Lagos: Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ na 3rd Mainland Bridge
Akụkọ dị mkpa
Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ

Ebe foto si, @GovAyofayose
Akụkọ na-eru Igbo ntị ugbua na-ekwu na Gọvanọ ochie ndị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ na akwammiri nke atọ dị na Legos n'ihihie Wenezde.
Odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Lere Olayinka depere nke a n'akara Twitter ya.

Ebe foto si, NASS
Onye na-anọchite mpaghara Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nta bụ Gabriel Onyewinfe agbarala APGA ụgbọ nwamkpi, ma banye PDP.
Onyeisi ụlọomeiwu bụ Yakubu Dogara gbara ama nke a oge ọ gụpụtara akwụkwọ ozi nke Onyewinfe detara n' ụbọchị Wenezde.
Nwaanyị nwụrụ n'aka di ya

Ebe foto si, Family Photo
N'ofesi, otu nwoke ahịgbuola nwunye ya maka na ọ chọrọ ka ya na nwoke ibe ya biriwazịa ka di na nwunye.
Mitesh Patel gbara afọ iri atọ n'asaa (37) ga-aga nga afọ iri atọ maka igbu nwunye ya bụ Jessica dịka ọkaikpe Justice Goss si kpebie.
N'egwuruegwu,

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, Burnley na Liverpool ga-ezute n'Elekere asaa an mmede a ebe Everton na Newcastle ga-akwatakwa otu mgbe ahụ na Goodison Park.
N'aka ọzọ, Man. U na Arsenal ga-akwakọrịta mpi n'Elekere asatọ an Old Trafford.
Gee nkeji mmgbede ebe a
Buhari na ụmụaka Chibok

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari na ibe ya nke Swiss bụ Alain Berset, ezutela na Katowice dị na Poland ebe ha kpara maka ụzọ ọhụrụ ha ga-esi wee gbapụta ụmụakwụkwọ Chibok ka fọrọ n'aka ndị ntọ ha.
Ha zukọrọ ka e mechara ọgbakọ UN gbasara ihu eligwe nke a kpọrọ "COP24".
Elrufai akatọọla Atiku

Ebe foto si, Nasir el-Rufai/Facebook
Aka na-achị steeti Kaduna bụ Nasir el-Rufai, ekwuola na pati PDP gara bite igwe mmadụ n'obodo Niger ka ha bịara achụmnta vootu ha mere n'ụbọchị atọ nke Disemba, 2018.
Mana ọnụ na-ekwuchitere PDP bụ Kola Ologbondiyan, kwuru na Elrufai ekwuputela etu pati APC si akwado ịtụbụta ndị mba ofesi na ntuliaka 2019.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu egwuregwu bọọlụ Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na etu otu ya si merie n'ikpeazụ dịka otu Watford nyechara otu ọkpụ goolu ebe ha agbatabeghi nke ọbụla, mgbe ha ka na-asọmpi ụnyaahụ (Disemba 4, 2018) gosiri na ị kwesighị izu ike n'asọmpi Premier League.
Mmeri a buliri Mancity n'elu tebulu Premier League dịka ha chịtarala pọịntị ise .
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwaanyị amụọla akataka nwa nwaanyị ọhụrụ ka e werechara akpa nwa si n'ahụ nwaanyị ọzọ nwụgoronu tinye na nke ya.
Ihe a mere na São Paolo dị na mba Brazil. Akụkọ kwuru na nwaanyị a dị afọ iri atọ na abụọ enweghị akpa nwa kamgbe amụrụ ya.
Nkeji ututu
Ihe Nkiri











