Chief Stephen Osita Osadebe: Ihe mere o jiri bụrụ 'ọ sọ ndị, o wee ndị'

Stephen Osita Osadebe

Ebe foto si, Stephen Osita Osadebe

Nkọwa foto, Aha a na-etu Osadebe bụ Ọsankwa
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Chi ji ehihie jie n'ụbọchị nke iri na otu ọnwa Mee, afọ 2007 dịka akụkọ pụtara na oke osisi adaala n'Atani, Anambara Steeti.

Otiegwu Stephen Osita Osadebe lakwuru ndị ichie ka ọ nọ n'otu ụlọọgwụ na mba Amerịka ebe ọ na-anata nleta maka ọrịa metụtara ọwa e si eku ume.

Aha onyonyo, Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha

Tupu Osabede anwụọ ka ọ gbachara afọ 71, o mere onwe ya aha na Naịjirịa nakwa Afrika dịka ọkaibe n'iti egwu "Highlife, ọkachasị n'afọ 60s, 70s nakwa 80s.

A kpọọ aha ya, ọ na-echetara ọtụtụ ndị okenye ndị otiegwu 'Highlife' kpọtụrụ akpọtụ n'oge ahụ dịka Victor Uwaifo, Eddy Okonta, Orlando Owo, Rex Lawson na ndị ọzọ.

Osadebe, onye a mụrụ n'Atani dị n'okpuruọchịchị Ogbaru n'Anambara Steeti n'afọ 1935, bidoro inwe mmasị n'egwu oge ọ nọ n'ụlọakwụkwọ obere n' Ọnịcha.

Mana ọ bụ oge ọ gbagoro Legọs, ka o jiri egwu mere ọrụ dịka o sonyere n'otu egwu nke E.C Arinze bụ onye kuziri ya egwu.

O mechara gbawa mbọ onwe ya dịka o bidoro otu egwu nke ya ọ kpọrọ 'Nigerian Sound Makers'.

Aha onyonyo, Igbo Music: Gịnị mere ndị ọgbara ọhụrụ Igbo ji eleghara ụbọaka anya?

Efere egwu mbụ ya bụ egwu o wepụtara n'afọ 1958 nke ọ kpọrọ "Adamma".

Agha Biafra mere ka ọtụtụ ndị otiegwu Igbo nọbụ na Legọs lọta n'ala Igbo.

Osadebe so na ndị gbara ọsọ agha ghara klọọb dị na Legọs ma bido ịnọ n'ụlọ 'People's Club of Nigeria' eme ndị mmadụ obiụtọ, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ọgaranya na-ehi odo oge ahụ.

O tipụtara efere egwu, 'Come Again' n'afọ 1965, oge ahụ ka nka ya chawasiri ike.

Aha onyonyo, Oriental Brothers: Maka na m bụ onyeisi, ha chere na m na-eri ego nanị m - Kabaka

Oge ya na ndị 'People's Club' na-atọ ka nnu na mmanụ ka o tiri egwu ya ọ kpọrọ, ' People's Club.'

Ọ sọ ndị, O wee ndị

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'afọ 1984, Osadebe tipụtara egwu ya kachasị wuo ewu nke ọ kpọrọ, "Ọ sọọ ndị, O wee ndị" .

Nke a pụtara na ihe ọma bịara gị, o nwere ndị ọ dị mma n'obi, o nwekwara ndị ọ na-agbarụ obi.

Ọzọ dịka ya bụ na n'ije ụwa, ihe ọbụla mere nwere ndị ọ dabara, nwee ndị ọ ghọrọ ahịa.

Dịka egwu ahụ na-amasị ọtụtụ, ụfọdụ ndị mmadụ na-arụ aka na o nwere ndị maọbụ onye Osadebe ji egwu ahụ ekpechanyere okwu.

Ụfọdụ na-arụ aka na ọ bụ ikpe ka ọ na-ekpesara ogbo ya n'itiegwu 'highlife' bụ Oliver De Coque bụ onye e boro ebubo na ha abụọ kworo ekworo.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana otu onye egwu ochie doro anya bụ Ron Mbataogu sị na ọ bụghị ihe ọhụrụ.

Mgbataogu kwuru na ndị egwu na-eme ihe yiri ibe ya na-ekwosa onwe ha ekworo; dịka otu onye n'ime ha kawa nka, onye ọzọ na-etolite n'ụdị ihe ọ na-eme na-akwatụkarị.

"O mere n'etiti Ebenezer Obey na Sunny Ade; n'etiti Erasmus Jenewari na Rex Lawanson."

" Onye aka ochie na-agbada, o nwee onye ọhụrụ na-emekwa ihe ọ na-eme na-abata, ekworo ga-adị. Ha ga na-atụfere onwe ha okwu site n'egwu ha."

Egwu ndị ọzọ Osadebe tiri

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Egwu ndị ọzọ Osadebe wepụtara nke ruru narị ise n'ọnụọgụgụ.

Ha gụnyere: 'Ndi Ochongonoko' ;" Makọjọ"; 'Onye ike anatago'; Echi Ebuka; Ife Onye Metalụ; 'Onye Lụsịa O lie'; 'E kesịa n'aka a naa n'obi'; 'Ọyọlima'; 'Uche Chukwu ga-eme'; ' Ọnụ kwube' ; 'Ana Masi Ife Uwa'.

Ndị ọzọ gụnyere: 'Ezi Oyi Amaka', Igakam Ogonogo', 'Agbalu Aka Na Azo Ani ' wdg.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Dịka Mbataogu siri kọwaa, ihe ọpụrụiche dị n'egwu Osadebe bụ ilu na okwu o ji eri egwu nakwa ka egwu ya si ada.

Mgbataọgụ sị na "egwu ya na-ada ka egwu ndị ọgaranya. Ọ bụ egwu ngala."

Ọ kọwakwara na ihe mere Osadebe ji wue nnukwu owuwu na 70s na 80s bụ maka ọ bụ isi a hụrụ kwawa okpu na ndị na-etiri "Peoples Club" nke Ọnịcha oge ahụ.

"Peoples Club' bụ otu ndị ọgaranya; ndị na-azụ ahịa n' Ọnịcha na Nnewi oge ahụ."

Ndụ ezinaụlọ Osadebe

Osabedebe nwere ezinaụlọ ma mụtakwa ọtụtụ ụmụ gunyere ;Patrick Okwy Osadebe, Onyinye Osita Osadebe, Stephen Osita Osadebe, Jr., Obiajulu Osadebe na Obiora Osadebe.

Ihe na-agba ndị mmadụ anyammiri maka Osadebe

Onyinye Osadebe

Ebe foto si, Onyinye Osadebe

Nkọwa foto, Onyinye Osadebe bụ nwa Osita Osadebe a na-akpọ 'Afunwa Elota Nna'

Dịka aha ya ka na-aha pụm-pụm ọbụladị afọ iri na atọ ọ nwụchara, ihe na-atụ ndị mmadụ n'anya bụ etu ọnwụ ntụmadị si gbagiri ezinaụlọ ya.

N'afọ 2009, ka o mechara naanị afọ atọ nna ya jiri nwụọ, Obiajulu, ọkpara Osita Osadebe nwụrụ ọnwụ gbawara ezinaụlọ ha na ọtụtụ ndị ihe Osadebe na-amasị obi.

N'afọ 2018, nwa ya ọzọ bụ Okechukwu nwụrụ dịka oke idemmiri buru ya.

N'afọ 2019, nwa ya na-etikwa egwu dịka Osadebe bụ Onyinye Osadebe, onye a ma dịka 'Afunwa Elota Nna' nwụrụ ka ọ rịachara ahụ nwa oge. Ọ gbara naanị afọ iri atọ na anọ mpitia wee kwee.

Mana ma ọ dị ndụ, ma ọ nwụrụ anwụ, mmụọ Osita Osadebe ka chị ọkụ site n' egwu ndị ọ kụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: