Magu o kotere akpa ebu ga-agbakasị EFCC ahụ?

Ibrahim Magu

Ebe foto si, EFCC

Ide okwu banyere ọchịchị Ibrahim Magu - bụ onye na-arụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka a kpọrọ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) na Bekee - ka na-ede dịka a na-atule onye ga-anọchite anya ya.

Dịka ọ kwụ ugbua, Magu ka nọ n'aka ndị uweojii dịka akụkọ na-ekwu na a gaala be ya ime nnyocha banyere ebubo na ọ rụghị ọrụ ya etu o kwesịrị.

Mana ebe okwu a na-aga karịsịa bụ etu ihe a Magu na-agabiga ga-esi metụta agha gọọmentị Muhammadu Buhari na-ebuso mpụ na nrụrụaka.

Nicholas Ibekwe bu onye ntaakụkọ e ji ime nnyochapụta ihe zoro ezo mara, gwara BBC na azịza ọhụrụ na-azacha ụlọ karịa nke ochie, nke pụtara na onye ọhụrụ ga-anọchi anya Magu ga-eji usoro ọhụrụ bata.

Ibekwe kwuru sị: "Onye ahụ ga-esi n'etu Magu jiri rụọ ọrụ mụta usoro ọ ga-esi rụọ ọrụ nke ya."

"Anaghị m asị na ikpe mara Magu, mana ọ ga-abụrịrị na o nwere ebe o si zọghie ụkwụ."

"Onye ọhụrụ ga-ama etu o ga-esi ghara ime ụdịrị ihe ahụ"

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ihe ọzọ bụ na o nwere ụfọdụ mkpesa ndị mmadụ kpesaara EFCC ha ebughi gaa n'ihu, nke mere ka ụfọdụ na-eche na ọrụ ha bụ ibuso ndị ekwenyeghị na gọọmentị agha.

"E nwere mkpesa banyere ụgbọala ego bara be Sinetọ Ahmed Tinubu tupu e mee ntuliaka nke afọ 2019."

"E nwere nke e kpesara banyere etu Babatunde Fashola siri chịa steeti Legọs ka nọ na ngịga."

Ibekwe kwukwara na oge e wetara mkpesa megide Ọkaikpe Ukwu Naijirịa bụ Walter Onnoghen, EFCC buuru ya gaa n'ihu nke mere ka a chụọ ya n'ọrụ.

Maazị Ibekwe che na otu ihe onye nọchiri anya Magu nwereike mee ọsịsọ iji mee ka ezigbote ọganihu dị na EFCC, bụ ịkwụsị ime agha mpụ na nrụrụaka ihe egbe ọnụ a na-agba n'elu akwụkwọ mgbasaozi.

Ọ sị na ọ bụghị na ya nwere olileanya na onye nọchitere anya Magu ga-eme ọfụma, mana ọ na-eche na o ruola oge EFCC agaghịzị abụ ihe e ji ebuso ndị amasịghị gọọmentị agha.

Ibekwe kwuru: "Nke bụ eziokwu bụ na ma oge ndị mmadụ ka na-eto EFCC, n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo, a ma na e ji ha ebuso ndị gọọmentị ahụghị n'anya agha, mana o ruola oge ụdịrị ihe ahụ ga-akwụsị. Ka a hụ EFCC dịka ihe toro etu o kwesịrị."

Ihe a sị na Magu mere?

Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti.

Ebe foto si, Twitter/@MalamiSan

Nkọwa foto, Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti

Ebubo Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami wụkwasara Magu n'isi gụnyere:

  • Anaghị erubere oche Ọkaiwu Ukwu isi
  • Izugharị ego EFCC napụrụ ndị aka ha dị na nrụrụaka ma iresị ndị dị ya mma ụlọ a natara ndị mmadụ
  • Akwanyerighi mkpebi ụlọikpe ugwu banyere ịgbape ọbaego otu onyeisi ụlọakụ nke ijeri naịra asaa dị n'ime ya
  • Igbu oge banyere nnyocha P&ID buteere Naịjirịa nnukwu nsogbu n'ụlọikpe
  • Ị na-enye ụfọdụ ndị ọrụ ya a na-akpọ "Magu Boys" ohere ọrụ ọpụrụiche ụfọdụ
  • Ịgbara ndị ntaakụkọ ama banyere ụfọdụ nnyocha dị mkpa
  • Mgbakọ ego ọ natarala EFCC ezughi ezu
  • Ime mkpesa banyere ụfọdụ ọkaikpe tupu Ọkaiwu Ukwu etinye ọnụ na ya bụ okwu
  • Ikwu na ọ bụ Ijeri naịra 539 ka a natara n'agbanyeghi na o kwuburu na ọ bụ ijeri naịra 504
  • Eweteghi ezigbote akaebe a ga-eji kpọlata mmadụ dịka Diezani Alison-Madueke na Naịjirịa maka ikpe ya ikpe nrụrụaka.