Burundi President: E liela Pierre Nkurunziza bụbu onyeisiala mba Burundi

Pierre Nkurunziza

Taa bụ Fraide ka e liri Pierre Nkurunziza bụbu onyeisiala mba Burundi n'obodo Gitega.

Nkurunziza chịrị mba Burundi afọ iri na ise tupu ọ nwụọ site n'ọrịa 'mgbachi obi' izuụka abụọ gara aga, dịka gọọmenti mba ahụ siri kwuo.

A na-ebo Nkurunziza ebubo ọchịchị nchigbu mana ọrụụ ọrụ pụụ iche n'ahụike dịka o hiwere atụmatụ ụmụnwaanyị dị ime na ụmụaka erubeghị afọ ise ịnata nleta n'ụlọọgwụ n'efu.

Mana ọ gbara ọnyụpa n'ọgụ megide coronavirus dịka ọchịchị ya ejighị obi dimkpa lụọ ọgụ ahụ.

Burundi ewepụtela ụbọchị asaa iji ru uju maka onyeisiala ha

Pierre Nkurunziza

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Burundi, Pierre Nkurunziza

Mba Burundi ewepụtala ụbọchị asaa iji ruo uju maka onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza.

Mana ndị ọchịchị obodo ahụ na-ekwusi ike na ọbụghị ọrịa coronavirus gburu ya, ma dọkwaa aka na ntị ka ndị mmadụ zeere asịrị dị otu a.

Nke ka njọ ugbua bụ na ọnwụ Nkurunzịza etinyela Burundi n'ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme.

Nwunye ya bụ Denise Nkurunziza butere ọrịa coronavirus. Akụkọ na-ekwu na ọ gara mba Kenya ga nweta ọgwụgwụ ma mechaa lọghachi.

Akụkọ na-ekwukwa na onyeisi ụlọ omeiwu Burundi bụ Pascal Nyabenda na-arịakwa ọrịa Covid-19.

Dịka iwu Burundi sị dị, ọ bụ Nyabenda kwesịrị ịnọchi onyeisiala ma a chọọ ya achọọ.

Evariste Ndayishimiye, bụ onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere na Burundi n'ọnwa gara aga, nwekwara ọrịa coronavirus, dịka akụkọ ụfọdụ si kwuo.

Mana odochaghị BBC anya ma ya bụ akụkọ ọ bụ eziokwu.

Pierre Nkurunziza

Gọọmenti mba Burundi kwupụtara ọnwụ onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza n'ụlọọgwụ dị na Burundi n'ụbọchị Mọnde.

Ha kwuru na Nkurunziza onye gbara afọ 55 gbabiri nwụọ site n'ọrịa njide obi (cardiac arrest) dịka ebugachara ya n'ụlọọgwụ Karusi nke dị nso n'ụlọ ya n'ụbọchị Satọde.

Kepukepu kwuburu na nwunye Nkurunziza buteburu ọrịa coronavirus, akụkọ Nkurunziza ekweghị ka ntị nụ, kama haziri ntuliaka ka ọrịa ntuliaka dịka ọrịa dịka ọ chụpụrụ ndị ọrụ WHO n'ala ha.

Dịka gọọmenti mba ahụ si kwuo, a ga-eme emume ọkwụkwa ya abalị asaa bido taa bụ Tuzde.

Nkurunziza bidoro ịchị Burundi kemgbe afọ 2005 na-achọbu inyefe ọchịchị n'aka onye meriri na ntuliaka e mere bụ Evariste NDayishimiye n'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2020.

Ihe iri i kwesiri ị ma maka Nkurunziza

Pierre Nkrunziza

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Onyeisiala Burundi bụ Pierre Nkurunziza eferela ụwa a aka ka ọ dị afọ 55
  • Ọ bụ onye ndu agha nnupuisi tupu ọ banye ọkwa onyeisiala.
  • Tupu mba ahụ lụọ agha, Nkurunzịza bụbụ onye nkuzi dịka ọ kuziri na mahadum 'University of Burundi.'
  • Nkurunzịza,onye gụrụ maka nkuzi egwuregwu na mahadum chịkọtaburu otu egwu bọọlu ndị agha mba ahụ a kpọrọ 'Muzinga', nakwa 'Union Sporting'.
  • Nkurunziza nwere otu egwu bọọlụ nke ya ọ kpọrọ 'Halleluia FC'.
  • Ọ bụ onye ụfọdụ ma dịka onye maka ọchịchị aka ike dịka ọ jụrụ iritu n'ọkwa ọchịchị ọ banyere afọ iri na ise(15) gara aga.
Pierre Nkurunziza

6. Ngagharịiwe so mbọ ọ gbara iji banye ọchịchị agba nke atọ ya n'afọ 2015 tara isi puku kwuru puku ndị mba Burundi.

7. Ọtụtụ gụnyere 'Human Rights Watch' katọrọ ya maka mmegide ikike dịrị onye dịka inwụchi ndị mmadụ aghara aghara, ogbugbu ndị mmadụ na-agbasoghi iwu,iti ihe na mkpagbu ndị ọzọ.

8. Ọ tụrụ ụfọdụ ndị ntaakụkọ mkpọrọ.

9. Nkurunziza, 'onye chegharịrị e chegharị' lụrụ nwaanyị aha ya bụ Denise, onye ya na ya ji ụmụ ise.

10. Ọ gara erite nnukwu ụlọ na ego dị ijeri dọla $540,000 oge gara aritu n'ọnwa Ọgọstụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-a masị gị: