East security: Kutuo ọgba na nkọrọ dị n'ọhịa Agwu - Gọvanọ Ugwuanyi

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, CPS Enugwu

Dịka okwu nchekwa na-aga n'ihu aka na-achị Enugwu steeti bụ Govanọ Ifeanyi Ugwuanyi enyela iwu ka a kutuo ma sụchapụ ọhia dị n'Agwụ.

O kwuru nke a mgbe ọ gara inyocha ọwa ebe ndị ntọrị na-ezo ma na-esi eri mpọmpọ ọsọ nke dị n'okporoụzọ Enugwu-Pọt Hakụt nke ụmụogbua dị n'okpụrụọchichị Agwụ.

Ọwa ndị Ntorị si a agba ọsọ

Ebe foto si, CPS Enugwu

Nkọwa foto, 'Sụchapụ ohia gbara ọwa a gburugburu' - Gọvanọ Ugwuanyi

Gọvanọ Ugwuanyi gakwara n'ime ohia Ihe-Agbogugu-Ogbaku-Amuri na Isu-Awaa-Agbudu ebe o nyere iwu ka akwatucha ọgba niile dị n'ohia a.

Ugwuanyi ga kwara nyocha n'ebe a na aru ogige obibi ndị agha ndke dịkwa n'okporo ụzọ Enugwu-Pọt Hakụt, na ụmụogbua dị n'okpụrụ ọchichị Ọgwụ

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, CPS Enugwu

Nkọwa foto, Gọvanọ Ugwuanyi gosiri njikere ya ikwusi mkpamkpa ndị ntọrị na ndị omekome ọzọ

Ndị so mee njem a bụ onyeisioche okpuruọchịchị Agwu bụ Stanley Okeke na ndị na-anọchite anya mpaghara "North and South" nke Agwu bụ Jane Eneh na Johnson Chukwuobasi.

Ugwu anyị kwuru na ndi uweojii na ndịagha ga-amalite ọrụ nchekwa na mpaghara a iji kwalite nchekwa ndị mmadụ.

Nyocha ogige ndị agha

Ebe foto si, CPS Enugwu

Nkọwa foto, Gọvanọ Ugwuanyi gakwara nyocha ogige ndị agha a na-arụ.

Cheta na ọ bụ n'Enugwu Steeti ka ndị ntọri tọrọ Igwe Sunday Orji bụ Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu ma mechaa tọhapụ ya.

Enugwu steeti ga kwara n'ihu hiwe ngalaba nchekwa ọhia a kporo "Forest Rangers" n'olu Bekee maka nchekwa ndị ime ọbodo.

Lee Akụkọ Ga-Amasị gị

Lee Ihe Nkịri a

Aha onyonyo, 'Ihe na-agbata m n'uche bú maóbú etu ka m ga-esi laa' - Onye ndị ntọrị nwụchịrị