EFCC: Ka anyị ga-esi nwụchi Diezani Alison-Madueke

Diezani Alison-Madueke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Diezani ka na-agọ ebubo dị ya n'isi

Ọkaikpe Valentine Ashi nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela ụlọọrụ na-ahụ maka mmegide mmerụka na mpụ akpọrọ EFCC, iwu maka nwụchi Diezani Alison-Madueke.

Iwu a kwukwara ka ndị uweojii Naịjirịa, nakwa DSS tinye aka ịhụ na a nwụchiri Alison-Madueke bụbu minista na-ahụ maka mmanụ ụgbọala, n'ime ụbọchị atọ.

Madueke kwuru na onweghị nrụrụaka o mere.

Ọkaikpe Ashi nyere iwu a ka onye ọkaiwu ndị EFCC bụ Msuur Denga, tinyere akwụkwọ ga-akwụsịgodu ikpe ma nye ha ikike ịnwụchị Alison-Madueke ma kpụpụ ya ụlọikpe maka nrụrụaka ego a na-ebo ya na Naịjirịa.

Ụlọọrụ EFCC bidoro nyochawa Alison-Madueke na Jide Omokore (Onyeisioche ụlọọrụ Atlantic Energy Drilling), kamgbe ọnwa Oktoba 2013; mgbe otu a kpọrọ "Coalition Against Corrupt Leaders, CACOL, kpesara ha maka nrụrụaka ego na mpụ.

EFCC kwuru na Alison-Madueke ahapụrụla gọọmenti etiti ego ruru dọla nde narị na iri ise na atọ ($153M) ka ụlọikpe ukwu nyechara ya iwu n'afọ 2017.

Nchọpụta ha mere gosiri na mgbe Madueke bụ minista, na o mere ọrụ ngo mmanụ agbịdị nrụrụaka juru n'aha gọọmenti etiti.

Ha na-ebo Alison-Madueke na Omokore na ha nyere ndị mmadụ ihe nrite dịka ụlọ obibi.

A ga-akpụpụ ha n'ụlọikpe n'ụbọchị nke iri abuọ na ise nke ọnwa Febrụwarị, afọ 2019.

Cheta na mgbe ikpe a putaburu n'ụlọikpe n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba 2018, EFCC kwuru ka e nye ha ikike ịkpọbata Alison-Madueke nọ mba Uk, ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: