Rochas Okorocha: PDP Imo state ekpesala ya n'aka ndị uweojii

Rochas Okorocha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'Imo steeti, ndị otu pati Peoples Democratic Party (PDP) edegarala onyeisi ndị uweojii akwụkwọ mkpesa megide aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha.

Ha kwuru na Okorocha na-akwado atụmatụ dị iche iche ọ ga-esi bute ọgbaaghara, nke ga-eme ka gọọmentị etiti weghara ọchịchị steeti ahụ.

Odeakwụkwọ ndị PDP na steeti ahụ bụ Nze Rar Emeana, dere sị na ha chọrọ ka onyeisi ndị uweojii steeti ahụ tinye anya na ya bụ okwu, makana ha agaghị ejitenwu ndị Imo steeti ma ha bido ịkpa ike.

Gọọmenti Enugu state amalitela ikpochasị ọhịa na steeti ahụ

Ọhịa a na-asụchasị

Gọọmenti Enugwu steeti ebidola ịsụ ọhịa dị n'okporoụzọ awaraawara, iji kpochapụ ebe ndị ntọ na ndị ojiegbeezu na-ezo akpa ike.

Cheta na nso nso a, ndị omekome egbuola ihe gụnyere otu ụkọchukwu nakwa nwaanyị di ime, ma tọrọ otu igwe na nwunye ya.

N'ofesi,

Poland

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, E ji ụgbọelu helịkọpta anọ bịa gbatara ha ọsọ enyemaka

Amụma esegbuola mmadụ atọ so na ndị bịara nlegharị anya ma merụọ 22 ndị ọzọ ahụ ka oke mmiri malitere izo n'ugwu dị na mpaghara ndịda Poland.

Akụkọ si mba ahụ kwuru na otu nwatakịrị dị afọ 13 so na ndị o gburu.

N'egwuregwu,

Ala eriela ihe o! Ifeanyichukwu Chiejine anwụọla ka ọ rịachara obere ọrịa.

Chiejine

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chiejine gbara n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị atọ, Olimpiks abụọ ma butekwa Iko Mba Afrịka anọ

Chiejine, onye gbabuuru otu Super Falcons bọọlụ, nwụrụ n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ọ gbachara afọ iri atọ na isii dịka ozi si NFF siri kwuo.

A chụọla onyeagha gbagburu mmadụ n'Aba n'ọrụ

Ndị ahga Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Ndịagha Naịjirịa nke ngalaba 82 Division achụọla onye otu ha aha ya bụ Ajayi Johnson bụ onye eboro ebubo na ọ gbagburu otu nwata nwoke n'Aba n'ihi na ọ jụrụ inye ya ngarị otu narị naịra.

Ha kwuru na e bu ụzọ kpee Ajayi ikpe dịka iwu ndị agha siri dị ma wetuo ya n'ọkwa tupu ha achụọ ya n'ọrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha n'Enugwu bụ Aliyu Yusuf, kwuru na ha agaghị agba nkịtị ma onye otu ha kpaa agwa na-ekwesịghị ekwesị.

O kwukwara na ha enyefeela Johnson n'aka ndị uweojii ka ha metọpụ nke fọrọ afọ.

Aha onyonyo, Ị ma ihe ịba egwu Ikperikpe ọgụ ndị Ohafia na-erị?

Buhari achụghị Lauretta Onochie

Laureta Onochie

Ebe foto si, Twitter/@Laurestar

Nkọwa foto, Laureta Onochie na-ekwe onyeisiala Buhari n'aka.

Akụkọ na-efegharị na soshial midia bụ na onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ọtụtụ ndị enyemaka ya ọsọ bụ asị asị.

Dịka akwụkwọ ozi si Aso Rock pụta ụnyaahụ kwuru, ma Lauretta Onochie, Bashir Ahmed, Tolu Ogunlesi ka jịcha ọkwa ha jibu mbụ, tinyekwara Femi Adeshina na Garba Shehu.

Buhari họtakwara ogbo ya bu Buhari Sallau dịka onye enyemaka mgbasa ozi. Sallau nọchịrị anya Shaaban Sharada bụ onye bụzị onye omeiwu na Kano Steeti.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị ọzọ a họrọ n'ọrụ ọhụrụ bụ:

Ahmad Zakari - onye enyemaka gbasara ọrụrụ ihe

Obafela Bank-Olemoh - onye enyemaka n'ihe gbasara ịgụ akwụkwọ

Louis Odion - onye enyemaka mgbasa ozi akwụkwọ akụkọ, nakwa

Ajuri Ngelale - onye enyemaka mmekọrịta ọhaneze.

Mba Sudan enweela onyeisiala ọhụrụ

Abdalla Hamdok

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Abdalla Hamdok, Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba Sudan.

N'ofesi, mba Sudan ahọpụtala Abdalla Hamdok dịka Praim Minista ọhụrụ ga-anọ n'ọkwa ruo afọ atọ iji weta ọchịchị ndị agha n'isi njedebe na mba ahụ.

Hamdok rụburu ọrụ dịka otu n'ime ndị welitere isi n'ọgbakọ mba ụwa bụ United Nations.

Chukwueze onye aka nchawa

Samuel Chukwueze, Santi Cazorla na Toko Ekambi.

Ebe foto si, Twitter/@Eng_Villareal

Nkọwa foto, Samuel Chukwueze bụ onye aka nchawa

Otu bọọlụ Villareal nke mba Spain etunyela nwaafọ Igbo bụ Samuel Chukwueze ugo dịka ọgba bọọlụ nwetara aka nchawa n'afọ gara aga.

Toko Ekambi nke mba Cameroon ritekwara onyinye dịka onye kacha nye goolu ebe Santi Cazorla tuuru ugo dịka onye kacha gbaa bọọlụ n'afọ gara aga.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha