Ibrahim Magu: A tọhapụla Ibrahim Magu bụ onye e ji eji kemgbe abalị iri

Ibrahim Magu

Ebe foto si, EFCC/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ na-eru anyi ntị ugbua bụ na Ibrahim Magu bụbu onye nnọchite anya ndị isi EFCC e nwerele onwe ya na n'aka ndị uweojii ngalaba nke onyeisiala na mgbede Wenezde.

Cheta a nwuchiri Magu n'ụzọ n'ụbọchị isii nke ọnwa Julaị maka ebubo nruruaka ha sị na o metere mgbe ọ nọ n'ọrụ.

Ọ bụ Abubakar Malami bụ Minista ikpe nkwumọtọ na Naịjirịa boro ya ya bụ ebubo.

Chetakwa na n'akwụkwọ ha degaara okaiwu Ibrahim Magu ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julaị, onyennọchite anya onyeisi ndị uweojii bụ onye tinyereaka na ya bụ akwụkwọ bụ Idowu Owohynwa zara okaiwu Magu na ọbụghị ha ji Ibrahim Magu.

Na ya bụ akwụkwọ akara ya bụ 7000/IGP.SEC/ABJ/VOL.489/171 onyeisi ndị uweojii sị ọ bụ ndị ngalaba ndị uweojii nke onyeisiala bụ ndị na-enyocha Magu, nke pụtara na ọ nọghị n'aka ha.

Okaikpe Magu bụ Tosin Ojaomo Esq. degeere ndị uweojii akwụkwọ ka ha tọhapụ Ibrahim Magu bụ onye e ji eji kemgbe Mọnde, ụbọchị isii nke ọnwa Julaị.

Onyeisi ndị uweojii gwara okeikpe Magu ka ha chọrọ ya gawa n'ụlọọrụ onyeisiala.

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ewepụla onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu n'ọkwa.

Otu onye na-arụ ọrụ n'obi gọọmentị bụ Aso Rock gwara BBC nke a.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Monde ka akụkọ wuru ewu na ndị uweojii pụrụiche bụ DSS nwụchiri ya n'Abuja.

Ndị DSS mechara zipute ozi kwuru na akụkọ nwụchi ya abụghị eziokwu.

N'otu aka ahụ, ụlọọrụ nke ọ na-eleta anya wepụtakwara ozi nke ha kwuru na o ji aka ya ga zara oku a kpọrọ ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu gwakwara BBC na o nweghi ihe ha ma maka nwụchi Magu ụnyaahụ bụ Monde.

Ihe anyị ma maka Ibrahim Magu?

Saraki

Ebe foto si, Facebook

Nkọwa foto, Oge ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu, Bukola Saraki na ndị otu ya jụrụ ịkwado Magu ka ọ bụrụ onyeisi EFCC mana Buhari kpọrọ ekwe nkụ họrọ ya

Cheta na Magu ka bụ onyeisi nchere oge na EFCC nke Bekee kpọrọ 'acting chairman'.

Ugboro abụọ onyeisiala Buhari wegara aha ya na nke ndị omeiwu ukwu, n'afọ 2018 ha jụrụ ịkwado ka Magu bụrụ onyeisi EFCC.

N'oge ahụ, ndị uweojii nzuzo bụ DSS dere akwụkwọ na-akatọ Magu, ma kwuo na ya na ndị aka ha adịghị ọcha na-emekọ ihe.

Ndị DSS kwuru na Magu na-emekasi ego etu o si masị ya ma kwukwaa na ọ bụ mmadụ kwụọrọ ya ụgwọụlọ ebe o bi n'Abuja.

Dịka ha si kwuo oge ahụ, ụgwọụlọ ahụ bụ nde naịra iri anọ (N40 million).

Magu gọrọ aka ya na ụkwụ ya n'ebubo ndị ahụ, mana ndị Sineti - nke Bukola Saraki nọ n'isi ya n'oge ahụ - jụrụ ịkwado ya.

Mana Buhari jụwara isi ma hapụ Magu ka ọ nọrọ dịka onyeisioche nchereoge.

Ebubo ọhụrụ

Abubakar Malami
Nkọwa foto, Ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami na Magu enweela nghọtahie ugboro ugboro

Ọ bụ ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami boro Magu ebubo nke a mere e ji chutuo ya n'ọkwa.

Malami kwuru na aka Magu adịghị ọcha, na ọ na-ezuru ego a natara ndị zuru ego Naịjirịa.

Malami kwukwara na Magu anaghị erubere ya isi dịka onye ka ya n'ọkwa na gọọmentị.

Nke a mere ka e hibe kọmiti ga-eleba ebubo ndị ahụ anya.

Ọ bụ kọmiti ahụ nyere iwu ka e jichie Magu n'ụbọchị Monde.

Akụkọ kwuru na ọ rahụrụ n'ogige ndị uweojii.