Okonjo-Iweala WTO: Ngozi Okonjo-Iweala azọchiela na Naijiria

Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 10

Onyeisi otu 'World Trade Organisation'(WTO) bụ Ngozi Okonjo-Iweala emeela njem ya mbụ na Naijiria kemgbe ọ banyere n'ọkwa ya taa bụ Satọde.

Okonjo-Iweala bụ onye odeakwụkwọ Ministrị na-ahụ maka azụmahia nabatara n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja gwara ndị ntaakụkọ na ya bịara ikele onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekele maka ikwado ya.

A na-atụ anya ọ ga-ezutekwa onyeisi ụlọakụ etiti, mịnịsta na-ahụ maka ego na ndị isiọrụ nwere agba ụbọchị Monde.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Okonjo-Iweala WTO: Lee ihe ọ ga-arụ dịka onyeisioche 'World Trade Organisation'

Okonjo-Iweala

Ebe foto si, WTO twitter Page

Ngozi Okonjo-Iweala ga-ebido ọrụ dịka onyeisi World Trade Organisation taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2021.

Cheta na ọ bụ nwaanyị mbụ na-enwete ọkwa a mabụrụkwa onye Afịrịka mbụ nweterela ọkwa a.

Lee ka ụlọrụ WTO si nabata Ngozi Okonjo- Iweala dịka ọ ga-amalite ọrụ taa ebe ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Lee mgbe Okonjo -Iweala were oche ya dịka onyeisioche WTO na ọgbakọ mbụ ya o mere ebe ahụ taa ọ malitere ọrụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ngozi abanyela n'ụlọ ọrụ WTO

Ebe foto si, WTO twitter page

Ndị ntaakụkọ nabatara Ngozi Okonjo Iweala mgbe o bidoro ọrụ.

Ngozi Okonjo-Iweala na-abanye ụlọọrụ WTO

Ebe foto si, Wto twitter

Buhari ekelela Ngozi Okonjo Iweala maka ọkwa WTO

Ngozi Okonjo Iweala na Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, NoIweala/Mbuhari/Twitter

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na o doro ya anya na Ngozi Okonjo Iweala ga-arụ ọrụ ya dịka onyeisi World Trade Organization (WTO) ọfụma.

Nke a pụtara ihe n'ozi oziputere iji bunye ya ụkpa ekele maka ịnweta ọrụ ahụ nke WTO kpọpụtara n'ụbọchị Monde.

Ihe ọzọ onyeisiala kwuru n'ozi ya bụ na Okonjo-Iweala wetara aṅụrị nakwa nkwanye ugwu nyere mba Naịjirịa.

Ndị ọzọ kelere Okonjo-Iweala ekele pụrụiche maka ọkwa ọhụrụ a gụnyere Peter Obi, Bukola Saraki nakwa odogwu nwaanyị n'ụlọakụ mbaụwa bụ Christine Lagaard.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwụ na Naịjirịa ekeelela Ngozi Okonjo-Iweala

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwụ na Naijirịa egosila afọojuju ha ebe Ngozi Okonjo-Iweala nọ maka ọrụ ọhụrụ ọ nwetere.

Mmadụ dịka Pat Ụtọmị kelere agụ nwaanyị Igbo a ebe ọ dị ukwu maka ịhe mba nweta ya bụ mmerị lọta.

Ọ rịọrọ Okonjo Iweala ka ọ ghara ịkpaoke ma oruo ebe ahụ.

N'olu ya, ọ sị isi okwu ya n'ọrụ ahụ ga-abụ "egbe bere, ugo bere. Onye aghala nwanne ya".

Pat Utomi

Ebe foto si, Getty Images

Gọvanọ Legọs steetị bụ Babajide Sanwo-olu bunyekwara Okonjo Iweala ụkpaekele maka oche ọhụru e bunyere ya na WTO dịka o kwuru na Twitter ya.

N'otu aka ahụ, Ifeanyi Okowa bụ Gọvanọ Delta steeti bunyekwara ya ụkpaekele na-ekwe ya nkwa na ya ga-akwado ya nke ọma ma n'ụlọ ma n'ezi.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Onye bụbo Gọvanọ Anambra steeti bụ Peter Obi sokwa na ndị bunyere Okonjo-Iweala ụkpaekele.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Onye bụbu osote onyeisioche Sineti oge agara aga bụ Abubakar Bukola Saraki sokwa jaa ya mma na ndụ maka ya bụ agụ Okonjo-Iweala gburu.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Agụ nwaanyị International Monetry Fund (IMF) bụ Christine Lagarde bunyekwara ya ụkpaeke sịkwa na ya ji n'aka na Okonjo-Iweala ga-eme ihe e ji mara ya ebe ahụ.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

World Trade Organisation akpọpụtala Ngozi Okonjo-Iweala nke Naịjirịa dịka onye ga-anọ n'isi ụlọọrụ ha.

Ha depụtara nke a n'akara Twitter ha n'ehihie Monde.

Okonjo-Iweala bụ nwaanyị mba ga-anọ na ya bụ oche bụrụkwa onye Afrịka mbụ.

Ọ ga-amalite ọrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị wee ruzie 31 August, 2025.

WTO kpebiri nke a n'ọgbakọ puruiche ha nwere ebe ha nọ tinyere ọnụ na ya bụ mgba Okonjo Iweala na mmadụ asaa ndị ọzọ gbara.

Skip X post, 8
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 8

Ndị mmadụ tụmadụ ụmụ Naịjirịa adịla njikere maka mkpọpụta Ngozi Okonjo Iweala bụbụ minista na-ahụ maka akụ na ụba na Naịjirịa dịka onyeisi World Trade Organisation.

Okonjo Iweala ga-abụ nwaanyị mbụ nakwa onye Afịrịka mbụ ga-enweta ọkwa a kamgbe ehibere ya.

Skip X post, 9
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 9

Ngozi Okonjo-Iweala abụrụla onye isi ụlọọrụ World Trade Organisation
Nkọwa foto, Ngozi Okonjo-Iweala abụrụla onye isi ụlọọrụ World Trade Organisation

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ i kwesiri ịma maka agụ nwaanyị a:

  • Ọ rụrụ ọrụ dịka mịnista na-ahụ maka akụ na ụba Naịjirịa ugboro abụọ.
  • Ọ rịọrọ mba ji ezigbo ego ka ha kachapụ ụgwọ Naịjirịa ji ha.
  • Ọ gbara mbọ ịkwụsị ahia nzupu mmanụ agbịdị na NaỊjirịa
  • Ọ rụrụ ọrụ na World Bank ruo afọ iri abụọ na ise
  • Ọ na-enyekarị akụ na ụba mba ndị ka na-etolite aka
  • Ọchịchị Trump juburu na ọ gaghị a bụ onyeisi WTO makana ọ bụghị ọkaibe n'ihe gbasara azụmahịa
  • O tebeghị aka ọ bụ onye mba Amerịka

Ngozi Okonko-Iweala na-ekwusi ike na ọ ga-enye ngalaba WTO anya zuru oke dịka ọ na-ekwukwa na ihe gbasara azụmahịa bụ ihe o ji obi ya niile eme.

WTO DG: "Amerịka, daalụ maka ịkwụnyere Ngozi Okonjo-Iweala" - Onyeisiala Buhari

Onyeisiala mba Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekelela mba Amerịka maka nkwado ha nyere Ngozi Okonjo Iweala n'ịzọ ọkwa onyeisi WTO.

O kwuru nke a n'ozi o depụtara n'akara Facebook ya ma kwuo na obi juputara mba Naịjirịa nakwa ala Afrịka niile na nke a.

"O gosiri na mba Naịjirịa na Amerịka kwụ otu ebe n'ịnabata onye ala anyị na-emepụta anyị ihu bụ NOI" ka o kwuru.

Cheta na Mba Amerịka nyere Ngozi Okonjo-Iweala nkwado ha maka ịbụ onyeisioche otu 'World Trade Organisation'.

Mba Amerịka akwadola Ngozi Okonjo-Iweala maka ịbụ onyeisi WTO

Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Twitter/NOIweala

Mba Amerịka enyela Ngozi Okonjo-Iweala nkwado ha maka ịbụ onyeisioche otu 'World Trade Organisation'.

Amerịka nyere nkwado a site n'akwụkwọ ozi si n'aka ngalaba mba ahụ n'ahụ maka ahịa.

Akwụkwọ ozi a kwuru sị: "Ọchịchị Biden na Harris ji ọbị ọma na-ekwupụta nnukwu nkwado maka Ọkammụta Ngozi Okonjo-Iweala dịka ọ na-azọ ọkwa onyeisioche WTO."

"Ọchịchị Biden na Harris na-ekelekwa Yoo Myung-hee maka mbọ ọ gbara ịzọ ọkwa a. Amerịka anabatala mkpebi ya iwepụ onwe ya na ya bụ ndọrọndọrọ."

Office of the United States Trade Representative

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ozi si n'aka ngalaba gọọmentị Amerịka na-ahụ maka azụmahịa

Cheta na Amerịka enyebughị Okonjo-Iweala nkwado oge onyeisiala Donald Trump nọ n'ọchịchị, kama ha kwadoro Yoo Myung-hee, mana egwu adagharịala ugbua.

Okonjo-Iweala kelere mba Amerịka nakwa Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari maka nkwado ha nyere ya iji nweta ọkwa onyeisioche WTO.

Skip X post, 10
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 10

Yoo Myung-hee awụsaala ọwa ịzọ ọkwa onyeisioche WTO

Ngozi Okonjo Iweala

Ebe foto si, Okonjo-Iweala/Facebook

Ngozi Okonjo-Iweala nke Naịjirịa bụ otu onye fọrọ n'izọ ọkwa World Trade Organization (WTO) adịla njikere ibu onyeisi otu ahụ.

Nke a na-abịa dịka nwafọ mba Saụt Korịa bụ Yoo Myung-hee na-ama ya aka esepụla aka ya n'izọ ọkwa ahụ nke mere o ji fọ naanị Okonjo-Iweala.

Ndị nnọchịteanya isiọchịchị otu WTO kwadoro ka Okonjo-Iweala bụrụ onyeisi otu a n'ọnwa Ọktoba afọ 2020.

Aha onyonyo, Ngozi Okonjo-Iweala: Ihe ndị aga-eme ka akụnaụba ala anyị ghara ịdakpọ n'ihi coronavirus

Tupu nke ahụ emee, Okonjo-Iweala na Yoo- Myung-hee bụ ụmụnwaanyị abụọ ọ fọrọ n'ịzọ ọkwa onyeisi otu ahụ nke bụ mbụ ọ na-eme kamgbe e hiwere ya.

Onye nnọchiteanya mba Amerịka n'otu bụ nke onyeisiala Joe Biden họpụtara ka na-eche nyocha n'aka ndị omeiwu Amerịka.

Ihe mere Ngozi Okonjo-Iweala eburubeghi oche eze na WTO

Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala/Facebook

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mba so n'otu 'World Trade Organisation' kwadoro Ngozi Okonjo-Iweala mana nke a ezubeghi iji akpọpụta ya dịka onyeisi ọhụrụ otu a.

Okonjo-Iweala sepụtara isi dịka onye nwereike ịbụ onyeisi otu WTO ọhụrụ ndị nwere agba n'otu WTO nyere atụmatụ ka Okonjo-Iweala bụrụ onyeisi ha.

Ndịisi atọ na-anọchiteanya otu WTO a kpọrọ 'Troika' kwadoro Okonjo-Iweala mana a na-eche ka mmadụ 164 so n'otu a kwadoo mkpebi a.

Site na ntuliaka e mere n'ụbọchị Wenesde 28 Ọktoba, 2020, Okonjo-Iweala nwetere nkwado kachasị mana mba Amerịka akwadoghi ya.

Ndị na-ekwuchitere Okonjo-Iweala ọnụ sị na obi dị Okonjo-Iweala ụtọ na nkwado e nyere ya mana ọ na-eche ka a kpọpụta aha ya n'ụbọchị 9 Nọvemba, 2020.

A na-atụ anya na ndị otu a ga-akpọ aha mgbe ndị otu a ga-ezuko inwe nkwekọrịta tara ọchịchị n'etiti ha.

Ọ bụrụ na nke a mee, Okonjo-Iweala ga-abụ nwaanyị mbụ n'ụwa nakwa Afrịka ga-anọ n'ọkwa a kamge afọ 25 e hiwere otu a.

Gịnị mere Amerịka akwadoghi Okonjo-Iweala?

Ngozi Okonjo Iweala

Ebe foto si, Getty Images

Dịka onye ntaakụkọ BBC n'okwu akụnaụba bụ Andrew Walker si kwuo, mba Amerịka kwadoro ka Myung-hee nke Korịa maka na "o nwere ahụmihe n'azụmaahịa mba na mba nakwa etu o si agbapụ ọzọ n'ime ihe"

Ha ekwughi kpọmkwem ihe mere ha akwadoghi Okonjo-Iweala.

Skip X post, 11
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 11

Aha onyonyo, Anyị enweghikwa ndị ga-azụ mmanụ agbịdị anyị.

Kedụ ndị so Ngozi Okonjo-Iweala zọọ ọkwa a?

Otu 'World Trade Organisation' ewepụla mmadụ atọ so azọ ọkwa onyeisi otu ma hapụ Okonjo-Iweala n'ọsọ oche ahụ.

WTO wepụrụ Jesus Seade nke Mexico, Hamid Mamdouh nke Egypt nakwa Tudor Ulianovschi nke Moldova n'agba nke mbụ n'ime atọ nke atụmvootu ha.

N'ozi WTO wepụtara n'akara Twitter ha, ha kwuru na "ndị ga-abanye agba nke abụọ na ntule onye ga-abụ onyeisi WTO gụnyere Ngozi Okonjo-Iwela(Nigeria); Yoo Myung-hee(Korea;Amina C Mohammed(Kenya, Mohammad Maziad Al-Tuwaijri (Saudi Arabia) na Liam Fox(United Kingdom).

Skip X post, 12
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 12

A ga-eme ya bụ agba nke abụọ ntule n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Septemba, ebe nke atọ ebe a ga-ekwupụta mmadụ abụọ fọrọ n'ọsọ ikpeazụ ga-abụ abalị isii nke ọnwa Oktoba.

Lee ndị chere Ngozi Okonjo-Iweala aka mgba maka ọkwa onyeisi WTO

Ndị na-azọ ọkwa onye nchịkọa otu 'World Trade Organisation' (WTO)
Nkọwa foto, Ndị na-azọ ọkwa onye nchịkọa otu 'World Trade Organisation' (WTO)

Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ekpe ekpere ka Ngozi Okonjo-Iweala bụrụ onye nchịkọta otu ahịa mbaụwa a kporọ 'World Trade Organisation' na Bekee.

Okonjo-Iweala bụ nwa ada ude ya na-ede na mbaụwa niile n'ihi etu ụbụrụ ya si acha ọkụ.

Aha onyonyo, Ngozi Okonjo-Iweala: Ihe ndị aga-eme ka akụnaụba ala anyị ghara ịdakpọ n'ihi coronavirus

Ọ rụọla ọrụ ugboro abụọ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo nakwa Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.

Ọ bụkwara osote onyeisi ụlọakụ mbaụwa (World Bank), ma nọrọkwa n'isioche ọtụtụ ụlọọrụ na ngalaba a ma aha ha n'ụwa.

Ndị a gụnyere Twitter, Gavi, ụlọakụ 'Standard Chartered', dịrị gawazie.

Mana mmadụ asaa ọzọ egosikwala mmasị ha iso Okonjo-Iweala zọọ ọkwa 'Director General' nke WTO.

O lee ndị ka ha bụ?

1) Jesús Seade Kuri (Mexico)

Jesús Seade Kuri

Ebe foto si, WTO

Nkọwa foto, Jesús Seade Kuri

Kuri bụ onye kacha mee okenye n'ime ndị niile so azọ ọkwa a.

Ọ gbara afọ iri asaa na atọ (73).

Kuri arụọla ọrụ na WTO, 'International Moonetary Fund' nakwa n'ụlọakụ mbaụwa (World Bank).

Ọ rụkwaala ọrụ na gọọmentị Mexico.

2) Abdel-Hamid Mamdouh (Egypt)

Abdel-Hamid Mamdouh

Ebe foto si, Abdel-Hamid Mamdouh

Ọ bụ onye ọkaiwu nakwa ọka nkuzi a ma ama.

Mamdouh arụkwaala ọrụ na WTO, ma bụrụkwa onye nọchiri anya mba Egypt n'okwu azụmahịa na mba Ethiopia, Switzerland, nakwa Australia.

Ọ gbara afọ iri isii na asatọ (68).

3) Yoo Myung-hee (South Korea)

Yoo Myung-hee

Ebe foto si, Getty Images

Myung-hee bụ nwaanyị nke mbu rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta azụmahịa nke mba South Korea

Ọ gbara afọ iri ise na atọ (53)

Ọ rụọla ọrụ ihe gbasara azụmahịa mbaụwa ruo afọ iri abụọ na ise (25)

O so na ndị nyere aka hazigharịa azụmahịa mba Korea ka ọrịa coronavirus ghara imekpa ha ahụ.

4 Tudor Ulianovschi (Moldova)

Tudor Ulianovschi

Ebe foto si, Twitter/Tudor Ulianovschi

Onye nke a bụ onye kacha dụrụ nwata n'ime ndị niile na-azọ ọkwa onye nchịkọta otu WTO.

Ọ gbara naanị afọ iri atọ na asaa (37).

Tudor rụburu ọrụ dịka Mịnịsta hụrụ maka mmekọrịta mba Moldova na mba ndị ọzọ, nke Bekee kpọrọ 'Foreign Affairs'.

Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nnọchite anya mba ahụ na Switzerland na Liechtenstein.

5) Amina C. Mohamed (Kenya)

Amina C Mohammed

Ebe foto si, Twitter/Amina C Mohammed

Onye nke a abụghịkwa Amina Mohammed nke rụburu ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka gburugburu (environment) na Naịjirịa, ọ bụ onye Kenya.

Amina arụọla ọrụ nke ọma n'otu WTO dịka onyeisioche ọgbakọ ọha (General Council), nakwa onyeisi oche ngalaba na-ekpezi esemokwu nke Bekee kpọrọ 'Dispute and Settlement Body'.

Ọ rụkwaala ọrụ dịka Mịnịsta na ngalaba dị icheiche na gọọmentị mba Kenya.

Amina gbara afọ isi ise na asatọ (58).

6) Mohammad Maziad Al-Tuwaijri (Saudi Arabia)

Mohammad Maziad Al-Tuwaijri

Ebe foto si, WTO

Nkọwa foto, Mohammad Maziad Al-Tuwaijri

Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka nhazi akụnaụba na Saudi Arabia.

Ọ bụkwa onye na-akwọ ụgbọelu (pilot) ma bụrụkwa onye ọrụ ụlọakụ n'oge gara aga.

Ụlọakụ ebe ọ rụburu ọrụ gụnyere 'Saudi British Bank', J.P.Morgan nakwa HSBC.

Ọ dị afọ iri isii.

7) Liam Fox (United Kingdom)

Liam Fox

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Liam Fox

Fox gbara afọ iri ise na asatọ (58)

Ọ rụrụ ọrụ dịka ode akwụkwọ ukwu na-ahụ maka azụmahịa n'oge Theresa May bụ Praịm Mịnịsta mba UK.

A mụrụ ya na Scotland, ọ gụọ akwụkwọ na Mahadum Glasgow ebe ọ natara ọzụzụ dịka dịbia bekee.

Ọ rụrụ ọrụ dịka dọkịta na ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Service'.

Roberto Azevedo

Ebe foto si, Roberto Azevedo

Nkọwa foto, Roberto Azevedo bụ onye nchịkọta WTO ugbua mana ọ ga-arịtu na ngwụcha ọnwa Ọgọst

Roberto Azevedo, onye ji ọkwa 'director general' nke otu WTO ugbua, ekwuola na ya ga-aritu na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2020.

Ọ bụ afọ anọ ka mmadụ na-anọ na ya bụ ọkwa, mana e nwere ike inye mmadụ ohere ka ọ chịa nke ugboro abụọ.

E tinyere Azevedo n'ọkwa ahụ n'afọ 2013, ma nyekwa ya ohere nke abụọ na 2017.

Mana o kwuru na ya agaghị eche ka oge ya gwụ na 2021 tupu ọ rituo.

Usoro e si ahọpụta onye nchịkọta WTO

Skip X post, 13
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 13

Ọ bụ mba dị iche iche ga-ahọpụta onye nke ha chọrọ ka ọ chịa otu WTO.

Nhọpụta a akwụsịla n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị.

Ndị a họpụtara ga-amalite igosipụta onwe ha nakwa ịgwa ọha obodo ihe ha bu n'obi ime ma ha nweta ya bụ ọkwa.

Agba nke a ga-akwụsị n'ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba.

Nke a gachaa, ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-amalitezi ọgbakọ ebe ha ga-anọ tulee ndị niile a họpụtara ma jụọ ese niile ha kwesịrị ịjụ.

Agba nke a na-ewe ihe dịka ọnwa abụọ.

N'ikpeazụ ka ha ga-ahọpụtazi onye meriri ya bụ asọmpi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mgbe a na-ekpebi maka ọchịchị Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, WTO/Twitter