Raila Odinga echiela onwe ya onyeisi na Kenya

Ebe foto si, Reuters
Onye isii ndị na nọghị nọchịchị na Kenya bụ Raila Odinga e were la aka ya duo onwe ya n'iyi ọrụ dika onye isii ala.
Ihe karịrị mmadụ narị atọ gbakọrọ na mbara etiti n'isiobodo bụ Nairobi ebe mmemme a mere.
Ebe emechara nke a, ndị gọọmenti mba Kenya ekwụọla na otu ndị anoghị n'ọchịchị bụ NRM bụ otu ndị omekome.
Ndị ọrụ na mba Kenya emechiela ụlọọrụ ndị mgbasa ozi iji gbochi nwepụta idu iyi ọrụ nke onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Odịnga.
Ihe karịrị mmadụ narị atọ gbakọrọ na mbara etiti n'isiobodo bụ Nairobi ebe mmemme ndị anọghị n'ọchịchị ahụ kwesiri ị mee.
Cheta na Odinga juru ịhe pụtara na ntụliaka nke onyeisi ala Kenya, yamere ejị kagbue ihe pụtara na ntụliaka nke ahụ emere n'Ọgọstụ.
Uhuru Kenyatta meriri ntuliaka nke emegharịrị n'Ọkụtoba mana Maazị Ọdinga esonyehi na ya.

Ebe foto si, Reuters
A gaara n'ịhụ chịe Kenyatta onye isi ala mba Kenya nke ụgboro abụọ na ọnwa Nọvemba.
O nyekwara iwu sị ndị ụlọọrụ mgbasa ọzị ha egosina mmemme onye anọghị n'ọchịchị.
N'itinye nke a, onye okaikpe kachasi na mba Kenya kwuru na onye na-egọsị mmemme ahụ ga-eme onwe ya onye ilo ala ha.
Mana ụlọọrụ ndị mgbasa ozi ndị ukwu n'egosi mmemme ahụ n'elu igwe okwu Facebook na YouTube ha.
Nke a bụ ịhe Ọdinga kwuru n'elu igwe okwu Twitter:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọ gbanwela aha ya n'elu igwe okwu Twitter:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2









