Oby Ezekwesili: Naanị ndị chọrọ ikwenye n'ụgha kwenyere n'ebubo ACPN

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, @obyezeks

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ngwa ngwa Ezekwesili mere ka owee anya, na ya achọghịkwa ịzọ ọkwa onyesiala na 2019, onyeisi pati ha bụ Ganiyu Galadima boro Ezekwesili ebubo ịji ọkwa ahụ arịọta ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ego.

Galadima kpọkwara ya oku ka ọ bịa kọwa ka ha siri mefuo ego pati ahụ na ọsọ achụmta vootu.

Mana n'ọsịsa ya n'igwe okwu Twitter, Ezekwesili kwuru na o nweghị eziokwu dị n'ebubo ndị ndu pati ACPN boro ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

O kwuru na mkpebi pati ya ịdọnyere onye na-azọ n'aha APC ukwu ozigbo ya rituru gosiri na ha bụ ndị iji ọndọọndọọ achụ mkpa ha.

Ezekwesili kwuru na ọsọ achụmnta vootu ya bụ nke ya kwụwara aka ọtọ were eme n'ihi nkwenyere ya na ime ihe dịka o kwesịrị.

Ọ bụ ntozu ọ bụghị agbụrụ ka m na-ele anya - Buhari

Buhari na-efele ndị mmadụ aka n'Enugwu

Ebe foto si, @BashirAhmad

Onyeisiala Muhammadu Buhari gara achumta vootu na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ụnyaahụ.

Njem ahụ kpọgara ya Anambara na Enugwu steeti ebe ọ gara mgbape ụlọ ozu onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa bu Nnamdị Azikiwe.

Buhari si Ọnịcha gawa ọgbọ egwuregwu Nnamdi Azikiwe dị n'ime Enugwu ebe o nọ metụ ile n'okwu banyere mkpagbu ụfọdụ na-ebo ya na o na-emegbụ ndị Igbo.

Buharị sị na nke a abụghị eziokwu n'ihi ya na enye Igbo oke nke ruru ha.

N'okwu banyere ndị isi ndi ọrụ nchekwa, nke ọ bụ sọsọ ndị ugwu nọ n'ọkwa, Buhari kwuru na ọ bụ ntozu ka ya na-ebu n'uche nwere na-enye ọkwa.

Gọọmenti etiti akatọla okwu Sineti kwuru banyere Bọọjetị 2019

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Nigeria Presidency/Twitter

Gọọmentị etiti akatọọla okwu ndị omeiwu kwuru banyere akwụkwọ mkpata na mmefu nke 2019.

Ngalaba na ahụ maka bọọjeti n'ụlọ omeiwu nke ukwu kwuburu na ufọdụ ihe adabachaghị dị na ya bụ bọọjetị,

Mana Maazị Ben Akabueze, bu onyeisi ngalaba na-ahu maka bọọjeti, kwuru ha zigara ndị omeiwu a okwu a metutara ozi ime ka ha mata na ya bu bọọjeti kwụ ọtọ.

Mgbape ụlọ ọrụ gọọmentị Amerịka ka bụkwa ihe a na-adọ ndọrọndọrọ

Trump na Pelosi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Trump na onyeisi ụlọ o,eiwu nke obele bụ Nancy Pelosi na-ama aka onye ga-ebu ụzọ tabie anya

Ndị omeiwu ukwu nke mba Amerịka agbajọla atụmatụ abụọ ga-enye aka ịkwụsị mgbachi ụfọdụ ụlọ ọrụ gọọmentị.

Onweghi atụmatụ abụọ ahụ nwetere ndị nkwado ruru mmadụ iri isii, bụ ọnụọgụgu ọ ga-eru iji gafe gawa n'aka onyeisiala Donald Trump.

N'egwuregwu

Fifa

Ebe foto si, Reuters

Ngalaba na-ahu maka egwuregwu bọọlu bụ Fifa achụọla otu onye Referee maka iri aka azụ.

Ibrahim Chaibou bu onye Naịja agaghị emetutakwazi ihe metụtara egwuegwu bọọlụ aka na ndụ ya. Ọ ga-akwụkwa ihe karịrị pụku narị dọla abụọ.

Akụkọ BBC Igbo na Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile