World Bank Leadership: Ngozi Okonjo-Iweala a na-arọ ọkwa a anya?

Ebe foto si, Reuters
Onye bụbụ minista na-ahụ maka mpata na mmefu akụ na ụba Naịjirịa bụ Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola na ọ ga-achịnwụ dịka onyeisioche ụlọakụ mbaụwa maọbụrụ na enye ya ohere.
Okonjo Iweala gwara onye ntaakụkọ CNN nke a mgbe ọ gbara ya ajụjụ ọnụ n'izu ụka gara aga na ọtụtụ mmadụ na-ajụ ya ma ọ ga-ewe ọrụ dịka onyeisioche ụlọakụ mbaụwa.
Ọ gwara Richard Quest na ọ ga-azọ okwa ahụ ma ọbụrụ na ọnọdụ niile gbara usoro e ji azọ oche ahụ gburugburu dị ya ahụ mma.
Cheta na onye bụ onyeisioche ụlọakụ mbaụwa bụ Jim Yong Kim tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ya na mbido ọnwa Jenụwarị na-anọzubeghị oge o kwesiri ịpụ n'oche ahụ.
Okonjo -Iweala bụkwa onye ọkwa ya gbagotere n'ụlọakụ mbaụwa na Kim zọkọrọ ọkwa onyeisioche n'afọ 2012.
Ka ọ dị ugbua, ọ bụ ya ka a na-elegara anya na ọ ga-ebu ụzọ na ndị ga-azọ ọkwa ahụ.
Mgbe a jụrụ ya ma o tinyela akwụkwọ igosi na ọ chọrọ izọ ọkwa ahụ, o kwuru "mba, emebeghịm ya, ị jụrụ ajụjụ, m zakwa gị ya n'ụzọ ziri ezi, obi di m mma."
Kedụ ka esi ahọpụta ndị ga-achị ụlọakụ mbaụwa?
Dika e si depụta n'akara webụsaitị "World Bank, ọ bụ ndị ọkachasị n'ọkwa ụlọakụ ahụ ga-ahọpụta ndị ha chere ga-arụli ọrụ onyeisioche.
Ha mecha nke a, ha si na ndị ha họpụtara wee họpụtakwazịa otu onye ga-arụ ya bụ ọrụ.
Onyeisioche "World bank" esila na mba Amerika pụta ugboro iri asaa na atọ.
Mpụta Okonjo Iweala n'afọ 2012 ga-eme ya nke mbụ a na-enwe ndọrọndọrọ n'etiti onye na-esighị mba Amerịka na ndị Amerika na-azọ oche ahụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:








