Catholic priest killing: E gbuola ụkọchụkwụ Katọlik ọzọ, gbaa ozu ya ọkụ

Ndị uweojii
Nkọwa foto, Ndị uweojii: Anyị na-achọ ndị gburu Fada, gbaa ya ọkụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii Taraba steeti kwuru na ha na-eme nnyocha iji nwụchie ndị gburu ụkọchụkwụ ma gbaa ozu ya ọkụ na Taraba steeti.

Akụkọ kwuru na ndị a mabeghị ndị ha bụ gburu Fada David Tanko nke ụlọụka St.Peters Catholic Church, Amodu, dị n'okpuru ọchịchị Takum, Taraba steeti, oge ya na ndị ogbo ya na-aga maka mkpezi ikpe dị n'etiti ndị Jukun na ndị Tiv ụbọchị Fraide n'ime obodo Kpankufu n'ụzọ Wukari.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Taraba bụ David Misal, gwara BBC Igbo na ya bụ ọdachi mere n'ezie.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọ gara n'ihu kwuo, "Anyị na-esi imi n'ala inweta ndị kpara mkpamkpa ahụ."

Ka ọdị ugbua, onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Adamu Mohammed enyela kọmishọna uweojii Taraba iwu ịchọta ndị mere ya bu ihe.

O nyekwara ndị kọmịshọna ndị uweojii nọgasị na steeti dị icheiche iwu ilebanye pụụ iche na nchekwa ndị ụkọchukwu.

Akụkọ ga-amasị gị: