'Godswill Akpabio kwuo eziokwu, gosi ihe akaebe, agbagharịzịla' - Sinetọ Nwaoboshi na Anyanwu

Ebe foto si, Facebook/Nwaoboshi,Anyanwu,Akpabio
Sinetọ Peter Nwaoboshi na Sinetọ Sam Anyanwu asaala ebubo nrụrụaka e boro ha n'ihe gbasara Niger Delta Development Commission (NDDC).
Nwaoboshi na Anyanwu bụ mmadụ abụọ so n'ime aha ndị Godswill Akpabio bụ minista na-ahụ maka ọdịmma Niger Delta wepụtara sị na ha so keta ọrụ ngo, kwuru sị na Akpabio boro ha ebubo ụgha.
Nwaoboshi gwara BBC Igbo sị na Akpabio na-agba okwu okirikiri, na ebe ọ sị na o nyere ya "contract", na ya wepụta ihe akaebe gosiri nke a.
Anyanwu na onwe ya kwuru sị na ọ bụ mgbaokpuru ka Akpabio na-agba ya n'ihi na ọ bụ onye pati People's Democratic Party (PDP).
Otu ihe ha abụọ kwukọrịtara n'agbanyeghi na ha na BBC Igbo kpara iche, bụ na ha ga-akpụpụ Akpabio ụlọikpe, n'ihi na o wepụtaghi ihe akaebe gosiri na ha nwetara "contract".
Anyanwu kwuru sị na oge ọ nọ n'ụlọomeiwu nke a kpọrọ "8th assembly", na ọ zọtaara ndị ọ na-anọchite anya "contract" ka e nwee ike rụọ ụzọ dị ebe ahụ, na ọ bụghị n'aha nke ya maọbụ ụlọọrụ ya ka o ji zọta ya.
Gee ihe ha gwara BBC Igbo n'uju ebe a:
Akpabio kụwara akụoyibo nsugbe

Ebe foto si, @Godswill Akpabio/Twitter
Minista na-ahụ maka ọdịmma Niger Delta bụ Godswill Akpabio azaghachila ndị ụlọomeiwu na-eme ya nyocha gbasara ebubo o boro.
Ọ kọwara na ọ bụghị ndị ụlọomeiwu nke agba a bụ 9th Assembly na Bekee ka ọ tụrụ aka mgbe o kwuru okwu "60% contracts".
Nke a so n'ihe o dere n'ime akwụkwọ nkọwa nke onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila jụrụ n'aka ya dịka o mechara ebubo ahụ mgbe a na-enyocha ya.
Lee ihe nwereike ima dịka oge ndị omeiwu nyere Akpabio gara

Ebe foto si, NDDC/Twitter
Dịka ụbọchị abụọ Femi Gbajabiamila nyere Minista na-ahụ maka ihe gbasara Niger Delta bụ Godswill Akpabio ka ọ wepụta aha ndị omeiwu ọ kwuru na ọ bụ ha na-erite ihe ruru passentị iri isii ọrụ ngo n'aka ngalaba NDDC gachara, ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ịmata ihe ga-eme ugbu a.
Cheta na gọọmentị hiwere nzụkọ ga-eme nyocha dịka a na-ebo ngalaba NCDC ebubo nrụrụaka ruru ijeri narịa iri asatọ na otu na ụma.
Ihe mere na nzukọnnyocha ahụ
Niger Delta Development Commission (NDDC) bụ ngalaba gọọmentị hiwere iji hụ na mpaghara Niger Delta bụ ndị e si n'ala ha amịpụta mmanụ agbidi na-erite ụrụ na ya.
Eboro NDDC ebubo nrụrụaka nke mere ka gọọmentị Naijirịa hiwe nzụkọ ga-eme nyocha ka a mata nke bụ eziokwu.
Ọ bụ n'ụbọchị Monde ka emere ya bụ nzụkọ nyocha.
Kama mgbe a na-agba ọnye nọ dịka onyeisioche ngalaba NDDC bụ Kemebradikumo Pondei ajụjụ ọnụ maka ya bụ nrụrụaka ka o koropuru maka ahụike.

Ebe foto si, NDDC/Twitter
A kpọgara mazị Pondei ụloogwụ were bido ịgba Minista Godswill Akpabio ajụju maka ebubo nrụrụaka.
Ọ bụ mgbe a na gba ya ajụju maka etu NDCD siri mefuo ego ka o kwuru na ọ bụ ndị ụloomeiwu kacha erite elele site n'ọrụ ngo ngalaba ahụ na-enye ha.
Akpabio kwuru sị "anyị nwere akwụkwọ na-egosi na ọtụtu ọrụ ngo ndị NDDC nyere bụ ndị ụloomeiwu kacha rite na ya".
Okwu a kpasuru onyeisi ndụ uloomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila iwe nke mere ka onye Akpabio ụbọchị abụọ iji kpọpụta aha ndị ụlọomeiwu o kwuru na-erite uru n'ọrụ nga ahụ.
Akpabio ọ ga-akpọpụta aha ndị a?

Dịka ụbọchị abụọ enyere Akpabio ịkpọpụta aha ndi a gachara, ndị Naijirịa na-atụ anya ma ọ ga-akpopụta ya taa bụ Tụzde.
Cheta na Akpabio bụbu onye omeiwu tupu onyeisiala Muhammadu Buahrị emee ya minista na-ahụ maka Niger Delta n'afọ 2019.
N'otu aka ahụ ka Joi Nunieh bụbu onyeisi ngalaba NDDC boro Godswill Akpabio ebubo nrụruaka dịka ọ nọchara ọnwa anọ n'ọrụ.
Nunieh kwuru na ọ bụ Akpabio kpara nkata ka-ewepụ ya n'ọrụ.
O kwukwara na Akpabio chọkwara ka ọ ṅụọ iyi nke ga-eme ka ọ hapụ ikwuputa nrụrụaka ọbụla.

Ebe foto si, NDDC/Twitter
Kama Akpabio kwuru na ebubo a niile bụ asị ma kwuo na ọ bụ erubeghị ndị ọchịchi isi mere e ji chụọ Nunieh n'ọrụ.
N'aka nke ọzọ ka Pondei ekweghị ịza ajụju onyeisioche nyocha ahụ bụ Olubunmi Tunji Ojo jụrụ ya.
O kwuru na ọ gaghị aza ajụjụ Ojo n'ihi na aka Ojo adịghị ọcha.
Kedụ ihe ndị ụlọomeiwu ga-eme ma ọ bụrụ na ebubo Akpabio bụ asị?
Onye okaiwu Naijirịa bi mba Briten bụ Bulama Bukarti gwara BBC na ọ bụrụ na Akpabio akpọpụtaghị aha ndị omeiwu ọ sị na-erite ọrụ ngo n'aka NDDC, na nanị ihe ndị omeiwu nwereike ime bụ ị degara Onyeisiala Buharị akwụkọ ndụmọdụ.
Akwụkwọ ndụmọdụ a ga-agwa Buhari ka ọ wepụ Akpabio dịka Minista na-ahụ maka Nigeri Delta.
Bukarti kwuru sị "Kama, nke a bụ nanị ndụmọdụ".
Ọ kọwara sị " na mbụ anyị ahụla ebe ndị ụlọomeiwu nyere onyeisiala ndụmọdụ maọbụ ntụzị aka mana o meghị ihe ha kwuru".
Bukarti mara atụ sị " Mgbe e nyere onyeisiala ntụzịaka ka ọ wepụ onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu, ọ kweghị ime etu ha sịrị kwuo".
Ọ bụrụkwanụ na ebubo Akpabio bụ eziokwu?
Bulama Bukarti kwuru sị " ọ bụrụ na ebubo Akpbio bụ eziokwu, ọ pụtara na ndị uloomeiwu ahụ adaala iwu Naijirịa".
Ọ kọwara na nke a megidere iwu ụloomeiwu nke mere na enwereike ịwepụ ha n'ọrụ ma nye kwa ha iwu ka ha weghachi ego ọbụla ha ritere n'aka NDDC.
Bukarti kwuru na a ga-akpopụta aha ha niile ka ihere mee ha.
O kwuru sị " ha dara iwu 'Section 24' nke 'Code of Conduct act' nke gbasara ndị ụloomeiwu aka ha nọ na nrụrụaka dị etu a".
Ihe dị mkpa ndị ụlọomeiwu kwesiri ime ma ewepụta aha ndị a.
Ghali Umar Na Abba onye bụbo onye omeiwu kwuru sị " Ngalaba na-ahụ maka emume kwesiri ekwesi nke ndị ụloomeiwu na-eme onye ụlọomeiwu ọbụla eboro ebubo nrụrụaka nyocha".
Ọ bụrụ na ebubo a bụ eziokwu, a ga-enyefe ndị a n'aka ngalaba iwu obodo kwesiri ekwesi.
Onyeisiala Muhammadu Buhari o tinyere ọnụ n'okwu a?
Dịka ndị ụloomeiwu na ngalaba NDDC na ama onwe ha aka, onyeisiala bụ Buhari ekwuola ka ndị Minịsta niile na ndị ọrụ gọọmentị niile kwanyere ndị ụloomeiwu ugwu ruru ha.
Buhari tinye kwara ọnụ mgbe ndị ulo omeiwu ukwu na nke nta nwere nzụko.
Dịka ọ dị ugbu a, ndị Naijirịa na-eche etu a ga-esi mee ya bụ okwu na ebubo nrụrụaka ruru ijeri naira iri asatọ na otu na ụma.











