Mpụ na aghụghọ adọbala ụmụafọ Naịjirịa ise n'ụlọikpe na Kenya
Ndị uweojii na mba Kenya akpụpụla ụmụafọ Naịjirịa ruru ise ụlọịkpe taa bụ tọọsde maka ịzara ọnụ ha n' ebubo mpụ a kpọrọ 'Sim swap scam' na bekee.
Ego ha zuru n'aka ndị mmadụ ruru ọtụtụ puku shillings n'ọnụọgụgụ ego ndị mba Kenya.
Safaricom bụ ụlọọrụ ekwentị amaama na Kenya bụ ndị nke a kachasị metụta.
Dịka Sammy bụ otu onye na-eji safaricom akpọ ekwenti kọrọ ahụmihe ya na soshal midia.
Ọ sị na ndị a na-aghọ aghụghọ a kpọrọ n'elu ekwentị ọ zaa, mgbe o doghị ya anya ọ malitere ịkwụsị oku ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
O mekwara ngwangwa kọwara ndị Safaricom tupu e si ebe ahụ zuru ego ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ndị uweojii na-enyocha okwu a kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị mba Kenya na-enyere ha aka n'ime mpụ.
Mba Kenya bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ihe akpọrọ 'Mobile money' akwụ ụgwọ ihe dị icheiche.