EFCC: Enweghị ọgbaahara mgbe anyị gbachiri 'Rochas Okorocha Foundation College'

Ebe foto si, EFCC
Aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha akpọọla Effcc oku ka ha mee i =he ọbụla ha chọọ ime, hapụ imetọ ya aha ya site na ụdị ozi ha na-agbasa.
Okorocha kwuru nke a dịka akụkọ na-ewu na EFCC agbachiri ụfọdụ ụlọakwụkwọ na ụlọ nke Rochas Okorocha, ndị ezinụlọ ya na nke ndi ụfọdụ ha na ya nwere mmekọ.
Ndị a gbachiri ụlọ ha bụ Uloma Okorocha-Nwosu, Paschal Obi na ogbe ụlọ(estate) nke a rurụ n'aha nwunye Rochas Okorocha bụ Nkechi Okorocha.
Otu onye na-arụru Sịnetọ Okorocha ọrụ achọghị ka ekwuo kwere na ọ mere n'ezie.
Kama ọ gwara BBC Igbo na "o zighi ezi ka ndị EFCC gbachie ụlọakwụkwọ e hibere kemgbe afọ iri na abụọ tupu Rochas Okorocha abata n'ọchịchị".
Ọ rutukwara aka kwuo sị na " ihe a mere aghaghị ibụ aka ọrụ ndị iro."
Ọ kwukwara na umuakwụkwọ ha na-agụ akwụkwọ mgbe ndị EFCC biara chụpụ ha ma gbachie ụlọakwụkwọ ha.
Onyeọrụ EFCC na achọghị ka a kpọọ aha ya kwụrụ na o nweghị onye ha na ya lụrụ ọgụ ma ọ bụ nwee ọgbaghara ọbụla mgbe ha gara igbachị 'Rochas Okorocha Foundation College'.
Onyeọrụ EFCC a na akọwa na nke a bụ usoro ha jị arụ ọru ma ọ bụrụ na onye ha kporo oku ka ọ bịa zara isionwe ya maka nyocha maka mpụ gbasara ego abịaghị.
EFCC gwara BBC na ụmụakwụkwọ nọ ezumike ma kwuo kwa na ha nwere iheama nke onynyo ha ga eji were gosi na onweghi onye ha na ya lụrụ ọgụ .
Lee akwụkwọ ọzi ndị EFCC deputara na Twitter na akọwa ihe mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Rochas Okorocha Foundation
BBC na eche ihe onyonyo igbaama ndị 'Rochas Okorocha Foundation College' kwuru na ha ga ezite.










