Olusegun Obasanjo: Ihe Atiku ji kara Buhari mma

Aha onyonyo, Mkaprịtaụka Obasanjo na BBC

Na mkparịtaụka ya na BBC Yoruba nwere, onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru maka onye bụbu osote nakwa onye na-azo ọchịchị na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 bụ Atiku Abubakar.

O sị na asị ya hara ugbua na ya ga ahara Atiku karia Buhari n'ihi ihe Buhari merela.

"Ndị e nwere ịhọrọ n'etiti ha bụ onye nke APC na nke PDP. Site n'ihe m huru n'aka Buhari- amaghị ọrụ ma ncha, ịkpa oke, nrụrụaka, adịghị ike ahụ, adịghị ike nke uche na ihe niile ndị ọzọ were ya tụnyere Atiku. Atiku ga-agbali mmaji abụọ karịa Buhari."

O kwukwara maka Boko Haram nakwa Independence National Electoral Commission (INEC).

Obasanjo kọwara na ya kwenyere na Onyeisiala Muhammadu Buhari ka Atiku njo, bu ihe mere ya jiri rapụ ikwado ndi ntoroọbịa n'ime mmadụ 73 na-azọ oche onyeisiala Naịjirịa.

O kwukwara ihe mere tupu ndị agha wakpo obodo Odi n'afọ 1999, bụ mgbe ihe ruru mmadụ 2500 ndị obodo nwụrụ n'aka ndị agha.

Mkparịtaụka a ga-apụta n'uju eche bụ ụbọchị nke 22 nke ọnwa Janụwarị 2019.

N'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garuba Shehu kwuru na ahụ adịghị Obasanjo na o kwesịrị ị ga-ahụ dọkịta.

O kwukwara na ọ bụ anyaọkụ na-enye Obasanjo nsogbu.

Akukọ ga-amasị gị: