Diezani Alison Madueke: Anyị ka na-achụ Diezani - EFCC

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC n'ịchafụ akatọọla akụkọ kwuru na ha esepula aka n'ebubo mpụ e boro onye bụbu minista mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison Madueke.
Ọnụ na-ekwuru ụlọorụ a bụ Wilson Uwujaren zịtere BBC Igbo na akụkọ ahụ bụ asị gbara ọkpụrụkpụ ka ndị mmadụ ekwenyela na ya.
O sị na ebubo ndị a dị iri na anọ ka dị n'aka ọkaikpe Muslim Hassan nke ụlọikpe ukwu dị na Legọs, na ihe ha mere bụ ikewa ya ụzọ abụọ.
Na nke a bụ iji wepu ihe ọgbatuhie dị n'ụzọ ikpe ga-eme ka ekpe ya karịa otu afọ.
Ihe kpalitere okwu a bụ akụkọ ndị ụlọọrụ pulse.ng wepụtara na EFCC esepụla aka n'ikpe Diezani.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a mere ndị Naịjirịa ji kpụrụ Diezanị n'ọnụ na-ajụ ihe mere ụlọọrụ EFCC ji kpaa ụdị agwa a.
RIPTosynBucknor na-ajụ ma ọ bụ eziokwu, kedụ ihe kpatara ya?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Abuja President sị na ọ dịka ibu agha mpụ bụ maka ndị ogbenye.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Jedi Skywalker sị na ọ dị na mbụ mara na EFCC ejighi ihe akaebe eji anwụchi Diezani.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Cheta na e boro Diezani Alison-Madueke ebubo mpụ na nrụrụaka ego ruru ijeri dọla isii nke pụtara otu tarịị naịra na ụma.
A sị kwara na onye ọrụ ngo dị iche iche na-esoghi usoro iwu kwadoro e ji e mee ya nakwa ihe ndị ọzọ.
Kamgbe Nọvemba 2018 rute ugbua ndị ụlọọrụ EFCC kpọpụrụ Diezani n'ụlọikpe bụ nke ka na-aga n'ihu.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:








