Ihedioha vs Okorocha: Ọ gịnị n'afịọ n'Imo steeti?

Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha

Ebe foto si, Facebook/Emeka Ihedioha/Rochas Okorocha

Nkọwa foto, Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu maka okwu akpaego Imo steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị a na-eche na ha na-agara gọọmentị Imo steeti ozi n'okpuru ngalaba akpọrọ "Imo State Task Force on Recovery of Government Assets" wakporo ụlọ ahịa akpọrọ House of Freeda n'Owere ụnyaahụ.

Ụlọ ahịa a awakporo bụ nke nwa aka chịbụrụ steeti ahụ bụ Rochas Okorocha.

Ihe a mere ka omere otu ụbọchị ngalaba ahụ wepụtara ebubo na gọọmentị Rochas Okorochaa zuru ụgbọala 67 na akụnaụba ndị ọzọ mgbe ha na-ala.

Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam Onwụemedo gwara BBC Igbo na ndị bịara ije n'ụlọ ahịa nwa Okorocha ji ngwa ọgụ.

Ọ gakwara n'ihu sị na ndị bụkọrọ akụnaụba na ego nke ọ sị na ha ka na-enyocha ịmata ole ọ dị.

Mana, onye ntaakụkọ BBC gbara ajụjụ ọnụ sị na ya so ngalaba ahụ gaa ọrụ n'ulọ ọrụ akpọrọ "Ministry of Happiness" nke nwanne Okorocha bụbụ onyeisi ya.

Onyue ntaakụkọ ahụ achọghi ka ekwuo aha ya sị: "Onweghi ihe fọrọ ebe ahụ. Ma akwa mpio, ebukọrọ ha laa."

Maazị Onwuemedo sị na ọ bụ gọọmentị Imo ka ọdịrị edepụte ihe ha sị na-efu na ebe ọ na-efu.

Ọ sị na njem ngalaba nnakọta akụnaụba a gara bụ imegide ndị onweghị ihe ha mere.

Na sọcial media, ọtụtụ mmadụ na-etinye ọnụ n'okwu a.

Ugo Ebujo bụ onye ọkaiwu sị na gọọmentị Ihedioha si ka ekpe Okorochga ikpe ma ka agharị iji ndị akpụ obi ga ya bụ ije.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

FCC Jones bụbụ ọnụ na-ekwuru Uche Nwosu - bụ onye ọ bu ụlọ ahịa nwunnye ya ka awakporo - sị na adabaghị ị na-emegide azụmahịa ma na-achọ ka ndị mmadu bubata ego na steeti ahụ.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Achiever Darlington Uchenna Onyelike nyere onyeisi ngalaba nnakọta a bụ Jasper Ndubaku ezigbote ekele.

Skip Facebook post, 3

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 3

BBC Igbo gbaliri ịnwete Jasper Ndubaku n'ekwenti mana nke ya gbanyụrụ agbanyụ.

Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii na steeti ahụ bụ Godson Orlando Ikeokwu asaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ.

Akụkọ a ka dị n'ekwu. Anyị ka na-achọ ntụbịrịkọ ya.