Nnamdi Kanu na ndị ọzọ gbafuru mgbe a na-achọ ha na-ejighi akwụkwọ njem

Nnamdi Kanu, Diezani K. Alison-Madueke na Diepreye Alamieyeseigha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ruo ugbua gọọmentị Naịjirịa enwebeghike ịkọwa etu ihe a siri mee

Ụlọikpe ala Naịjirịa atọhapuola Ayodele Fayose.

Mana tupu atọhapụ ya, ọ kwụrụ ụgwọ ruru nde naịra 50.

Ụlọikpe napụ kwa ya akwụkwọ ikike njem nke Bekee kpọrọ ''International Passport''

Ayodele Fayose

Ebe foto si, @GovAyoFayose

Nkọwa foto, Ayodele Fayose bubu gọvanọ Ekiti steeti

Mana n'ime akụkọ a, anyị chọrọ ịhọpụta mmadụ kpuru akpụ na mba Naịjirịa sị ala gawa ala ndị ọzọ nanị iji akwụkwọ ikike ọbụla.

Nnamdi Kanu

Kanu bu nna ndị otu Ipob na Naịjirịa.

N'ụbọchị September 11, 2017, ndị agha Naịjirịa batara bee ya na Afaraukwu n'Abia steeti.

Mana onweghị onye hụrụ ya na-ebe ahụ.

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu ka na-ekwusi ike maka ebumnuche Ipob gbasara referendum

Ọ kariri ọnwa iri na atọ tupu foto ya apụta n'elu facebook kọwara na ọ nọrọ na mba Izrel.

Ọ nweghị onye mara ka o si fepu na Naịjirịa wụbanye na Izrel.

Diepreye Alamieyeseigha

Alamieyeseigha chịbụrụ dịka gọvanọ Bayelsa steeti na etiti afọ 1999 ruo 2005.

Diepreye Alamieyeseigha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dịka ndị ọzọ Alamieyeseigha gọrọ ebubo a niile

Mana ndị mba Britain boro ya ebubo nrụrụaka, ha kpere ya n'ụlọikpe mana tupu ha tabie anya ha nụrụ na Alamieyeseigha awụọla dịka awọ na Naịjirịa.

Kepu kepu mgbe ahụ na-ekwu na Alamieyeseigha yiri akwa dị ka nwanyị ka o nwere gbanwe onwe ya, mana Alamieyeseigha kwusiri ike na onweghị eziokwu dị n'okwu a.

Alamieyeseigha nwụrụ na ụbọchị 10 October n'afọ 2015 na bee ya na Bayelsa.

Diezani Alison-Madueke

Diezani bụ onye bubu Minista na-ahu maka mmanụ agbịdị n'etiti afọ 2017 na 2015.

Mana n'afọ 2015, ọtụtụ ebubo nrụrụ aka pụtara n'isi Deziani.

Gọọmentị Naịjirịa kpachiri ego ruru ijeri 7.6b nke a na-ebo na ọ bụ ego Diezani.

Diezani Alison-Madueke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi

EFCC kpachịkwa ụlọ ya dị n'Abuja ebe maka ebubo a dị ya n'isi.

Mana a ka na-ekwu nke a oge a nụrụ na o ruola mba UK.

Akụkọ ikpeazụ ndị Naịjirịa nụrụ maka ya bụ na ọ na-arịa ọrịa kansa.

Akụkọ ga-amasị gị