Daniel Pondei o sila n'ụlọọgwụ pụta?

Daniel Pondei

Ebe foto si, TWITTER/ NDDC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ngalaba NDDC ewepụtala ozi na-akọwa nkoropu onye nọ dịka onyeisi ha bụ Daniel Pondei nwere mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ụbọchị Monde.

Ha kwuru na ọrịa ahụ na-arịa ya kemgbe izu abụọ na-akawanye njọ kwa ụbọchị mana o nabataghị ndụmọdụ ndị dọkịta ya nyere ya maka ịgbahapụ ajụjụ akwadoro ịjụ ya.

Ha kwuru na ọ chọrọ izara ọnụ ya nakwa debe aha ya ọcha nke mere o ji gawa n'ihu na nyocha ahụ.

Pondei malitere ọrụ ịme ka onyeisi NDDC n'ọnwa Febuwarị nke afọ 2020 dịka ozi ahụ si kwuo. Nke a mere na ọ bụ ya ga-azara oku nyocha ọbụla a chọrọ ịme n'ebe ahụ.

Pondei

Ebe foto si, TVC News

Nkọwa foto, Daniel Pondei

Etu Pondei si koropu mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị ụlọomeiwu na-ajụ ya

Onyeisioche ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) bụ Daniel Pondei, onyeisi NDDC koropụrụ ka ndị omeiwu na-enyocha ya chara ya ọkụ

Ka ọ dachara BBC ahụghị ndị ọrụ ọbụla gbatara ọsọ enyemaka mana ndị gbara ya okirikiri nyere aka kpọlite ya.

Ihe ọzọ anyị hụrụ bụ na a kwụsiri nyocha ahụ ka a ga lebaa ahụike ya anya.

Mgbe a jụkataziri Pondei ajụjụ, o kubitu n'oche ebe ọ nọ na-aza ajụjụ niile ahụ.

Ajụjụ nke a jụrụ ya tupu ọ shọbuo bụ etu ngalaba NDDC ga-esi kwụ ụgwọ 'scholarship' ngalaba ahụ nyere ụfọdụ ụmụakwụkwọ ebe ọ bụ na ha emechiela bọjeti 2019 ebe edepụtere ya bụ ego dịka nke e mefugoro.

Pondei

Ebe foto si, TVC News

Ndị ụlọomeiwu buru ụzọ gụpụta ebubo ndị ahụ site n'ọnụ onyeisi oche otu na-enyocha ngalaba ahụ maka amaghị mefu ego.

Otu onye n'ime ndị ụlọomeiwu kwuru ka e were akwụkwọ ebe edepụtara ebubo a niile ma nye ya ndị nke bịara ịzaara ọnụ ha taa.

Onye nọ n'ọnọdụ onyeisioche ngalaba NDDC bụ Kemebradikumo Pondei malitere gụpụtawa ego ha mefuru na ngalaba ahụ n'afọ 2020, mana ndị ụlọ omeiwu kwuru na ya wepụta akwụkwọ bọgeti ha ji hazie mmefu ego ahụ.

Gịnị mere i ji nye ndị 'clear point' communication 641 million naira ?

Pondei zara si na o nyere ha ego ahụ ka ha wee chọta ebe ndị NDDC na-arụgasi ọrụ ma jirikwa ya zụọ ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ.

Covid-19 Pallative

Pondei kwuru na ọ bụghị ijeri naira 1.5 ka ngalaba ahụ ji gboo mkpa covid-19 kama ọ bụ Ijeri naira 1.32 billion.

Minista na-ahu maka Naịja Delta bụ Godswill Akpabio zara oku ụlọomeiwu nta kpọrọ ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara ebubo nrụrụaka Joi Nunieh boro ya.

Cheta na ndị ụlọomeiwu kpọburu Pondei mana ọ gwara ha na onyeisioche otu ga-eme ngalaba ha nyocha nwere ebubo nrụrụaka nke mere na ọ gaghị aza oku ndị ụlọomeiwu kpọrọ ha.

N'ụtụtụ taa bụ ụbọchị Julai iri abụọ ka ya bụ onyeisioche otu na-eme nyocha NDDC, Olubunmi Tunji-Ojo kwuru na ọ gaghị esonye na nyocha a maka ebubo mpụ a.

Akpabio

Ebe foto si, Twitter/Akpabio

Nke a mere ka amanye iwu ka ọ bịa, ma ọ sọrọ ya , ma ọ sọghị ya.

Lee ka nkwupute a si aga n'elu soshal midia:

Okwu 11 gbara ọkpụrụkpụ Joi Nunieh kwuru mgbe ọ gbara n'ihu ndị ụlọomeiwu nta

Senator Akpabio and Joy Nunieh

Joi Nunieh bụbu onyeisi ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) ji ihe onyonyo Zoom wụchie ebe ndị omeiwu Naịjirịa na-eme nyocha n'ụbọchị Fraịde maka etu esi gbarie ijeri kwa ijiri naịra e kwesịrị iji ruo ọrụ.

Nunieh gwara ndị omeiwu na minista na-ahu maka Naịja Delta bụ Godswill Akpabio yiri ya egwu na ọ ga achụ ya n'ọrụ ma ya bụrụ na o kweghi iso ya ṅụọ iyi n'Uyo.

Akpabio n'onwe ya agọọla na ya ekwughi ụdịrị ihe ahụ.

Nunieh gwara ndị omeiwu na Akpabio sị na ọ bụ sọsọ ịṅụ iyi a ga-eme ka ha abụọ rụkọọ ọrụ n'ụdọ.

Dr. Joi Nunieh house arrest

Ebe foto si, RVGH

Nkọwa foto, O bụ gọvanọ Wike nke Rivas steeti bịara Joi Nunieh oge ndị uweojii bịara ịkpụrụ ya

Ọkammụta Nunieh kpọkukwara ndị uweojii Naịjirịa ka ha nyocha Akpabio maka ebubo a makana ọ bụ ịda iwu Naijirịa ka ọ bụ ịmanye mmadụ ka ọ ṅụọ iyi.

Ọ sị na Akpabio a kaara aga mkpọrọ ruo ọnwụ ya ma ọ bụrụ na ṅụrụ iyi a, mana dịka ọṅụghị ya "ọ bụ afọ ise maọbụ asaa na-eche ya, dịka iwu Naịjirịa siri kwuo".

Ebubo Nunieh wụkwasara Akpabio na ndị ọzọ n'isi

Ọkammụta Nunieh wụkwasara Akpabio ọtụtụ ebubo ndị ọzọ ka ọ na-aza azịza n'ọgbakọ nyocha ndị omeiwu a.

Lee ụfọdụ ebubo na ihe ndị ọzọ dị ọkpụrụkpụ o kwuru:

  • Ọ sị na ozugbo ha malitere inyocha ọrụ enyere ndị mmadụ ka ha ruọrọ NDDC, akwụkwọ eji nye ọrụ malitere ifu aghara aghara
  • Ọ sị na ya gakwuru Akpabio ga jụọ ya maka etu akwụkwọ EDP na EDF were pụọ, Akpabio kwetere na ọ ma maka ya ma sịkwa na a gwaala ha weghachite ya.
  • Ọ sị na ya agbanweghị ego dọla ọbụla nke NDDC nwe n'oge ọ na-achị ngalaba ahụ.
  • Ọ sị na Sinetọ Akpabio manyere ya n'ike ịchụ ụfọdụ ndị ọrụ.
  • Ọ sị na ọ bụ ijeri naịra asatọ ka ya gbariri site Ọktoba 2019 ruo Febụwarị 2020, bụ oge ọ nọ n'ọrụ
  • O sị na ọ bụ ya bụ onyeisi NDDC akachasị kpọọ asị. Sịkwa na Akpabio kere ihe onyonyo na ego ebe ndị ntoroọbịa na-enwe aṅụrị na-asị "ke ọ laa, ka ọ laa. O kweghi inye anyi ego."
  • Ọ sị na Akpabio ekweghi ibunye ha ụgbọala sonyere ọkwa ya makana o kweghi ime he ọ sị ya mee. O sịkwa na ya mere ngwa ngwa weghachị ụgbọla abụọ mgbọ adịghị aba ka ọ chọputara na ọ bụ n'aka ndị "ndị na-achọ ọrụ" ka o si. Ọ sị na Akpbio si na "ọ bụghị nnukwu ihe" oge ọ gwara ya.
  • Ọ sị na Akpabio na-eme ya nyocha aghara aghara, ma ịmata ebe ọbụla o gara maọbụ onye ọ gwara okwu.
  • Ọ sị na ihe kpatara nyocha a ndị omeiwu na-eme sitere n'aka atọ: Ndị na-achị ngalaba ahụ, ndị ọrụ ngalaba ahụ nakwa ndị Naija Delta.
  • Ọ sị na ọ bụ aghụghọ ka a na-aghọrị ndị Naịjirịa na a na-eme nyocha Bekee kpọrọ "forensic audit" na NDDC
  • Ọ sịkwa na Akpabio gwara ya na ọ bụ "uche ọkpa" mere oji na-agbajọ ihe ọ si ya mee.

Dịka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu ekwuola ka Godswill Akpabio bịa zara ọnụ ya n'ihu ha.

Okwu ka nọ na ngịga.

Joy Nunieh house arrest mata make her do zoom call from wia Ezen Nyesom Wike - Governor of Rivers State keep her wen she give testimony to di house committee.

Ebe foto si, OTHER

Nkọwa foto, Ndị omeiwu asịla ka Sineto akpabio bịa zara ọnụ ya banyere ebubo Ọkammụta Nunieh boro ya

Akụkọ ndị ga-masị gị: