A tụnyela Philomina Chieshe sị na agwọ loro nde naira 35 Jamb ụlọmkpọrọ

Akụkọ dị mkpa taa:

A tunyela nwaanyị sị na agwọ lolo nde 3.5 Jamb ụlọmkpọrọ

Philomena Chieshe

Ebe foto si, EFCC

Ụlọikpe n'Abuja atụnyela Philomina Chieshe, nwaanyị kwuru na agwọ loro nde naira Iri atọ na ise ego Jamb etinyere ya n'aka na mmadụ ise ndị ọzọ n'ụlọmkporo ganyere mgbe ikpe ahụ ga-ebi.

Chieshe sị na agwọ loro nde naira iri atọ na ise ga-azara ọnụ ya n'ihu ọkaikpe.

EFCC na agwo e boro ebubo na o loro ego

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị EFCC na-eme nyocha banyere mpụ dị na Jamb

EFCC kpụpụrụ Philomina Chieshe ụlọikpe ka ọ ga kwuo etu ya na mmadụ ise ọzọ na agwọ jiri mee ego ha retara ngalaba na-ahụ maka ule mahadum bụ Jamb.

Biafra Remembrance : Ndị e chere bụ Ndị Ipob tiri Fada ihe

Fada Ezenweke

Ndị e chere na ha bụ ndị Ipob kpuru otu ụkachukwu Katolik a kpọrọ Fada Festus Ezeamaka bụ ụkọchukwu na-edu ụka katọlịk nke Saint Jude dị na Nnewi isi aba okpu ụbọchị Tozde.

Fada gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị ntoroọbịa na-amanye ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị Mee 30 nke 2019 wakporo ya ka ọ na-aga ịka 'Mass' ụtụtụ ụbọchị ihe mere.

"Ha jụrụ ma m che na ha na-egwu egwu mgbe ha si ka ndị mmadụ apụtaghị."

A 'gbabuọla' onye ruburu Kagame ọrụ

Camir Nkuruziza

Ebe foto si, @RNCWorldWide

Ndị na anọghị n'ọchịchị na mba Rwanda na-ekwu na agbauola Camir Nkurunziza bụ onye ruburu Onyeisial mba ahụ bụ Kagame ọrụ maburukwa onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye na mba Saut Africa ebe ọ gbagara ọsọ ndụ mana ndị uweojii Saut-Africa kwuru na ha ka na-enyo ebubo ahụ.

______________________________________________________________________________

Liverpool VS Tottenham: Ronaldo aghọla onye amụma?

Ronaldo Da Lima

Ebe foto si, Getty Images

Ronaldo Da Lima gbaburu Brazil bọọlụ ebuola amụma na Liverpool ga-emeri Tottenham n' asompi ha-ga-agba ụbọchị Saturday.

Gee akụkọ ndị a nebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Akpụrụakpụ Akachi
Nkọwa foto, Akpụrụakpụ Akachi ka ọ dị taa bụ Wenezde

Aka m adịghị n'ikutu Akachi - Ihedioha

Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Emeka Ihedioha agọọla na aka ya adịghị na nkụrịkpọ emere na akpụrakpụ Akachi dị n'Owere.

Agbanyeghi na a na-arụ aka na-ebe gọọmentị ya, Ihedioha kwuru na ndị Imo ahụghị ha bụ akpụrakpụ n'anya ma ga n'ihu katọ ya bụ akpụrakpụ.

Ndị amabeghị onye ha bụ gara ikutu Akpụrakpụ ahụ ụnyaahụ.

The casket containing the remains of former Congolese Prime Minister and opposition leader Etienne Tshisekedi

Ebe foto si, AFP

N'Ofesi

Mba Congo anabatala ozu Etienne Tshisekedi ka omechara afọ abụọ ọ nwụrụ.

Tshisekedi bụbụ onyeisi party na-anọghị na gọọmentị nwụrụ na mba Belgium mana gọọmentị Laurent Kabila machiri ịbụlata ozu ya.

Nwa ya Felix Tshisekedi, bụzị aka na-achị Congo ugbua

Ademola Olajire

Ebe foto si, NFF

Nkọwa foto, Ndị egwu Flying Eagle gbara ọnyụba n'asompi ha na mba Ukraine

N'Egwuregwu,

Flying Eagles nke Naịjirịa agafela agba nke abụọ n'asọmpị akpọrọ Fifa Under 20 World Cup na Bekee.

Flying Eagles ritere erere ịgafe mgbe ha na Ukraine ọkpụ ọkpụ sị onwe ya onye laba onye laba mgbe ha zutere ụnyaahụ.

Gee nkeji a n'uju ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile