Boko Haram: Gọvanọ Zulum ebugala isi ụlọọrụ ya ihu agha

Ebe foto si, @GovBorno
Gọvanọ Borno steeti bụ Babanga Umara Zulum e nye ntuzịaka ka e buru isi ụlọọrụa ya buga Auno dị na steeti ahụ.
Auno bụ otu n'ime obodo ndị ọlụọ ọla Boko Haram ji n'ọrụ.
Zulum dere nke a n'akara Twitter ya sị na nke a bụ maka ime ka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọrọ nso n'obodo ahụ.
Echiche ya bụ na ọnọdụ ha ga-eme ka ndị omekome ahụ rie mbọ mbọ ọsọ n'obodo ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
E nwere ike ịmachi obodo ọzọ?

Ebe foto si, Getty Images
A ga-etinye mmachibido ịpụta ezi ọzọ ka ọ bụ agaghị etinye?
Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa gwara BBC na ọ bụ n'aka onyeisiala ka ọ dị ikpebi ma a ga-emechi ọzọ, ma ọ tụlechaa etu mbuli mmachi si gaa mgbe izu abụọ e buliri ya gachara.
Ehanire kwukwara na ọ bụ maka na ha amalitela ịba n'ime obodo eme nnyocha ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa ji malite ịrị elu etu ọ dị ugbua.
O kwukwara na ọzọ bụ na ndị mmadụ anaghị ekwe erube isi n'iwu ịnọsapụ anọsapụ gọomentị tinyere.
O kwuru na ọ bụ ihe dịrị ndị isi obodo na ndị isi ofufe dị iche iche ịkọwara ndị na-eso ụzọ ha na iwu gọomentị tinyere bụ maka ọdị mma ha.
Onye anwansị anwụọla

Ebe foto si, FILMMAGIC
Coronavirus egbuola Roy Horn bụ otu onye n'ime mmadụ abụọ e ji ime anwansị mara n'obodo Las Vegas dị na mba Amerịka.
Ya na onye otu ya bụ Siegfried Fischbacher bụ ndị ji anụmanụ eme anwansị.
Horn dị afọ iri asaa na ise mgbe ọnwụ kụrụ ya aka n'ụzọ.
N'egwuregwu,
A ga-enwe ike iwebata ihe ruru mmadụ ise ma a na-eme mgbanwe n'egwuregwu bọọlụ mgbe a ga-amalite ịgba ọzọ.
Fifa nyere ohere ka nke a mee n'asọmpi ndị a ga-agbachapụ n'afọ a, dịka ha na-ekwukwa okwu ịkwụsị iji ihe onyonyo VAR eme mkpebi maka ahụike ndị na-eledo VAR ahụ anya n'ime otu ọnụ ụlọ.
Igwe Umenyiora nke Ogbunike anwụọla

Ebe foto si, Instagram/Fifidilly
Eze ndị Ogbunike bụ Igwe John Ositadimma Umenyiora anwụọla.
E kwuputere maka ọnwụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa a, dịka ọ chịrị site n'afọ 1976 ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ a.
Ọ nọrọ afọ iri anọ na anọ (44) n'oche eze ndị Ogbunike dị n'Anambara steeti.
Ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa!
Lee ihe nwunye nwa ya dere maka ọnwụ ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Mmadụ 386 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa
Mmadụ narị atọ na iri asatọ na isii ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa, dịka ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe efe bụ NCDC si kwuo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'ọnụọgụgụ e wepụtara, mmadụ abụọ ọhụrụ butere ya n'Ebọnyi steeti, otu onye n'Enugwu nakwa onye ọzọ n'Imo steeti.
Ha kwukwara na mmadụ iri asaa na asatọ ọzọ agbakekwuola, ebe mmadụ iri ọzọ nwụrụ tinyere mmadụ otu narị na asaa ha kpọpụtaburu ụbọchị gara aga.
Trump na-agụgụ mmadụ akwa

Ebe foto si, EPA
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump etiela ezinaụlọ Ahmaud Arbery bụ onye a gbagburu ebe ọ na-agba ọsọ, aka n'obi.
Trump kwuru na etu e si gbuo nwaamadi a na-arụ afọ, ma kwuo na ndị uweojii ga-etinyerịrị ya anya ma hụ isi ya.
Son Heung-Min efeela ala nna ya

Ebe foto si, Getty Images
Son Heung-min na-agbara Tottenham bọolụ abụzị onye army?
Son bụ onye mba Saụt Koriya emezuola ofufe ala nna ya dịka onye agha nke ha na-eji izu atọ eme, ma ritekwa nturugo maka ika ndị ọzọ mee ọfụma.











