Health tips: Lee ihe maamịrị gị na-agwa gị maka ahụike gị

Onya na-anwụ mammịrị

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke & Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Ịhe ịgbachị maamịrị nwereike ibutere gị.

Amịrị maọbụ maamịrị bụ mmiri a na-anyụpụta n'ahụ mmadụ na-ebu ihe ụfọdụ ahụ mmadụ achọghịzị.

Maamịrị nkịtị nwere mmiri, urea, nnu, nakwa ihe nyere ya agwa ọ tụrụ Bekee kpọrọ "pigments".

Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ịnọ na maamịrị bụ nke Bekee kpọrọ kolrin, potashium, nnu, sayensi kpọrọ sodium, kritinine (creatinine) ayọn (iron) nakwa ihe ndị ọzọ.

Mmiri dị na maamịrị dị pasent iri itoolu na ise (95%).

Ihe ndị ọzọ niile a bụzị pasentị ise (5%).

Maamịrị nwekwara ihe Bekee kpọrọ 'Urea' nke nwere 'amonia' nke enweghị ike ịmerụ mmadụ ahụ, ya na 'kabọn dayọxaịd".

Mgbe ụfọdụ, ọbara nwekwaraike ịdị n'amịrị bụ nke Bekee kpọrọ "proteinuria". Ndị a gosikwara ọrịa imeahụ.

Ihe ise eji mara amiri bụ agwa ọ tụrụ (ya bụ ụcha ya), isi, ọrụrọ ya, pH ya (asid maọbụ akalaịn dị ya) nakwa arọ ọ dị mgbe iji mmiri tụnyere ya.

Christopher Ọzoanị Ugwu bụ dọkịnta Bekee na-ahụ maka nje n'ụlọọgwụ na Parklane Enugu sị na ịkpachị maamịrị adịghị mma.

Ọ sị na "o nwereike imebetere akịrị (kidney) mmadụ ọgbatauhie".

Ọ sị na ọ dị mkpa na onye ọbụla maamịrị kpawara gara nyụọ ya ozugbo maka ịkpachị ya nwereike imeru onye ahụ ahụ.

Gịnị ka ịkpachị maamịrị nwereike ibutere mmadụ?

Iko mmamịrị

Dọkịnta Chris Ozoani Ugwu sị na ịkpachị amịrị nwereike ibutere mmadụ ahụụfụ na ọrịa mbute.

Ndị ọkachamara na Healthline sị na ịkpachị amịrị otu mgbe maọbụ ugboro ole maọbụ ole agaghị eme mmadụ ihe ọbụla ka na ọ nwereike ịme ihe ma ọnye ahụ merezia ya gawa n'ihu.

Ha kwuru na "ịkpachi amịrị ihe dịka awa isii mmadụ na-eme njem nwereike ọgaghị eme ya ihe ozigbo, mana ọbụrụ na onye ahụ kparazịa ya gawa mpiti nwereike ịkwe onye ahụ n'ime ahụ".

Lee ihe ụfọdụ ha sị na ịkpachi maamịrị nwereike ime mmadu:

•Onye kpachịrị amịrị ogologo oge nwereike ịbute ọrịa mbute Bekee kpọrọ "urinary tract infection (UTI)".

•Ọ bụrụ na ị na-akpachị amịrị gị na-enweghị nkwanye ugwu, akpaamịrị gị na akwara ndị ji ya nwereike ịda mba nke bụ na amịrị nwereike ị na-aba onye ahụ kwa mgbe kwa mgbe.

•Ọ bụrụ na-ịkpachie amịrị karịa awa iri, akpa amịrị onye ahụ nwekawaraike ịkpọchi nke bụ na ọgaghịzị adị nfe onye ahụ ịnyụ amịrị mgbe ọ chọrọ.

•Ịkpachị amịrị nwekwaraike ime ka akpaamịrị mmadụ gbawa, mana nke a na-ahịa ahụ.

Ịkpach maamịrị o nwereike igbu mmadụ?

Ndị ọkachamara ọrụ ahụike sị na nke a enweghị ike ime, kama ọbụrụ na onye ahụ kpakarịa amịrị, akpaamịrị ya nwereike ịgbawa.

Nke ahụ nwereike ibutere onye ahụ ọnwụ.

Kedụ ihe ga-eji mata maamịrị?

Eserese ị ga-esi mara ma maamịrị gị ọ dị mma
Nkọwa foto, Eserese maamịrị

Agwa (ụcha maamịrị)

  • Maamịrị na-achakarị edo edo mana ọ na-atụkarị agwa ihe onye ahụ riri n'ikpeazụ.
  • Ịṅụ oke mmiri na-agbarị ọrụrọ amịrị, na-emekwa ka ọ dị nfe.
  • Amịrị gbajiri agbaji gosiri na mmiri kọrọ onye ahụ n'ahụ.
  • Amịrị na-acha ọbara ọbara na-egosi na ọbara dị n'amịrị onye ahụ nke gosiri na akpaakụrụ (kidney) onye ahụ nwere nsogbu.
  • Dọkịnta Chris Ọzọ Ugwu sị na onye ọbụla amịrị ya na-acha ọbara ọbara kwesiri ị ga nyọcha n'ụlọọgwụ.

Ka maamịrị sị adị

  • Maamịrị gị na-acha miri mmiri
Ịnwụ mammịrị

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe maamịrị gị na-acha mmiri miri ihe o gosiri bụ na ị na-aṅụ oke mmiri karịa ka ị kwesiri.

Ụfọdụ ihe na-ewụ bụ ka ndị mmadụ na-aṅụ mmịrị mgbe dum, mana nke a egosila na mmiri nwereike ịkarị n'ahụ mmadụ, dịka ndị ọkachamara si kwuo.

Ha sị na oke mmiri nwereike igbari "electrolytes" dị na ahụ mmadụ.

"Electrolytes" bụ mịnaralụ dịka "sodium", "potashiụm", "klorin" na "bikanoneti" bụ ihe na-eme ka akwara nakwa mọzụl mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma ma na-enyekwaaka na ịhụ na asịdi na bezi dị n'ahụ onye ahụ ha.

Mana onye amịrị ya na-acha otu a, akụjala maka na mmekwa ya bụ ịwelata aka na mmiri onye ahụ na-anụ.

  • Edo edo (Yellow)

Mgbe ụfọdụ amịrị mmadụ na-acha nwaobere odo odo.

Mmụta sị na ọ bụ otu a ka amịrị onye ahụ dị kwesiri ị na-acha.

Odo ahụ ga na apụ ma onye ahụ na-aṅụ mmịrị mgbe ọbụla.

Ihe na-ebute agwa a n'amịrị bụ mgbe ahụ mmadụ 'hemoglobin' bụ protin na-ebụ ikukundụ Bekee kpọrọ 'oxygen' dị n'ime ọbara.

Ụcha maamịrị gị gosiri ka ya bụ protin a si gbaridewe.

Mana ịnụkwa mkpụrụ ọgwụ vitamin B na-achakwa amịrị mmadụ odo odo.

  • Ọbara ọbara maọbụ uhie uhie (red or pink)

Maamịrị gị nwereike ịcha uhie uhie ma ọ bụrụ na i riri ihe na-acha otu ahụ.

E nwere ọtụtụ mkpụrụ osisi na-acha uhie uhie dịka 'blueberries', na ndị otu ya.

E nwekwara ọrịa na-eme ka amịrị mmadụ na-acha uhie uhie dịka mgbe 'prostate' onye ahụ zara aza, mgbe onye ahụ nwere akị n'akụrụ Bekee kpọrọ Kidney stone maọbụ mgbe onye ahụ nwere akpụ n'ime akpa akịrị maọbụ akpaamịrị.

Ịhụ ụdị ihe ahụ n'amịrị gị were ọsọ were iji ga hụ ndị ọrụ ahụike gị.

  • Oroma oroma (orange)

Mgbe amịrị gị na-acha oroma oroma, o nwereike ịbụ maka ụkọ mmiri n'ahụ gị. Mgbe ụfọdụ ọ na-acha ka nsị agbarịnyere na ya.

Nke ahụ nwereike ịbu maka na onunuilu gị bara n'ime ọbara nke gosiri na imeju onye ahụ maọbụ akpa onunuilu ya nwere nsogbu.

Onye nwekawara ọrịa imeju Bekee kpọrọ jaundice ga-anyụkwa amịrị na-acha oroma oroma.

  • Anụnụ anụnụ (Blue)

Amịrị mmadụ ịcha anụnụ anụnụ gosiri na onye ahụ riri ihe na-acha otu ahụ maọbụ na ihe iji eji mee onye ahụ ule na akụrụ ya maọbụ n'akpa amịrị gosiri na amịrị ya.

N'ezie a ọ nwekwara nje Bekee kpọrọ pseudomonas aeruginosa na-eme ka amịrị mmadụ chaa anụnụ, mana ọtụtụ mgbe o na-esite n'ihe mmadụ riri.

  • Ụrọ ụrọ (dark brown)

Ọtụtụ mgbe amịrị mmadụ chawa ụrọ ụrọ nke ahụ gosiri na mmiri kọrọ onye ahụ n'ahụ.

Mgbe ụfọdụ ọ na-egosikwa onye ṅụrụ ọgwụ dịka Flagyl maọbụ chloroquine.

Nrị dị iche iche nwekwara ike igosi n'amịrị mmadụ.

Ọ na-egosikwa onye nwere ọrịa imeju maọbụ oninuilu.

  • Maamịrị kochiri ekochi

Maamịrị kochiri ekochi na-egosi onye butere nje.

O nwekwaraike ịbụ mgbaama onye nwere ọrịa akụrụ maọbụ na mmiri adịghị onye ahụ n'ahụ.

Amịrị ọbụla kochiri ekochi na-agbọ ụfụfụ karịa nwekwaraike igosi na onye ahụ nwere ezigbo ọrịa n'ime ahụ. Mgbe ụfọdụ ndị dọkịnta anaghị achọpụta ihe butere ya ngwa ngwa.

Ọ bụrụ na amirị gị atụọ agwa karịa ụbochị abụo maọbụ atọ, gbara gaa hụ dọkịnta gị.

  • Isi maamịrị

Ọzọ Ugwu sịkwa na ụshi amịrị nwekwaraike ịgba ama ọrịa dị mmadụ n'ahụ.

Ọ sị na amịrị onye ọrịa shụga ji nwereike ịna esị ụtọụtọ ka ọnye tara mkpụrụosisi na-esi ụshị ọma maka ihe Bekee kpọrọ ketones dị n'amịrị ahụ.

Mana ọ sịkwa n'ọgwụ ụfọdụ na-esipụtakwa n'amịrị mmadụ.

Ndị ọkachamara ọzọ sị na amịrị anyụrụ ọhụrụ anaghị esị oke isi, mana amịri gbara oge n'esi kpataa.

Ha sịkwa na nrị ụfọdụ nwekwaraike isipụta na amịrị mmadụ dịka galik, kọrị, Salmọn, coffee na ndị ọzọ.

Aha onyonyo, Palm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma
  • pH amịr (akalaịn na asid dị n'amịri)

Cheta na anyi mere maka pH mgbe anyí mere akụkọ maka mmiri akalaịn.

Ndị ọkachamara sị na akalaịn dị na amịrị dị mma kwesiri isite 4.6 ruo 8 pH, ebe 6 bụ etiti ya.

Ihe kacha ebute mgbenwe n'ime ya bụ ụdị nrị mmadụ riri.

Iji maa atụ, nrị nwere protin na-ebutekarị amịri asidi, ebe akwụkwọ nri na-ebutekarị amịrị nwere akalaịn nwereike isi 4.6 ruo 8 pH.

  • Ihu amịrị (turbidity)

Mgbe ụfọdụ, ihu amịrị na adị ka ọnwere anwụrụọkụ n'ime ya.

Mgbe ụfọdụ ọ chapụkwa ka mmiri nkiti.

Ndị ọkachamara sị na amịrị nkịtị kwesiri ịchapụ nke bụ na e kwesiri ihu ike efere anyụnyere ya anya na-enweghị mgbochi ọbụla. Mgbe ụfọdụ okochitụ ekochi dịka ihe anwụrụọkụ dị na ya.

Ọ bụrụ na o kochie nnugwu ka ihe agbarịnyere nzu, mara na ọ nwere ihe dị na ya. Onye ahụ kwesiri ịga nnyocha ịchọpụta ka ọnwere nje maọbụ ogbochi dị n'ụzọ amịrị si apụ.

Ekwesighị ịleghere ụdị ihe a anya maka na ọ nwereike ibụ mgbaama ọrịa dịka ọrịa shụga, maọbụ ọrịa ndị ọzọ dị ọjọọ.

  • Ihe maamịrị gị nwereike igosi maka ahụike g

Ihe ndị a ka nyocha nwereike igosi gị n'amịrị gị dịka nchọputa si gosi.

  • Ọ bụrụ na protin karịa na maamịrị gị ọ na-egosi na ihe na-ayọcha ọbara dị n'ime akụru (kidney) gị Bekee kpọrọ glomeruli gbara ọrụ, ọrịa Bekee kpọrọ proteinuria.
  • Ọ bụrụ na mmadụ na-anyụ ọbere amịrị nke ihe nwereike ibute ya bụ nkụja maọbụ na akụrụ onye ahụ gbara ọrụ nke nwereike ibute ọrịa Bekee kpọrọ Oliguria.
  • Ọrịa shuga nwereike ibutere mmadụ ịnyụ oke amịrị nke Bekee kpọrọ Polyurịa.
  • Nje nwereike ibutere mmadụ oke ụfụ mgbe ọ na-anyụ amịrị. Bekee kpọrọ ọnọdụ a Dysuria.
  • Ọ bụrụ na nje mee ka ọbara dị na amịrị gị, Bekee kpọrọ ọnọdụ a hematuria.
  • Ọ bụrụ na shuga karịa na amịrị gị nke ọrịa shuga bụ diabetes butere, Bekee kpọrọ ọnọdụ a glycosuria.

Dọkịnta Chris Ugwu sị na ọ bụrụ na ịnyụọ amịrị n'abalị hụ ahụhụ na ya n'ụtụtụ, mara na shụga karịrị na ahụ onye ahụ.

Ọtụtụ ihe anyị na-eri nwekwaraike ịme ka amịrị anyị na anyụ pee nta maọbụ buo oke ibu, otu ahụ ka ọ dịkwa ọbara dị anyị n'ahụ. Mmiri na mmanya anyị na aṅụ nwereike ibute oke amịrị ebe kafin (caffeine) nwereike ịbutu ọbara mmadụ nwekwaike bute ọbara mgbalielu.

Mmụta na-akọwa na ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ na-eme ka mmiri ahụ mmadụ na-amịrịr peempe nke na-ebute oke ịnyụ amịrị.

Aha onyonyo, World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ'

Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị maka maamịrị.

Ugboro ole ka ị kwesiri ịnyụ amịrị n'ụbọchị?

Ndị ọkachamara sị na onye ahụ dị mma kwesiri ịnyụ amịrị ihe dịka ugboro isii maọbụ asatọ n'ụbọchị.

Ọ karịa otu a, o nwereike ịbụ na ihe ndị a na-eme onye ahụ:

  • Onye ahụ ṅụrụ oke mmiri
  • Onye ahụ ṅụrụ ihe nwere "caffeine" nnukwu.
  • O nwereike buru na akpa amịrị onye ahụ na-arụ oke ọrụ nke gosiri na onye ahụ buru oke ibu maọbụ na ọna aṅụ ogwụ dị agha.
  • Onye ahụ nwere nje n'akpa amịrị ya.
  • Onye ahụ nwere nsogbu na "prostate" ya.

Maọbụ na ọkpụkpụ ukwu onye ahụ eriela mperi site na ịmụ nwa.

Ọ bụru na ị na-aṅụ mmiri otu o kwesiri ka na anyụ oke ammịrị, gbara gaa hụ dọkịnta gị.

Onye gbagolitegoro n'afọ nwekwara ike ịnyụ amịrị karịa otu okwesiri maka na ihe na-akpagbara ụbụrụ ya ama mgbe ekwesiri ịnyụ amịrị Bekee kpọrọ "antidiuretic" anaghịzị arụ ọrụ nke ọma.

Gịnị mere amịrị ji akpa mmadụ mgbe onye ahụ na-ara otu?

Ndị ọkachamara sị na ụdị ihe a anaghị emekawa ụmụnwoke maka na akpa amịrị nwoke na-emechi mgbe uhe (sperm) onye ahụ chọrọ ipụta.

Mana ahụ nwaanyị, akpa amịrị ya na otu ya nọketere nke bụ na ahụ ya nwereike ịkpalite amịrị mgbe ọ chọrọ "ịbia".

Mgbe ụfọdụ amịrị na-abalahụ ha mgbe ha bịawara.

Ijide amrịrị onwere ihe ọ na-eme n'ahụ?

Ebe dọkịnta Chris Ọzọ Ugwu sị na ịkpachi amịrị nwereike ibutere mmadụ ọgbatauhie, nchọpụta ndị Columbia University mere gosiri na onweghị ihe dị njọ n'ime ya karịa ịba amịrị n'akwa gị.

Gịnị mere amịrị ji abakarị ụmụnwaanyị dị ime maọbụ ndị mụrụ nwa?

Ịmụ nwa nwereike ịme ahụ nwaanyị ka ọ dọtịa n'ụdị ga na-eme ka ọ na-aba amịrị.

Afọime nwekawaraike ịkpado akpa amịrị n'ụdị ga-eme ka amịrị na-apụta mgbe ụfọdụ.

Ọ bụrụ na nwa dị n'afọ buo oke ibu nke a ga-eme ka nwaanyị dị ime na-aba amịrị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Aha onyonyo, World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha