Tekinụzụ '5G network' a na-abịa ọ ga-agbanwe ndụ gị?

Teknụzụ ekwentị 5G network

Dịka mmadụ na-eto n'ogodo na ndụ, etu a ka tekinụzụ banyere ekwentị a kpọrọ 'Network' sị eto nke ya sịte n'ọgbọ ruo n'ọgbọ.

E nwere ọgbọ ndị gụnyere nke mbụ (1G), abụọ (2G), atọ (3G), anọ (4G) na nke kachasị ọhụrụ nakwa ka a adị elu bụ nke ise (5G).

Tekinụzụ '1G network' ruo na '4G network' nọ bu na Naịjirịa mana ugbua onyeisiala Buhari etinyeaka n'akwụkwọ ịnabata '5G network' na Naịjirịa.

Ngwa gee ntị ka anyị kọọrọ gị ihe bụ tekinụzụ '5G network' na etu o si arụ ọrụ.

Gịnị bụ '5G network'?

Teknụzụ ekwentị 5G network

Ebe foto si, Getty Images

  • 5G nke pụtara 5th 'Generation' na Bekee bụ ọgbọ nke ise n'ogogo tekinụzụ 'network' ekwentị . E nwereike ịkpọ ya '5G New Radio'.
  • Tekinụzụ 5G anaghị ejikọ naanị ndị mmadụ n'ekwentị kama ọ na-ejikọ ọtụtụ igwe tekinụzụ dị iche iche nke na-enyeaka iwulite nrụpụta.
  • Ọ na-eme ka ụzọ nzirita ozi n'ekwentị gụnyere ederede (text), foto (image), ihe onyonyo (video) bụrụ 'saaraa' na-enweghi nsogbu ọbụla.
  • 5G network na-eme ka nzirita ozi n'ekwentị gbaa ọsọ dị egwu (2Gbit/s) nke bụ na tupu i mechie anya mepee, ozi e ziri eruola eluigwe.
  • Ndị ọkanmụta sị na 5G network ga-amụta ego ruru ijeri dọla 3.5 na ohere ọrụ ruru nde 22 n'afọ 2035.

Ọgbọ teknụzụ ekwentị ndị ọzọ e nwere gụnyere;

Ọgbọ nke mbụ (1G) - Ọ na-anabata naanị iji okwu ọnụ (voice) ezirita ozi n'ekwentị.

Ọgbọ nke abụọ (2G) - Na-abata okwu ọnụ na edemede (voice and text).

Ọgbọ nke atọ (3G) - Na-anabata okwu ọnụ, edemede, foto, onyonyo (mobile data).

Ọgbọ nke anọ (4G) - Na-anabata okwu ọnụ, edemede, foto, onyonyo dgz (mobile internet).

Aha onyonyo, I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch??