Igbo reincarnation : Ịlọụwa, agwụ Ọgbanje na nkwenye dị ọzọ ndị Igbo nwere gbasara ọnwụ na ndụ

Ndị ọgọmụọ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Ịlọụwa bụ nkwenye ndị Igbo nwere na mmadụ nwụọ, ọ ga-alaghịkwa ụwa ọzọ iji nara ụgwọ ụdị ndụ o biri mbụ.

Ihe nke a pụtara bụ na ndị Igbo kwenyere na mmadụ nwụọ, ọ naghị ebi ebe ahụ.

N'omenala Igbo, a na-ahụ ịlọụwa dịka onye nwụọrọla isi n'alamụọ, ebe ndị nna ochie nọ, lọghachị n'ụwa ,a mụọ ya ọzọ.

Ịlọụwa dabere na nkwenye ha n'ọnwụ nakwa ndụ nakwa n'ụwa a na-ahụ anya na alamụọ anaghị ahụ anya dị.

Igbo na-ewe ya na mmadụ nwụọ, okwu ebighị kama onye ahụ ga-agafe n'ala mmụọ, n'ala ndị ochie, ebe ọ ga-esi lọghachị ọzọ n'ala ndị dị ndụ.

Onye na-agba afa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye na-agba afa

Dịka otu onye omenala Igbo were anya bụ Nze Duruagwu Ukaejuoha, siri kọwaa, "mmadụ na-alọ ụwa iji bịa mezie ihe ndị o mebiri emebi, ịta ahụhụ ihe o mere mgbe ochie maọbụ ịbịa rie uru maka ihe ọma o mere n'ụwa ya mbụ."

"Ọ bụrụ na mmadụ abụrụ onye ọjọọ, Chukwu Okike ga-ahaziri ha ọlọ ụwa ha ka ha nọdụ n'ọnọdụ ahụhụ nke na ha agaghị ahụ ego gaa ụlọọgwụ."

Aha onyonyo, Duruagwụ Olueze: Ndị iche dị n' ịlọụwa,ọgbanje na agwụ

N'otu aka ahụ, onye omenala Igbo ọzọ nụ Mcginger Ibeneme kọwara na ọ bụ nkwenye a na ihe onye metara, ọ ga-ala gị taa ahụhụ ya (nke Bekee kpọrọ Karma) mere ndị Igbo ji agbara ajọ ihe ọsọ.

"Igbo na-akpọ ya 'ọdịnaobi'."

"Ọ bụrụ na nna gị mere ajọ ihe dịka na ọ na-egbu mmadụ maọbụ na-ezu ohi, dịka Akwụkwọ Nso si ekwu na njọ nna mere n'ụmụ ya. E nwere ezinaụlọ ị ga- apụta a na-anwụ ọnwụ Ike."

Ukaejuoha kwuru na mmadụ na-esi n'ebe dị iche iche alọ ụwa: mmiri, anyanwụ,elu, ala na arụsị.

"Ya mere e ji nwee Ezenwaanyị mmiri maọbụ eze mmiri (mamiwọta)."

Nwaanyị na-ete nwaanyị ibe ya uhie

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụghị naanị Igbo nwere nkwenye n' ịlọụwa, ofufe ndị ọzọ dịka ndị Hindu, ndị Budha nakwa ndị ụka Kraịst kwenyere na ndụ ebighị n' ọnwụ.

Iji maa atụ: Ndị otu Kraịst nwere nkwenye na Kraịst bụ mmụọ (Chukwu) lọrọ ụwa a mụọ ya ka mmadụ, ọ nwụọ dịka ha na- ele anya na ọ ga- alọghachi azụ n' ụwa ọzọ dịka e so depụta ya n'Akwụkwọ Nso(John 5:58, Phil2:5-8)

Njirimara ịlọuwa

E nwekwara ihe Igbo na-ahụ dịka ihe na-arụtụ aka n' ịlọụwa maọbụ onye lọrọ ụwa.

Ha gụnyere: Nwata iwe akara maọbụ apa dị na ahụ onye ezinụlọ ha nwụrụla; nwata inwe amamihe karịrị nke ọgbọ (ebibiụwa) maọbụ mara ekwu okwu dịka okenye; nwata nwere àgwà okenye; nwata inwe ike ịkọ ihe merela tupu a mụọ ya, DGZ.

"Ohi dị na agbụrụ, ajọ ihe dị iche iche dị n' agbụrụ."

Ịlọụwa dị na ndabere, na ndabere. Ọgbanje, agwụ, ndị ichie, mamịwọta(ezenwaanyị mmiri nakwa Eze mmiri) bụcha ndabere gbadoro ụkwụ n' ịlọụwa.

Lee etu Ukaejuoha na Dkta Ibeneme siri kọwa ụfọdụ n'ime ha:

Ọgbanje

Mmemme Imo Awka
Nkọwa foto, Ndị agbara Ezenwaanyị na-efe Imo Awka, na-agbara ya egwu mmụọ bụ Opu-Eke iji kelee ya maka onyinye o nyere ha

Dịka ndị o doro anya siri kọwaa, ọgbanje bụ ụdịrị ịlọụwa. Nwata bịa ụwa, ọ gaghị anọ anọ ya anwụọ.

Ukaejuoha sị na " ọgbanje bụ otu a na-abanye n'ụwa na abụghị ụwa nke a. Ọgbaje na-abịa were ahụ mmadụ, ha na-enwe mkpebi ihe ha na-achọ ịrụ ma na-anwụ ọnwụ mgbabiri".

"Ọgbanje na-agbabiri nwụọ. Ọ bịakwa ọzọ, ọ ga-emekwa ihe onye ọ lọrọ ụwa mere.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọgbanye were ike ịbịa ugboro ugboro iji taa nne na nna ya ahụhụ.

Ibereme kwuru na "ọgbaje bụ agwụ nwaanyị'.

Ukaejuoha kọwaa na e nwere ezigbo ọgbanje, nwee ajọ ọgbanje.

Ọ sịkwa na ọ bụ a kpọrọ, "ezenwaanyị"bụ ọgbanje nwere onyinye pụrụ iche nwere ike ịgwọ nwata ọgbanje na-enye nsogbu.

Agwụ

Mmemme Imo Awka
Nkọwa foto, Nwaekemezie Onwudinjo, Aka na-akụ Opu-Eke na mmemme Imo Awka.

Agwụ, dịka Nze Olueze siri kọwaa ya bụ "mụọ na-ahụ maka isibie elele(magic), ibu amụma(prophecy), ịhụ ụzọ( divination) ọgwụ na ǹkà pụrụ iche."

Mcginger na onye agwụ mara nwere ike ị na-ahụ ụzọ.maọbụ nwee nka pụrụ iche nke ọ na- eme ya karịchaa ndị ogbo ya pụọ iche.

Nze Ukaejuoha rụtụrụ aka na "O nweghị arụsị n'Igbo ga-akwudo na enweghị agwụ."

Ọ gara n' ịhụ kwuo na "nwoke ọbụla nwere agwụ" mana ha na- apụta ihe n'ụdị nakwa oge dị iche iche.

Ọ sị, "Ihe ụwa dị na nkatụ, na nkatụ."

"Etu ihu di iche iche, ka amara ọ na-anata Chukwu Okike Abịama."

O kwuru n'ụfọdụ hapụ ime ihe agwụ ha dere ha ime nwere ike ime onye ahụ ara maọbụ bute ndụ abaghị uru.

Nkwenye Ịlọụwa na Sayensị

Akụkọ Igbo
Nkọwa foto, Mcginger Ibeneme bụ dọkịta ahụike ma bụrụkwa onye ihe omenala doro anya

Ibeneme onye bụkwa dibia Bekee kọwara na dika ịlọụwa bụ ihe miri emi, na Sayensị bụkwa ihe miri emi kama na ndịiche dị na ya bụ na ndị Bekee deturu nke ha ma gbaa ya n'anwụ, ebe Igbo emeghị otu ahụ.

N' okwu agwụ, ọ kọwara na ndị mmadụ nwere onyinye maọbụ nka enweghị oyiri dịka otiegwu a ma ama bụ Tupac na onye ihe eserese a ma ama bụ Picaso bụ ndị agwụ.

N'okwu ịkpọ ọrịa okponaọbara(Sickle cell), ọgbanje, dkta Ibeneme sị na "Ọrịa Sickle cell abụghị ọgbanje," kama ọ bụ nghọtahie ụdị ọbara nwoke na nwaanyị nwere.

O kwuru na oge gboo, iji gbalahụ ọnwụ nwa ọhụrụ, tupu nwoke na nwaanyị alụọ, na a na- ajụ ese.

"Afa nwere ike kwuo na ha agaghị alụnwu onwe ha, na ezinaụlọ lụkọọ, na nwa ha na-anwụkarị."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: