Jim Iyke ekwuola eziokwu niile dị ya n'ọnụ maka ndị Igbo, ejije na ndụ ya

Ebe foto si, Jim Iyke Instagram
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onye ama ama na-eme ejije na Nollywood bụ Jim Iyke ekwuola hoha na nsogbu ndị Igbo nwere bụ ajọ ọchịchị.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee 2020.
Gbasara ihe o chere maka Biafra, o kwuru na ihe e ji achọrọ ya bụ atụmaatụ dị mma mana ọ bụghị ihe ga-egbo nsogbu ndị Igbo.
Ọ jụrụ ma a chọta ya, ndị bu ya n'isi a ga-emeli ihe dị n'ịchị ndị Igbo?
O kwuru na ndị Igbo jikọta aka ọnụ kwado onye nke nọ n'ọchịchị dịka agbụrụ ndị ọzọ si eme, a ga-enweta ezigbo ọganihu n'ala Igbo.
Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:
- O kwuru na ya chọrọ ịpụta ịzọ ọchịchị, ọ ga-emegodu nwalee site n'ịkwụ n'azụ onye ọzọ agba siri ike na ndọrọndọrọ ọchịchị
- O kwuru na ọ na-akụziri ụmụaka ya asụsụ Igbo ma na-ekwe nkwa na agbụrụ ya niile ga-asụrịrị Igbo
- O kwuru na o nwebeghị onye Igbo nyerela ya aka na ndụ ya niile
- O kwuru na ọ bụ onye Enugwu-Agidi n'Anambara steeti.
- Gbasara ọyị ya na Nadia Buari, o kwuru na ọ bụghị ọyị niile na-eduba alụm di na nwunye.
- Ọ bụrụ na ị sowe ihe niile na-eme n'elu soshal midia were ya na-ebi ndụ gị, ị ga-efu efu
Gere mkparịtaụka a n'uju ebe a:





