bụ ka ụwa nụrụ olu ha banyere mmegbu ndị Igbo na-agabiga na Naijiria.

Ikokwu kọwara na ndị Igbo anaghị achọ okwu ebe ọbụla ha gara kama ọ bụ ọganihu na ndozi obodo.

Gee ihe guy Ikokwu kwuru n'uju ebe a:

Aha onyonyo, 'Ebubo Gọọmenti etiti boro Ipob bụ ebubo ugha'

Ihe 10 Garba Shehu boro Ipob ọhụrụ a

Kanu/Shehu

Ebe foto si, Getty Images/Garba Shehu Facebook

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjiria bụ Garba Shehu ekwuola ka otu Indigenous People of Biafra(Ipob) si eji ebubo gbasara imegide ndị ụka Kraist akatọ mba Naịjiria.

O kwuru na ụlọọrụ onyeisiala sị n'aka ngalaba na-emere gọọmenti nyocha chọpụta na Ipob na-agbasa ozi ụgha gbara ụzọ abụọ n'otu mgbe gbasara mmegide a.

O kwuru na ozi ụgha abụọ ahụ ji mkpụchị ụka Kraist na-akpọkụ ndị isi mba Amerịka ka ha kwụsị oke ogbugbu ndị ụka Kraist mana ha ma na ọ bụ iji tisa ezigbo mmekọrịta dị n'etiti gọọmenti Naịjirịa, mba US, UK nakwa Yurop.

Lee ihe ndị ọzọ o depụtara ebe a.

  • Ndị isi otu Ipob na-etu onwe ha ndị ụka Jew, nke ọtụtụ ndị otu ha ekwenyeghị na ya.
  • Nnamdi Kanu na-ekoro na ọ na-emenyere ndị ụka Kraist mana ọbụghị eziokwu. O na-akwado ọchịchọ nwereonwe site n'ikwu na gọọmenti Naịjirịa ji aka ike otu onye achị ndị mba ahụ nke mere o ji eche na ogbugbo ya bụ ikewapụta Biafra site na Naịjirịa.
  • O na-enye ndị Naịjirịa ndụmọdụ ha kpachapụ anya maka akụkọ nkewa Ipob na-ekesasi, nke nchọpụta ha mere na-egosi eji ego ruru puku dọla iri asatọ na ise($85,000 USD) kamgbe ọktoba 2019, ghara inwe ebe a na-edekọ ebe ya bụ ego si apụta.
  • Nkesa ozi ụgha a gụnyere idepụta akwụkwọ n'aha ụgha ndị isi ngalaba nke ụka Kraist nke ha hibere mgbe ya na otu ụlọọrụ US binyere aka n'akwụkwọ ya na akwụkwọ ndị si n'aka ụfọdụ ndị ulọomeiwu mba haụ gawa n'ụlọọrụ onyeisiala Amerịka.
  • Ụlọọrụ enyemaka ahụ dị n'Amerịka hibere ọgbakọ ha na odee akwụkwọ Amerịka bụ Mike Pompeo nwere ma mekwa ihe ngosi na 'US commissions' gbasara ikike diri onye maka okpukperechi mba ofesi.
  • Ego Ipob mapụtara nwerike ịkwụli ụlọọrụ mmekọrịta ọha ruru anọ nọ na UK, Belgium, France nakwa US.
  • O kwuru na n'ihi ụfọdụ nchọpụta a ụlọọrụ onyeisiala merela na ọ ga-adịmma ka ụmụ Naịjirịa leghara akụkọ ụgha ndị a na-achọ ibute nkewa n'etiti Naịjirịa na obodo ndị ha na ha na-emekọrịta n'ofesi a dịka etu ha si leghara ndị ọzọ si n'otu Ipob nke gọọmenti Naịjirịa kpọputara dịka otu oyi egwu.

O kwuru na ngalaba ndị dị n'ofesi nwereike ị bia Naịjirịa bịa hụ asị otu Ipob na-atụ ka wee were aghụgho nata ha ego ma tinye ha n'ajọ omume nke ha ji etigharị ha naya ka ha wee mebie mmekọrịta ndị mba ofesi na Naịjirịa.

Lee ihe Nnamdi Kanu sara ya

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, MaziNnamdiKanu/Twitter

Onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ugbua ụwa niile amarala ebe ego ndị otu ya na-atụkọta na-aga.

Ọ gara n'ihu rụtụ aka n'ozi si n'akwukwọ otu ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu.

Kanu kwuru na Shehu depụtara na Ipob na-ebogide Naịjirịa ebubo ụgha gbasara mmegide ndị ụka Kraist nke eji ego ruru puku dọla iri asatọ na ise akwado kamgbe ọnwa Ọktoba n'ime afọ 2019.

Nke a mere ka Nnamdi Kanu kwuo na ya enweghị ụgbọala, ụlọ oriri na nkwari maọbụ mahadum, wdgz mana o nwere amara Chukwu Okike Abiama.

O kwukwara na ya ji ego niile ndị otu Ipob na-atụkọta agba mbọ nnwereonwe ha nakwa ịgbajọ Naịjirịa.

N'ọkwu ya, Naijịrịa ekwetala na Ipob na-emefu ego n'ihe gbasara mmekọrịta ndị otu Ipob na ndị mba ofesi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: