Menstrual hygiene: Ihe nwoke na nwaanyị kwesiri ịma maka nsọ ụmụnwaanyị

Ụmụnwaanyị na-achị ọchị.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'oge ugbua, nsọ ụmụnwaanyị anaghị egbochi ha ime ihe ọbụla, mana ọ dịghị otu a n'oge gboo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke, ndị na nna na ndị ọrụahụike nwere mkparịta ụka maka nsọ ụmụnwaanyị maka emume ncheta ụbọchị nsọ nwaanyi dịka United Nations si hibe.

Dọkịta Chukwudi Ufondu, Florence Igboayaka, Adaora Okoro, Maazị Chidi na Oriakụ Onyinye Obimdike na Munachi Okereke nọ na ya bụ mkparịtaụka taa.

Florence, Adaora, Onyeinye,Chukwudi,Muna

Ihe ndị bụ ọkpụrụkpụ okwu sọ n'ihe ha kwuru.

  • Ọ bụghị ịmetụ aka na-ebute ime, ọ bụ mmekọrịta.
  • Ibute afọ ime erughị eru na-emebi aha ezinaụlọ
  • Ọ bụrụ na nwa gị ahụghị nsọ ruo afọ 18, gaa hụ dọkịta.
Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

  • O nwere ndị nsọ ha na-aba n'ime karịa Ipụta apụta. Ya ka o ji dị mma ịje hụ dọkịta mgbe ọ dị agha.
  • Onye huru nsọ ya na ahụghị ya n'ọnwa ọzọ abụghị ajọọ ihe.
  • O kwesighị ka nwaanyị hụ nsọ ugboro abụọ n'ọnwa. O kwesiri ịbụ bido na abali 21 ruo abali 35 ọ bụla nke Bekee kpọrọ 'cycle.'
  • Nwoke ọbụla kwesiri ịkwado nwaanyị nọ ya nso mgba ọ na nso ọ bụghị ịkpachapụ onye nọ na nso.
  • Ọ bụghị arụ ijekwu nwaanyị nọ na nsọ, ihe ndị na mmekọrịta nwoke na nwaanyị bụ ka o si masị onye, nwaanyị ịhụ nsọ ya bụ ezigbo ihe.
  • Nwaanyi kwesịrị ịgba nsọ ya bido na-abali abụọ rụọ abali asaa, mana mgbe ụfọdụ ọ naghị erucha nke nwere ike ime ka nwaanyị ahụ nwee ike ịtụrụ ime mgbe ọ kwadoghị.
  • Ọ ka mma nwaanyị ịmụ nwa mgbe ọ ka dị afọ iri abụọ rụọ iri atọ na itoolu, afọ nwaanyị na-agbalite, akwa dị ya n'afọ ana-agbatu.
  • Afọ na-arụ gị oge ị nọ na nso nụọ mmiri ọkụ maọbụ were kara ma mmiri ọkụ dote n'afọ gị ka o belata.
  • Oke ahụ mgbu soro nso gị, gaa hụ dọkịta ka ọ gwa gị ihe ị ga-eme

Gaazịa na ya bụ ihe onyonyo maka ihe ndị ọzọ:

Akụkọ ga-amasị gị: