World Toilet Day: Iji mmiri maọbụ iji ihe hịcha otele gị bụ ajụjụ ụwa kpụ n'ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ ka na-atụ ndị mmadụ n'anya etu ọtụtụ bi na mba ofesi si ejikarị tishu ehichaa otule ha karịa ma iji mmiri sachasịa ma ha gacha mposi.
Ụfọdụ, iji mmiri sacha ike marala ahụ na-ajụ kedụ ka ị ga-esi nwere naanị tishu hicha mmetọ nsi yiri nrị ndị bekee akpọrọ chokoleti.
Ọ bụ eziokwu na tishu akpọghị nkụ dịka igwe eji emepụta mposi mana mmiri kacha dị nro n'isachapụ otule ma ị gacha mposi
O teela aka ndị bi mba dị iche iche na-eji mmiri asachasị ike ha ma ha gacha mposi.

Ebe foto si, Getty Images
Mba kachasị eji mmiri asacha otule
UK na US bụ mba kachasị eji tishu ehicha ike dịka Barbara Penner si depụta n'akwụkwọ ya na-egosi etu esi asa ahụ.
Mana mmiri bụ ihe ndị mba ụka alakụba ji asachakarị otule makana okwukwe ha kwadoro ya.
Dịka Zul Othman si chọpụta, ọ bụ ndị ụka alakụba nọ na Australia na-eji karị akwụkwọ mposi ehicha otule.
Mana ọbụghị naanị ndị ụka alakụba na-eji mmiri asacha otule maha gacha mposi.
Kaiser Kuo bụ otiegwu ama ama kwuru na ụjọ biara ya mgbe ọ chọputara akwụkwọ mposi ndị bi n'Amerịka na-adọrọ ehicha ike kwa afọ.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na tishu na-afụchị mposi ọsịsọ.

Ebe foto si, Getty Images
Itukwu nyụọ nsi na ịnọdụ ala nyụọ nsị?
Nke a bụ okwu a ka adọgha n'ụwa kịta.
Mana a na-ekwu na ụzọ abụọ n'ime atọ ndị bi n'ụwa ka na-etukwu anyụ nsi ruo ugbua.
A bịa na-etu ahụ si arụ ọrụ, itukwu ala nyụọ nsi kachasị mma karịa ịnọdụ 'n'oche eze' mposi.
Itukwu nyụọ nsi ga-eme ka ọ pụta siriri werere.












