Obinwanne Okeke: Mba Amerịka amala Invictus Obi ikpe ma tụọ ya mkpọrọ

Ebe foto si, Medium
Mba Amerịka amala Invictus Obi ikpe maka iji igw kọmputa zuo ndị mmadụ ohi ihe ruru nde dọla iri na otu.
N'ikpe e kpebiri n'ụbọchị Tuzde, a tụrụ Invictus Obi mkpọrọ afọ iri maka agwa ọjọọ a ọ kpara.
Invictus Obi, onye ezigbo aha ya bụ Obinwanne Okeke, bụ onyeisi ụlọọrụ Invictus Group.
Ọtụtụ ụlọọrụ a ma aha ha na-akwanyere nwa amadị a ugwu dịka onye na-eme ọfụma, mana ugbua, ọ gaala mkpọrọ n'ihi nrụrụaka.
Ndị nnyocha na mba Amerịka kwuru na ọ bụ ụlọọrụ Invictus Group ka Obinwanne ji egwu ndị mmadụ wayo site n'ịntaneetị.
Onye bụ Obinwanne Okeke?
- Ọ bụ onye Ukpor n'Anambara steeti
- A mụrụ ya n'abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba afọ 1987
- Ọ bụ nwa nke iri na asaa, dịka nna ya lụrụ ụmụnwaanyị anọ tupu ọ laa mmụọ
- Obinwanne gara akwụkwọ mahadum na mba Saụt Afrịka nakwa Ọstralia
- O nwetara nturuugo dị icheiche oge ọ nọ na mahadum
- Akwụkwọ e wepụtara n'ụlọikpe gosiri na Obinwanne nwere otu nwa nwaanyị mana o dochaghị anya ma o nwere nwunye
- Oge BBC gbara ya ajụjụ ọnụ n'afọ 2018, o kwuru na nne ya tara ahụhụ iji zụọ ya n'akwụkwọ, nke mere o ji ṅụọ iyi na ọ ga-ehichapụ nne ya anya mmiri
- O kwuru n'oge ahụ na ọ malitere ịzụ ahịa oge ọ dị afọ iri na isii, oge nna ya nwụchara.
Nturuugo enyerela Obinwanne Okeke

- June 2016 - Forbez nyere ya nturuugo dịka otu n'ime ndị ntorobịa iri atọ na-erubeghị afọ iri atọ na-eme ọfụma n'Afrịka
- May 2017 - Otu African Brand Congress nyere ụlọọrụ Obinwanne nturuugo dịka ndị kacha mara ihe ekwe na-akụ n'Afrịka
- May 2017 - Forbes tinyere Obinwanne dịka ndị ga-eso kwuo okwu n'ọgbakọ EMEA (Europe, Middle East and Africa) nke afọ ahụ
- October 2017 - Obinwanne so na ndị a kpọrọ aha maka nturuugo onye na-eto eto kacha nwee ọgụgụ isi n'iji ego achụ ego
- 2018 - BBC Africa kọwara Obinwanne dịka onye na-akpalite obi ndị ntorobịa n'Afrịka
Lee ụmụ Naijirịa aka ji maka nrụrụaka ịntanetị

Ebe foto si, FORBES/HUSHPUPPI INSTAGRAM
Dịka ndị uweojii obodo Dubai wepụtara onyonyo gosiri etu ha si jide Ramon Abbas eji Hushpuppi mara, otu ihe ndị Naịjirịa ji agbarụ ihu bụ etu ụfọdụ ndị si eji mpụ na aghụghọ emetọsị aha mba ahụ.
Okwu mpụ na aghụghọ abụghị sọsọ nsogbu dịrị Naịjirịa, mana n'ụwa ugbua, ị kwute okwu mpụ nke Bekee kpọrọ "advance fee fraud", aha Naịjirịa ga-esepụta isi.
Kedụ mpụ a na-ebo ndị Naịjirịa?
Na Naịjirịa, iwu machiri ịsị mmadụ weta ego ka e nye ya ego ọkankụ. Akara iwu ji mpụ a bụ 419. Ọ bụ etu a ka mpụ akpọrọ 419 siri nwete aha a na-etu ya.
Dịka ịntanetị batara Naịjirịa, ụfọdụ ndị malitere iji ọba mgbasaozi a kpọrọ Yahoo na-achọ ndị ha ga-anara nke ha ji. Ọ bụ etu a ka mpụ e ji "yahoo yahoo" mara siri nweta aha ya.
Ọ bụghị sọsọ yahoo yahoo na 419 ka ụwa na-atụ Naịjirịa aka maka ya.
Ụfọdụ ihe mpụ ọzọ gbasara iji ịhụnanya ghọọ aghụghọ nakwa iwere aha na ọbaego ndị ọzọ na-ego ihe n'aka nke Bekee kpọrọ "credit card fraud".
Mana, dịka aha Naịjirịa na-ewu banyere mpụ na nrụrụaka, ụfọdụ ndị na-asị na ihe na-eme bụ inye nkịta ajọ aha a ga-eji kpọgbuo ya makana ọ bụghị ndị mba ahụ kachasị eme mpụ n'elu intanetị.
Lee ụfọdụ ndị Naịjirịa e boro maọbụ maa ikpe ụdịrị mpụ a na mbaụwa:
1: Hushpuppi

Ebe foto si, SCREENSHOT/DUBAI MEDIA OFFICE TWITTER VIDEO
Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa Bekee kpọrọ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), dere na Hushpuppi - onye ha sị na ezigbote aha ya bụ Ramoni Igbalode- nwere azịza n'aka ha dịka uweojii Dubai nwuchiri ya.
Ndị uweojii na Dubai kpọrọ Hushpuppi Ramon Olorunwa Abbas, ma kwuo na nwaamadị a kpara nnukwu ike na mbaụwa site na igwu ihe karịrị mmadụ nde chandum.
Ha sị na nwaamadị a na-arụ webụsaịtị adịgboroja nke ụlọọrụ ndị a ma ama nakwa ụlọakụ, were anapụ ndị mmadụ ihe banyere credit card.
Ha sị na ha hụrụ akaebe gosiri na Igbalode na ndị otu ya zuru ego ruru nde dọla 435. Ha nwetekwara ego karịrị nde dọla iri na be maazị Igbalode.
2: Obinwanne Okeke

Ebe foto si, Medium
Obinwanne Okeke dị afọ 32 kwenyere n'ụlọikpe na ikpe mara ya n'ebubo na o mere mpụ dịka o zuru nde dọla 11 na mba Amerịka.
Okeke a ma dịka Invictus Obi bụbu ntoroọbịa ndị mmadụ na-eto ọfuma na Naịjirịa tupu ama agbaa na o so na ndị nrụrụaka.
3: Mompha

Ebe foto si, EFCC
Okwu nwamadị a nwurula ọkụ n'ụbọchị 22 nke ọnwa Ọktoba 2019 oge ngalaba EFCC dere n'akara Twitter ha na ha anwụchiela Ismaila Mustapha eji Mompha mara, maka ebubo nrụrụaka.
EFCC sị na ike Mompha kpara banyere nrụrụaka n'elu ịntaneti nyere ya ohere izute ijeri naịra 33.
Ha boro ya ebubo ruru 14 mana ụlọikpe mechara nye ha ohere ịla be ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Nọvemba 2019.
Mana, ikpe ya ka na-aga n'ihu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
4: Nnwụchi ihe ruru ụmụ afọ Naịjirịa 80 maka nrụrụaka n'Amerịka n'afọ 2019
Ọ bụ ka chi foro n'ụbọchị 23 nke ọnwa Sepụtemba 2019 ka akụkọ pụtara na ngalaba Federal Bureau of Investigations (FBI) nwụchiri ụmụ afọ Naịjirịa ruru 80 maka nrụrụaka ha jiri zuo ihe ruru nde dọla iri.
Ndị FBI sị na ndị a ji aghụghọ dị icheiche chọrọ izute nde dọla 40 na mba ruru iri.
5: Babatunde Martins
Na Decemba 2019 gọọmentị Amerịka si mba Gana kpọrọ nwaafọ Naịjirịa bụ Babatunde Martins gawa Amerịka ịga zara ọnụ ya maka nrụrụaka dị iche iche.
Ọ bụ Michael Duvanant bụ onye gbara ama okwu a n'ụbọchị iri nke ọnwa Decemba 2019.
Ọ sị na ọ bụ n'afọ 2017 ka e boro Martins na ndị ọzọ ebubo ihe a.
Mmadụ ise ọzọ so kpaa ike a kwenyere na aka ha dị ya oge ha zutere ọkaikpe.
Abụọ n'ime ha bụ Olufalojimi Abegunde dị afọ 33 na Javier Ramos-Alonso dị afọ 30, nọ na mkpọrọ maka ihe a ka e kpechara ha ikpe.
6. Onyekachi Emmanuel Opara
Opara bụ otu onye ụlọọrụ FBI si na mba Saụt Afrịka bụ ebe a nwụchiri ya n'afọ 2016, kpọga ya mba Amerịka ebe a na-ekpe ya ikpe.
A nwụchiri Opara maka ibanye n'ụzọ mgbasaozi 'email' ndị mmadụ ma siri ebe ahụ ghọgbuo ndị ha na ha na-akpa maka achụmntaego bụ nke a kpọrọ "Business Email Compromise" na Bekee.
Opara dị afọ 29 n'afọ 2018, nwereike ịnọ ihe ruru afọ 20 na nga.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










