Rochas Okorocha: Aga m abata Imo mgbe ọbụla m chọrọ, onweghi ihe ga-eme m - Okorocha

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Twitter/Okorocha

Nkọwa foto, Rochas Okorocha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Aka chịburu Imo Steeti bu Rochas Okorocha ekwuola na ya ga na-abata Imo Steeti mgbe ọbụla ọ chọrọ.

Okorocha kwuru na onweghi onye maọbụ ndị ọbụna ga-egbochi ya ịba na steeti ya.

O kwuru nke iji zaghachi gọọmentị Emeka Ihedioha bụ nke nyere iwu ka anwụchie Okorocha mgbe ọbụla a hụrụ ụkwụ ya n'ala Imo.

N'akwụkwọ ozi onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Sam Onwuemeodo zipụrụ n'ehihie Fraidee, Okorocha kwuru na iwu ahụ Ihedioha nyere kụrụ afọ n'ala.

O kwuru na ọbụ okwu na ụka ka gọọmentị Ihedioha na-achọ kpatara o ji wee nye iwu dị otu ahụ.

"O gosikwara na Ihedioha na ndị ọrụ ya enweghị nsọpụrụ n'ebe iwu na-achị Naịjirịa dị."

Onwuemeodo kwuru na ọbụ ezie na Okorocha bizi n'Abuja ugbua, ọgaghị egbochi ya ịbata Imo Steeti mgbe ọbụla ọ chọrọ.

Ọ kpọrọ ụmụ Naịjiri ndị ihe ọma na-adị mma ka ha ghara ịtụ uche n'ihe gbasara i

Emeka Ihedioha

Ebe foto si, Twitter/Ihedioha

Nkọwa foto, Emeka Ihedioha, gọvanọ Imo steeti

BBC Igbo kọbuuru gị na gọvanọ Emeka Ihedioha nyere ikike ka anwụchie Okorocha ebe ọbụla a hụrụ ya na steeti ahụ.

Onye ndụmọdụ Ihedioha n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Steve Osuji gwara BBC Igbo nke n'ụbọchị Fraịde.

Osuji kwụrụ na ebe Okorocha bụ nwata na-ekweghi na nne ya ga ehi ụra, ya bụ nwata agaghịkwa ehi ụra nke ya.

Osuji gara n'ihu kwuo na nke ahụ bụ ntụziaka gọọmentị Ihedioha nyere n'ihi na Okorocha aghọọla ọkwụrụ na-achọ ịkarị onye kụrụ ya.

O kwuru sị: "Anyi agaghị agba nkịtị ka Okorocha kpata nkwafu ọbara n'Imo steeti tupu anyị e mee ihe maka ya."

"Okorocha kwesịrị ịghọta na ọnọzighi n'ọchịchị."

"Anyị agaghịzị ekwe ka ọ kpọọ ọgbakọ ndị mmadụ ọzọ."

Osuji kwukwara na ntụziaka ahụ Ihedioha nyere emegideghi iwu n'ihi na ọbụ iji wee zọọ ndụ ma gbochie ọgbaaghara.

Ọ kọwakwara na ndị uweojii kwadoro ntuziaka ahụ.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ụmụokorobịa wakporo Jasper Ndubuaku, bụ onyeisioche na-ahụ maka mweghachị akụnaụba gọọmentị Imo Steeti.

Ndubuaku kwuru na ọ bụ ndị otu Okorocha wakporo ya ma merụọ ya ahụ n'ụbọchị Tọọzdee.

Ihe onyonyo ebe a wakporo Ndubuaku agbaala kamgbe na soshal midia.

Dịka ihe onyoonyoo ahụ siri gosi, ụmụokorobịa ọnụọgụgụ ha buru ibu chụụrụ Ndubuaku chụbaa ya n'ọwa mmiri dọkachaa ya akwa.

Lee ihe onyoonyoo ahụ dịka otu a kpọrọ "Only In Imo State" siri kee na soshal midia "Facebook".

Jasper Ndubuaku

Ebe foto si, Facebook/Jasper Ndubuaku

Nkọwa foto, Jasper Ndubuaku bu onyeisi ngalaba na-ahu maka ịnakọta akụnaụba gọọmentị ndị mmadụ zuuru n'ohi

Ndubuaku si na ọbụ mgbe ọ gara ịnye Sịnatọ Okorocha Okorocha akwụkwọ si ụlọikpe maka akụnaụba ha sị o bụkọọrọ laa be ya, ka ụmụokorobịa ndị ahụ wakporo ya.

O kwuru sị: "Ha jicha ma mma ma okpiri wee wakpo m. Ekele dịrị Chineke na m ka dị ndụ".

Ọ gakwara n'ihu gụpụta ihe dị ndị ha sị na Sịnetọ Okorocha bụkọọra laa.

Maazị Ndubuaku sị na ha gunyere ụgboala karịrị iri isii nakwa ụgbọ mmiri anọ na-agbasi ike nke ọ sị na ọbụ ụlọọrụ "Niger Delta Development Commission" (NDDC) nyere Imo Steeti.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na nke ọzọ bụ nnukwu ụgbọala e ji agbanwe ọkụ na-enwu n'okporo ụzọ a kpọrọ "street lights" na Bekee.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

N'otu aka ahụ, ode akwụkwọ Imo Steeti bụ Uche Onyeaguocha, kwuru na ndị Imo niile ga-echebiri Okorocha ma nwụchie ya ngwangwa ọ tụrụ ụkwụ na steeti ahụ.

Onyeaguocha kwuru nke a oge ọ na-agwa ọtụtụ ndị mmadụ okwu na ogige ụgbọelu Imo Steeti.

O kwuru na ha ga-achụrụ Okorocha gaa ebe ọbụla ọ nọ ma rukwaa n'Ogboko bụ obodo ya.

BBC gbara mbo ịkpọ ndị uweojii iji mata ihe ha na-eme iji gbochie nnukwu ọgbaaghara ịdapụta na Imo Steeti.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeoku azaghị ekwentị ya. O zaghaghịkwa ozi anyị zigaara ya.

Ihe Okorocha kwuru

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Rochas Okorocha

Sam Onwemeodo, ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha, gwara BBC Igbo na ihe niile Ndubuaku na-ekwu bụ asị asị.

N'ime akwụkwọ ozi o ziteere BBC Igbo, Onwemeodo kwuru na Ndubuaku kpọ ụmụokorobia ruru mmadụ 700 wee wakpo ụlọ Okorocha.

"Ọ bụ mgbe ha chọrọ iwakpo ụlọ Okorocha dị na Sipbat ka ndị mmadụ nọ nso ebe ahụ gbatara bị kwụsị ha".

Onwuemeodo kwukwara na onweghi ikike ụlọikpe ọbụla Ndubuaku ji wee bịa ije ahụ.

Ọ dọkwara gọvanọ Ihedioha aka na ntị ka ọ hapụ ị na-achụgharị Okorocha, kama ya gbado anya n'ọrụ ọchịchị e nyere ya ka ọ chịa.

Aha onyonyo, Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha

Cheta na ọbụ Ndubuaku bu onye ndu ndị gara n'ụlọahịa nwa Okorocha bụ Uloma Nwosu ịga bukọrọ ihe ha sị na e zuru ezu.

Uloma Nwosu bụkwa nwunye Uche Nwosu bụ onye so dọọ ndọrọndọrọ gọvanọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị "Action Alliance" (AA).

Nwosu rụburu ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ Okorocha oge ọ nọ n'ọchịchị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Dora Akunyili: Aka m na-ahụ nwunye m na nrọ