Hushpuppi: Dubai o ji maka Hushpuppi kwụsị inye ụmụ Naịjirịa visa? Lee nke bụ eziokwu

Dubai na Hushpuppi

Ebe foto si, Dubai/Hushpuppi Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Nke na-ewu n'ụtụtụ a bụ na ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na ọ dịka Ramon Abbas Igbalode e ji Hushpuppi mara ebuterela ha ọgbatauhie maka etu e si nwuchie ya n'ihi nrụrụaka ego n'ịntanet.

Mana otu onye nwere ụlọọrụ ebe a na-enye ndị mmadụ 'visa' Dubai bụ Emeka Ochoro kwuru na akwụkwọ ahụ na-efegharịnụ n'elu soshal midia kwuru na ndị mba ahụ akwụsila inye ndị Naịjirịa 'visa' bụ ụgha.

O kwuru na naanị 'visa' Dubai akụsitụrụ inye ụfọdụ ndị mba ọzọ nke Naịjirịa so na ya bụ visa nlegharị anya.

O kwuru na ndị Dubai na-ahazi ọba ọzi ha gbasara ndị mbịambịa ka ha wee tinye ihe ha kpọrọ 'travel insurance' nke ga-abụzị iwu na onye ọbụla na-abata be ha ga-enweriri.

Ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia maka atụmaatụ a

Hushpuppi

Ebe foto si, INSTAGRAM/@HUSHPUPPI

@Kofi_Seven tinyere akwụkwọ gosiri ihe niile a ga-ebido kwụsị imere ụmụ Naịjirịa na-aga maọbụ bi Dubai.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụrụ na Hushpuppi nọ na Naịjirịa na a gaarala ahapụ ya ka ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

BBC Igbo gara n'ọba ozi ndị Dubai ka ha mara ma akwụkwọ ahụ na-efegharị n'elu soshal midia adị ebe ahụ, mana ha ahụghị ya.

Anyị ka na-agbalị ịnụta n'ọnụ ụlọọrụ na-enye visa maka ịga Dubai ka anyị mara ma ihe ụmụ Naịjiria na-efesa n'elu soshal midia a bụ eziokwu.

Cheta na a sị na Hushpuppi na ndị otu ya zuru ego ruru nde dọla 14.7 ($14.7m) site n'aka otu ụlọakụ n'afọ 2019.

Etu esi nwuchie Hushpuppi na Dubai

Ụlọikpe ajụla ịtọhapụ Ramon Abbas Igbalode e ji Hushpuppi mara dịka ọkaiwu ya pụtara n'ụlọikpe rịọ ka atọhapụla n'ụlọmkpọrọ ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe.

Ọkaipke Jeffrey Gilbert bụ lere usoro ikpe a n'onyonyo na Chicago jụrụ ịtọhapụ Hushpuppi maka na o nwereike iripu ọsọ.

Ọkaikpe a nyere iwu sị ka a kpọchie ya na mkpọrọ ruo mgbe a ga-eleba anya n'ikpe na Kalifonia na ngwụcha afọ a.

Ọkaiwu Hushpuppi bụ Gal Pissetzky degara ụlọikpe akwụkwọ ka a tọhapụ Hushpuppi bụ onye e boro ebubo izu ohi n'ịntanet.

Mgbe a nwụchiri ya

Ebe foto si, SCREENSHOT/DUBAI MEDIA OFFICE TWITTER VIDEO

Ụlọikpe a jụwara isi ma sị na a tọhapụ ya na o nwereike ịgba ọsọ maọbụ were ịntanet gwuo jangum ọzọ

Mana e mechara nwụchie ya n'ọnwa Juun na Dubaị ma buru ya bata mba Amerịka ebe a na-ekpe ya ikpe ugbua.

Goodluck Jonathan abụrụla onye nnọchiteanya Ecowas na mba Mali

Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Getty Images

Otu jịkọrọ mba ndị nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas ahọpụtala aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan dịka onye nnọchite anya otu ahụ na mba Mali.

Ikechukwu Eze, onye enyemaka mgbasa ozi Jonathan, kwuru na ọrụ ya ga-abụ inye aka na mkparịtaụka iji mezie esemokwu dapụtara na mba ahụ.

Jonathan ga-ahapụ Naịjirịa gawa mba Mali n'ụbọchị Wenezde.

Ọgbaaghara dị na mba Mali ugbua nke malitere kamgbe ọnwa Maachị afọ 2020 oge e mechara ntuliaka maka ndị ụlọ omeiwu mba ahụ.

Ndị oyi egwu na-enyekwa nsogbu na mba ahụ nke ukwuu.

Ụlọomeiwu emeela iwu ka a malite ịtụ ndị ntọrị nga mkpụrụ ọka

Ndị Sịnetọ

Ebe foto si, NASS

Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa nọrọ n'ụbọchị Tuzde mee iwu sị ka a tụọ onye ọbụla ikpe mara maka ịtọrọ mmadụ nga mkpụrụ ọka.

Iwu ọhụrụ megidere ma nọchie anya iwu dị na mbụ sịrị ka a tụọ ndị dị etu a mkpọrọ afọ iri.

Ọ hazigharịkwara iwu dịbu adị a kpọrọ 'Criminal Code' nke dị ire n'ọtụtụ steetị dị n'ọdịda anyanwụ ewepu Legọs.

Ha gara n'ihu welite oge e tinyere n'inyete ikpe ziri ezi nye onye a wakporo n'ikeke site n'ọnwa abụọ ọ bụ na mbụ ruo afọ ole ọbụla ọ ga-ewe ụlọikpe inwete ikpe ziri ezi a.

Onye kwadoro iwu a gaferela mkpọpụta nke n'ụlọomeiwu bụ Sịnetọ Oluremi Tinubu. Ọ bụrụ na ọ dị ire, agaghị enwe mmechi oge maka ime mkpesa onye a wakporo.

Ihe ụwa agaghị echezọ maka nwaanyị na-eme ihe nkiri achọtara ozu ya na mmiri

Naya Rivera

Ebe foto si, Naya Rivera Instagram

Obi gbawara ụmụ ụwa ka ndị uweojii kwuputechara na ha ahụla ozu Naya Rivera na-eme ihe nkiri n'Amerịka .

Cheta na e bidoro chọwa ozu Rivera kamgbe ọ gara njem mmiri na California n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julai.

Mana ndị ọrụ ha bụ ịba n'ime ala mmiri chọgidere ya ma chọta ozu ya na mmiri.

Naya Rivera

A hụrụ nwa ya ebe ọ na-arahụ ụra n'elu ụgbọmmiri mana ahụghị Rivera.

Lee ihe ndị a ga-eji cheta nwaanyị a

  • O so mee ihe nkiri a kpọrọ 'Glee' nke ndị mmadụ na-eto mgbe niile. N'ime ihe nkiri ahụ ọ kpara agwa dịka
  • Ọ bụ ọgụ egwu ama ama n'Amerịka.
  • O bidoro mewe ihe nkiri kamgbe ọ dị afọ anọ
  • O ritere ọtụtụ nturugo tupu ọ nwụọ.

Ndị mmadụ gosiri nwute ha n'elu soshal midia.

Ndị otu ya na-ebe sọ akwa.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ndị mmadụ si ka echeta Rivera maka etu o si gbaa mbọ zọta ndụ nwa ya tupu ọ nwụọ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

EFCC anwụchiela Onwuzurike Kingsley maka nrụrụaka ruru $8.5M

Onye ndí EFCC boro ebubo nrụrụaka

Ebe foto si, EFCC

Ngalaba Economic and Financial Crimes Commission n'ụbọchi iri na atọ bụ Monde ebidola ikpe maka ebubo nrụrụaka eboro Onwuzurike Ikenna Kingsley bụ onye si obodo Umurokoala nke Abia steeti.

Ọ bụ okaikpe bụ A.T Mohammed na-ekpe ya bụ ikpe n'ụlọikpe elu nke dị na Port Harcourt, Rivers state.

Ọ bụ n'ikpe a ka ndị EFCC kpọpụtara onye aka ebe ha bụ Abbas Suleiman bụ 'Assistant Detective Superintendent' nke ndị EFCC.

Ebe a ka ha nọ kọwaa na ha napụtara Onwuzurike ekwe ntị, igwe kọpụta, akwịụkwọ ikike njem Naijirịa atọ na otu ụgbọala Acura.

Eboro Onwuzurike ebubo iji ahụghọ napụ ndị mmadụ ihe ruru nde dọlla asatọ na ụma.

Ebubo a kwuru na Onwuzurike mere ka ọ bụ ya bụ Jeff Sikora, onyeisi ụlọọrụ Prime Trust Credit Union Bank nke mba Amerịka were napụ ndị mmadụ ego nke gụnyere nwoke mba Ijipt ọ napụrụ nde dọlla isii na ụma.

Ndị EFCC boro Onwuzurike ebubo na ọ natara dolla puku abụọ n'aka onye otu ya bụ Obi Taxas a na-achọ achọ nke bụ oke ya na nrụrụaka ha ji napụ ndị mmadụ ego.

Dịka ọ dị ugbu a, okaikpe ebugharịala ikpe Onwuzurike ruo ụbọchị iri na isii na iri na asaa nke ọnwa Julị afọ 2020.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: