Diezani Alison-Madueke ọ bụrụla nwafọ mba Dominica Republic?

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị mmadụ kpụ Diezani Alison-Madueke bụbu minista mmanụ agbịdị na Naịjirịa n'ọnụ ọzọ na soshal midia.
Nke ugbua kepukepu si na soshal midia sị na nwaanyị a nọ na mba UK ugbua ka bụzi nwafọ mba Dominica Republic na Caribbean.
Mana ntule BBC Pidgin mere gosiri na akụkọ a abụghị ihe ọhụrụ dịka nyocha sị n'aka ụlọọrụ ntaakụkọ Al Jazeera n'afọ gara aga kwuru etu minista a ji nara akwụkwọ mkpuchi mba Caribbean. Nyocha a jikọrọ Alison-Madueke na Praịm minista mba Dominica bụ Roosevelt Skerrit nakwa otu ụlọ dị na New York ọnụego ya nde dọla 2.2.
Ha sị na Alison-Madueke zụrụ ụlọ ahụ ma were ya kwụọ ụgwọ iji inwete akwụkwọ mkpuchi nke mba Dominica.
Mana ọ dịla na mbụ gọnarị akụkọ a pụtara n'ọnwa Nọvemba afọ 2009.
BBC Pidgin amaghị ugbua ma o nwere ihe ọzọ dapụtara n'okwu a nke mere ndị mmadụ ji kpụrụ Diezani n'ọnụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nke a
@TenderSoul sị na ọ gbakọ ego niile a sị Diezani zuru na o nweghi ike ile nne ya anya n'ihu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@bo_agboola sị na Diezani ji ha gbaa chaachaa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@TheMrnass jụrụ sị "onye bụ eze n'etiti Abacha na Diezani?"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Gịnị bụ akwụkwọ mkpuchi?
Akwụkwọ mkpuchi bụ akwụkwọ ikike baara ezigbo uru nke ndị nwere ego nwereike ịnata n'aka ọtụtụ mba dị iche iche.
Akatọọla ọtụtụ mba dị n'Afrịka, Asia nakwa Caribbean, sị na ha na-ere akwụkwọ mkpuchi a iji kpuchi ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha gbanarị nyocha maọbụ ịma ha ikpe.
Akwụkwọ a na-enye ha ikike ime ihe ọbụla na mba ahụ nakwa akwụghị ụgwọ ụtụisi n'ọtụtụ ihe ha zụrụ dgz.
Cheta na ụlọọrụ EFCC na-enyocha Diezani kamgbe afọ 2014 maka ebubo mpụ na nrụrụaka dị iche iche mgbe ọ bụ minista mmanụ agbịdị.
Ha adịla na mbụ kpachie ọtụtụ akụnaụba ya gụnyere ọla olu na aka ọnụego ya dị nde dọla 40 site na nkwado ụlọikpe.
Mba ndị dịka Amerịka na UK na-enyocha Alison-Madueke maka ebubo mpụ na nrụrụaka.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:








