Herdsmen crisis: Gọọmenti Enugu state amalitela ikpochasị ọhịa na steeti ahụ

Aha onyonyo, 'Gọọmentị Enugu state sị anyị kpochapụ ebe ndị ntọrị na-ezo'

Gọọmenti Enugwu steeti ekwuola na ihe mere ha ji asụ oke ọhịa dịcha na steeti ahụ bụ "iji gbaa n'anwụ ebe ndị ntọ na ndị ohi na-ezo".

Iji mejuputa nkwa gọọmenti Enugwu kwere banyere nchekwa ndụ na steeti ahụ, ha amalitela ikpocha nnukwu ọhịa dị n'Ihe, Four Corner Ozalla-Udi road wee rue n'Obiagu, Udi.

Ọhịa a na-asụchasị

Ya bụ atụmatụ bụ nke ha kwuru na ọ ga-enye aka hụ na ndị ntọrị, ndị ohi na ndị ogbu mmadụ enweghịzị ebe ha ga-ezo ọzọ.

Ọhịa dị n'okporoụzọ awaraawara
Nkọwa foto, Gọọmenti Enugwu steeti kwuru na ha na-asụ ọhịa dị n'okporoụzọ awaraawara iji chụtee ndị omekeome aka

Mgbe BBC rutere n'ọhịa Four Corner, Akagbe Ugwu nakwa isi Ozalla, ndị ọrụ ha bụ igbutu osisi na-aru ọrụ ha n'ike n'ike.

Lee ihe BBC hụrụ ebe ahụ:

Ọhịa a na-asụchasị
Enugwu steeti na-ekpochasị ọhịa iji gbaa n'anwụ ebe ndị ntọ na ndị ohi na-ezo.
Ọhịa a na-asụchasị

Akụkọ ga-amasị gị: