Biafra Restoration: Anyị enwetala ya 90 pasenti - Uche Mefor

Olu Ụkọchukwu Peace

Osote onyendu 'Indigenous People of Biafra' bụ Uche Mefor ekwuola ihe anọ a ga-eme iji weghachite Biafra ugbua.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụfọdụ ndị okenye Biafra nwere ọhụrụ a gbasara etu a ga-esi weghachite Biafra n'ụzọ tọrọ atọ.

Ọ na-arịọ ka ndị niile kwenyere na Biafra gbadosie anya ike sonye Nnamdi Kanu n'ọchịchọ Biafra.

Mefor kwuru na "Ọchịchọ Biafra abụghị naanị ihe anya n'ahụ kama ọ bụkwa ihe ime mmụọ."

Okwu gbasara Biafra

Ebe foto si, Uche Mefor Facebook Page

Nkọwa foto, Mefor kwuru na Biafra bụ ihe mmụọ

"Anyị eruola pasenti iri itoolu na nchọta Biafra mana pasenti iri fọrọnụ rara ahụ makana ọ bụ ọrụ anyị kwesiri irụ iji nwete ihe anyị na-achọ."

"Iwu mba ụwa dowagara anya na anyị kwesiri iso n'ọchịchọ Biafra."

"Ọtụtụ mmadụ eriela ego iji wee kwụsị nchọta Biafra."

"Ndị otu Indigenous Peoples of Biafra kwesiri ịmata na Biafra dịbụ adị mana ihe anyị na-eme bụ ịweghachite ya."

"N'okpuru ọchịchị Nnamdi Kanu anyị ga-enwe mmeri."

Ihe nchọta Biafra ga-ewe

Mefor kwuru na Biafra nwere ndi mmadụ kwenyere na ya ma nwee oke ala ha.

N'okwu ya, ọ bụrụ na anyị ga-achọta Biafra, anyị kwesiri inyocha ka anyị chọpụta ndị niile bụ ndị Biafra mana Naịjirịa ekweghị ka nke a mee.

Anyị kwesiri inwee ọchịchị nke Biafra ga-enye ndị nke anyị ohere ikwu uche ha ma mekwa uche ha, ma nwere oke ala ha.

Anyị ga-ahụrịrị na ndị ọchịchị nọ na Biafra ga-emeriri uche ndị ha na-achị, ọ bụ etu a ka ndị mba ofesi ga-eji kwanyere anyị ugwu.

Anyị kwesiri inwe ọchịchị na Biafra ga-eme ka anyị na ndị mba ofesi nwe mmekọrịta.

Uche kwuru na o kwetere na Mazi Nnamdi Kanu na-agbali nnukwu dịka onyeisi Ipob n'ọchịchọ Biafra mana ọ dịmma ka gakwuo n'ihu mee ya bụ ihe ka ọ kwudosie ike.

Ihe ndị Okenye kọwara maka etu Ipob si achọ Biafra

Ndị okenye abụọ gụnyere Obidi Obienu na Victor Emeka Okeadu tinyere ọnụ n'okwu kwuru na Ipob na ndị isi na-arụpụta ntụziaka a ga-eji nwete Biafra ma na-ekwu na oge zuo ha ga-ewepụta ya.

Okeadu bụ odeakwụkwo otu Ipob kwuru na ha anaghị achọ ikepụta obodo ọzọ kama ọ bụ iweghachite obodo dịbụ adị furu efu.

O kwuru na ndị mba ofesi ma oke diri Biafra maka ndị na-ajụ maka eserese gbasara obodo a.

Okeadu kwuru na iweghachite Biafra dị n'aka ndị mmadụ, ha kwete, a gawa n'ihu.

Gọọmentị Naịjirịa na-akatọ IPOB

Cheta na gọọmentị Naịjirịa ekwupụtala IPOB dịka otu ezighi ezi n'iwu.

Onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu ka bụkwa onye a na-achọ achọ na Naịjirịa.

Gọọmentị boro ya ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ichutu onyeisiala.

Ya bụ ikpe ka nọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: