Igbo Reincarnation: Aha ndị na-egosi na Igbo kwenyere n'ịlọ ụwa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Nkwenye Igbo gbasara ala mmụọ dị ọtụtụ nke gụnyere ịnọ ụwa, amosu nakwa ọgbanje.
Ịlọ ụwa dịka J.A.S. Nwankwo bụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara omenala Igbo kọwara pụtara nkwenye na mmadụ nwụọ, ọ na-alaghachite n'ụwa bie ndụ ọzọ.
Otu ụzọ Igbo si egosipụta nkwenye a bụ site n'ịgụ mmadụ aha gosiri na ọ bịara ụwa mbụ, nwụọ ma laghachite.
Mana tupu a baa aha o nwere ụzọ esi a ma ma mmadụ a bịaghachiri ụwa nakwa onye ọ nọrọ ụwa.
Etu e si achọpụta ma mmadụ abịaghachiri ụwa

Ebe foto si, Getty Images
Maazị Nwankwo kwuru na "o doro anya na Igbo kwenyere na ịlọ ụwa".
Maazị Nwankwo nyekwara ụzọ dị icheiche esi achọpụta ma mmadụ abịaghachiri ụwa nakwa onye ọ nọrọ ụwa.
- A mụọ nwa ọhụrụ a ga gbaa afa maọbụ gbaa agụ n'ụlọ dibia ịmaata onye ọ lọrọ.
- Apa na-adị nwa ọhụrụ n'ahụ yiri nke onye ọ nọrọ ụwa bu n'ahụ ya.
- Omume maọbụ njirimara onye ahụ nwụrụ anwụ dịka ọrụsị aka maọbụ ọrụsị ụkwụ.
- 'Ike ekpe' ya bụ ihe ndị onye ahụ nwụrụ kwuputara na ndụ mbụ ya ọ ga-eme ma ọ laghachite ụwa ọzọ.
Aha ndị na-egosi echiche na mmadụ nọrọ ụwa

Ebe foto si, Getty Images
Ọnọchie pụtara Nnaanọchienobi.
Nnamdi pụtara Nnamdindụ.
Nnennia maọbụ Nnenna.
Nnedi pụtara Nnem dị ndụ be m.
Obele - Ọ bụrụ na mmadụ lọọ gị, a ga na-akpọ gị Obele aha onye ahụ dịka 'Obele Okeke' maọbụ 'Obele Mgborie'.
Nwannia pụtara Nwa nna ya maọbụ Nwanyị nna ya.
Nwadinobi pụtara Nwa bịara n'obi be nna ya.
Nwabia maọbụ Nwabiara pụtara Nwa bịara ụwa be nna ya.
Obiekunyie pụrụiche n'ihi na ọ bụ ndị agbụrụ ha na-akwado imechi tupu a mụọ nwa ahụ na-aba aha nke a.
Maazị Nwankwo kwuru na nkwenye Igbo n'ịnọ ụwa abụghị nkwenye nkịtị na ọ bụ ndụ ha na-ebi.











