Islamic State: E gbuola ndị agha Naịjirịa asatọ na Borno steeti

Ebe foto si, RESERVED.GETTY IMAGES
Ndị e chere na ha bụ Boko Haram atụola ogbunigwe gburu ndị agha Naijirịa asatọ ebe ndị ọzọ gbabara n'ọhịa na Monguno, Borno steeti.
Onye akaebe gwara BBC na ọ hụrụ ụgbọala bu ozu ndị agha Naijirịa ka ọ na-abanye ebe obibi ndị agha ka ihe a mechara.
Akụko na-akowa na ndị omekome a buuru ngwaagha ndị Naijirịa mgbe ha wakpochara ha, gbalaga.
O rubeghị izuụka abuọ ka ndị otu Boko Haram wakporo ndị obodo Konduga, Gubio na Magumeri nke Borno Steeti.
Ka ọ dị ugbua, enwebeghi ihe ndịagha Naijirịa kwuru maka nke a.
Benue na Taraba

Ebe foto si, Facebook/Muhammadu Buhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela ọnụ n'ọgụ na mgba dị n'etiti ndị agbụrụ Tiv nke Benue steeti na ndị Jukun nke Taraba steeti nke tara isi otu ụkọchukwu ndị Katọlik abalị atọ gara aga.
O kwuru sị ka ndị gọvanọ steeti abụọ a, ndị eze ha (ọkachasị Tor Tiv na Aku Uka nke Wukari) nakwa ndị ndu ndị ofufe nọ na steeti ahụ gbakọta ọnụ kpaa maka etu a ga-esi hụ na ọgụ na mgba a na-eselitekarị isi, kwụsịrị.
N'okwu ya nke Femi Adesina bụ ọnụ na-ekwuchitere tinyere na Facebook, o kwuru sị "Ogbugbu ụkọchukwu katọlik a gosiri na e kwesịrị ịma ihe a ga-eme maka ọgbaaghara a na-eme ihere, ọsịsọ".
Ọ gakwara n'ihu tie ndị ụka Katọlik, ndị Taraba nakwa gọọmentị steeti ahụ aka n'obi maka ọnwụ ụkọchukwu ahụ.
Lee ihe o kwuru n'uju:
Ụbọchị 100 Ihedioha
Aka na-achị Imo steeti bụ Emeka Ihedioha akwadola ngalaba Entraco n'atụmatụ a kpọrọ "go green, stay clean" dịka o buputere ụfọdụ ihe e ji ekpofu ahịhịa na atịtị na ihe e ji elekọta gburugburu.

Ebe foto si, Imo state government
Ihe ndị dịka ụgbọala e ji ekpo ahịhịa, so na ngwaọrụ o buputere.
N'ofesi,

Ebe foto si, REUTERS
Ihe karịrị puku mmadụ nke gunyere opnyeisiala mba Ivory Coast bụ Alassane Ouattara pụtara maka olili ọnye oti egwu ama ama bụ DJ Arafat.
Dj Arafat onye ezigbo aha ya bụ Ange Didier Huon nwụrụ mgbe onwere ihe mbere nke okporo ụzọ n'elu ọgbatumtum ya ọnwa gara aga.
Ihe ịtụnanya mere dịka ndị omekome a na-akpọ "hackers" na Bekee, tinyere aka ma si n'ọbaokwu onye nwe Twitter bụ Jack Dorsey dee ọtụtụ okwu na-asa afọ.

Ebe foto si, Getty Images
Mana ndị ụlọọrụ Twitter kwuru na ọ bụghị n'aka ha ka aka enwe si baa n'ofe, kama na o si n'aka ụlọọrụ nwe akara ekwentị Dorsey na-eji ebu ọbaokwu ya.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, D'Tigers | Nigeria Basketball
Ndi otu egwu Basket Bọolụ nke Naijiria bụ D'Tigers eriela ọnụma dịka ndị nke Russia jị ọkpu gọọlu iri asatọ na abụọ nke ha satara iri asaa na asaa were merie ha na agba nke mbu n'asọmpị iko mbaụwa nke Basket Ball na China .
Serena Williams
Ọkwa Naịjirịa arịala dịka ha nọzị n'ogogo abụọ na tebulu asọmpi African Games a na-eme na Moroko.
Naịjiria enwetala ọlaedo iri anọ na isii, ọlaọcha iri atọ na atọ nakwa ọlanchara iri anọ na asaa, dịka asọmpi a na-akwado imechi taa.

Ebe foto si, Getty Images
Serena Williams apịabala onwe ya n'agba nke anọ nke asọmpi US Open, dịka o meriri Karolina Muchova.
Cheta na Williams ebuola iko a ugboro isii.
Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











