Iva Valley Massacre: Ihe mere ndị na-egwu coal n'Enugu afọ 70 gara aga

Ebe foto si, Centre for Memories
Abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ọbụla bụ ụbọchị ncheta ogbugbu e gburu ndịọrụ 'coal' n'Enugwu.
Ya bụ ihe mere n'afọ 1949. Afọ a mere ya afọ iri asaa o ji mee.
'Iva Valley Massacre'?

Ebe foto si, Getty Images
N'oge ndị ọcha mba Briten na-achị Naịjirịa, 'Coal' so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego.
Otu n'ime ebe a na-egwupụta coal n'Enugu oge ahụ bụ ebe a kpọrọ 'Iva Mines'.
Na Nọvemba 1, 1949, ndịọrụ gbara abụbụ ọrụ n'ihi ụgwọ ndị ọcha ji ha.
Kama ịkwụ ha ụgwọ ha, ndị ọcha nyere iwu ka e wepu ogbunigwe niile e ji arụ ọrụ ngwupụta coal na 'Iva Valley'.

Ebe foto si, Pulse.ng
Mana ndịọrụ ahụ ekweghị ka e wepụ ihe ndị ahụ.
Ha ma na ndị ọcha ga-emechi ebe ahụ ma ha wepụchaa ogbunigwe ndị ahụ.
Mgbe nke a na-eme, onyeisi ndị uweojii aha ya bụ F.S Philip nyere ndị otu ya iwu ka ha were egbe chụsasịa ndịọrụ ahụ.
Ndịọrụ mmadụ iri abụọ na otu nakwa otu onye na-agara onwe ya nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara.
Ndị nwụrụ n'Ịva Valley

Ebe foto si, Centre for Memories
Aha ndịọrụ e gburu na ọgbaaghara 'Iva Valley' ka dị ruo taa.
Otu a kpọrọ 'Centre for Memories' nke dị n'Enugwu nyere BBC Igbo ụfọdụ aha ndị a.
Ha gunyere: Sunday Anyasodo, Livinus Okechukwuma, William Nwehu, Felix Nnaji, Ogbania Chime na Moses Ikegbu.
Ndị ọzọ bụ Okafor Ageni, Augustine Nwokoma, Onoh Onyia, James Ekeowa, Nwachukwu Ugwu, Ngwu Nwafor, Jonathan Ezeani, dgz.
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ikike dịịrị onye kwenyere na ọnwụ ndịọrụ 'coal' na Iva Valley bụ ihe nlegara anya nye ndị otu ndịọrụ niile.

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











