Ibrahim Magu: Orji Kalu, na gọvanọ atọ si aka ya gaa nga

Ebe foto si, Other
Oge Ibrahim Magụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) dịka ihe gaferela ka onyeisiala Muhammadu Buhari sị ka were ọsọ ọsọ laa ezumike nwa mgbe nta iji nye ohere ka e mee ya nnyocha ọfụma.
Mohammed Umar arịala dịka onye nnọchite anya Magu.
Nke a na-eme dịka a na-enyocha Magu maka ebubo nnupu isi na izuaghari akụnaụba a natara ndị mmadụ ikpe nrụrụaka mara.
Ọ bụ n'ụbọchị Monde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Juun ka Magu zara oku nnyocha Kọmiti onyeisiala hibere kpọrọ ya. Kemgbe ahụ ọ nọ n'aka ndụ ọrụ nchekwa.
Okwu Magu dara ka dinta a na-achụ nta ya makana kemgbe onyeisiala Buhari were ya n'ọrụ dịka onyeisi EFCC n'afọ 2015 ọ bụ ya na-ahazi agha gọọmenti na-ebuso mpụ na nrụrụaka.
N'ihu ọrụ a, ọ kpọchịrị ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọkwa gbalitere ma tụọ ụfọdụ n'ime ha nga dịka ụlọikpe mara ha ikpe ohi ego ọha.
Lee ụfọdụ ndị a gara nga site n'aka Magu:
Uzor Kalu

Ebe foto si, @OrjiUzorKalu01/Facebook
Orji Kalu gara nga ka ikpe mara ya banyere ebubo ohi ijere naịra 7.65 nke metụtakwara onye bu Kọmịshọna na-ahu maka ego oge ọ na-achị Abia steeti.
N'ụbọchị ise nke ọnwa Decemba 2019 ka Ọkaikpe Mohammed Idris tụrụ Kalu nga afọ 12, mana Ụlọikpe Ukwu mechara tọghapụ ya.
Kalu akpụpụla EFCC ụlọikpe ugbua maka okwu ahụ.
Bala Ngilari
Bala Ngilari bụbu aka na-achị Adamawa steeti. A tụrụ ya nga afọ ise maka ebubo nrụrụaka oge ọ na-achị dịka gọvanọ.
EFCC boro ya na mmadụ abụọ ọzọ ebubo na ya nyere ndị mmadụ ohere ịrụ ọrụ ruru nde dọla 167 n'ụzọ na-ezighi ezi.
Otu ụlọikpe dị na Yola mara gọvanọ ahụ ikpe ma tụọ ya nga afọ ise mana ụlọikpe mkpegharị kagburu mkpebi ahụ ma sịkwa na ebubo ahu enweghi isi na ọdụ.
Jolly Nyame

Ebe foto si, FACEBOOK
A tụrụ Jolly Nyame nga afọ 14 ka ikpe nrụrụaka banyere ego ọha mara ya.
Ngalaba EFCC si na Nyame zuru ego ọha site n'afọ 1999 rue 2007 bụ oge ọ na-achị dịka gọvanọ.
Ọkaikpe Adebukola Banjoko sị na EFCC, n'oge nke Magu, nwere akaebe kwụ ọtọ na Nyame mefuru ego ruru ijere dọla 1.6.
Ụlọikpe Mkpesa na nke Ukwu sị na ikpe mbụ e kpere Nyame kwụ ọtọ. Nyame nọ na mkpọrọ ugbua n'ihi mkpebi ahụ.
Joshua Dariye

Ebe foto si, EFCC
N'afọ 2007, EFCC boro Joshua Dariye, bụbụ aka na-achị Platu steeti ebubo na aka ya dị na nrụrụaka banyere izu nde naịra 121 n'akpa ego steeti ahụ.
EFCC sị na ọ bụ site n'aka ụlọọrụ a kpọrọ 'Ebenezer Reitner Ventures' ka a kpara ike ahụ.
Ha sịkwa na aha ụlọọrụ a adịghị n'akwụkwọ gọọmentị.
Ka afọ iri gachara, Ọkaikpe Banjoko tụrụ ya nga afọ 16.
Ụlọikpe Ukwu mechara wetuo afọ ole ọ ga-anọ site 16 ruo afọ iri.
Ọ ka fọrọ Dariye afọ anọ ịnọcha na nga.












