Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter

Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Okonjo-Iweala dere akwụkwọ maka mpụ na awaụwọ dị na gọọmentị mgbe ọ nọ ọrụ obodo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọọrụ sochal midia na-ewu ewu bu Twitter emela onye bụbu minista na-ahụ maka ego na akụnaụba na Naịjirịa bụ Ngozi Okonjo-iweala onye ọrụ ha.

Okonjo-Iweala ga-arụ ọrụ dịka otu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na "Board" ndị Twitter.

Okonjo-Iweala ruburu ọrụ na ọchịchị Olusegun Obasanjo site afọ 2003 ruo 2006 na Goodluck Jonathan site 2011 ruo 2015.

"Anyị na-agba mbọ ịhụ n'ụwa anyị dị mma , Twitter nyere ohere ịgbasa ozi ma mee ka mkparita uka mmadụ na ibe ya maka ihe na-eme n'ụwa mụbawanye," bu ihe Okonjo-Iweala kwuru na ozi ozipuru.

Okonjo Iweal bụ onye a na-ukwanyere ugwu maka ọru ọ na-arụ na World Bank.

O dere akwụkwọ na nso a maka ihe ọ hụru n'ọchịchị Jonathan.

A ha akwụkwọ a bụ "Fighting Corruption is Dangerous: The Story Behind The Headlines".

Twitter nwere mmadụ nde 336 na-apị akara ha kwa ọnwa.

N'Afrịka, ndị mmadụ kwadoro Twitter, bu ihe ha ji akparịta ụka banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ.

Okonjo-Iweala jikwa Twitter nabata ọkwa ọhụrụ a:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ma kelekwa onye ọrụ a Twitter zipuru ozi a na mbụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nke a bụ ugo ọzọ Okonjo-Iweala ga-etinye na ndị nke onweburu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ