Enugu state: Nwoke egbuola ibe ya maka otu nzuzo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị jidere nwoke gburu ibe ya

Izuchukwu Ifeacho

Ebe foto si, Nigerian Police

Ndi uweojii n'Enugwu steeti anwuchiela Izuchukwu Ifeacho bụ onye a na-enyo na o gburu otu nwoke aha ya bụ Iruchukwu Nnebe.

Akụkọ kwuru na Ifeacho ji mma sụgbuo Nnebe makana ọ chọrọ ịmanye ya ka ọ banye otu nzuzo ha.

Iruchukwu bụ onye nọ na ọbaozu dị n'Oji River ugbua gbara afọ iri abụọ na ise.

Ha abụọ bụ ndị Amankpunato, okpuruọchịchị Oji River Government.

Ndị uweojii wetere nma eji gbuo ya bụ nwaamadị.

Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti, kwuru na ha na-etinye anya ka ha mata nke bụ eziokwu na ya bụ okwu.

Orji Uzo Kalu na-akwado Femi Gbajabiamila

Femi Gbajabiamila

Ebe foto si, Femi Gbajabiamila/Twitter

Akụkọ na-akọwa na Orji Uzo Kalu bụ aka chịburu Abia steeti, na-akwado Femi Gbajabiamila dịka onyeisi ụlọomeiwu nta.

Arewa Youth Awareness Forum ekwuola na ya bụ nwaamadị amasighị ha dịka onyeisi n'ọgbako nke itoolu.

N'akwụkwọ ha depụtara nke Mohammed Kabir na ndị ọzọ tinyere aka, ha sị na ya bụ nwaamadị etozughi ịchị ya bụ ụlọomeiwu nta.

Trump awchiela UK

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, Onyeisiala Donald Trump nke mba Amerịka awụchiela mba UK n'ụtụtụ Mọnde ime njem nleta na mba ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọtụtụ ndị iwe dị n'obi na-akwado ngagharịiwe dị icheiche ebe ahụ maka ọbịbịa ya.

Lekwa ọtụtụ ebe Trump gara kemgbe ọ bụrụla onyeisiala Amerịka:

Aha onyonyo, Trump na Kagame nwere mkpakorịta na Davos

Jurgen Klopp a ga-achịrị Liverpool gawa?

Jurgen Klopp

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jurgen Klopp dị afọ iri ise

Igbo si na ụra tọwa ụtọ e kwowe ya ekwo. N'ihi ya, ndị isi otu egwu bọọlụ Liverpool na-akwado itinye aka n'akwụkwọ Jurgen Klopp ka ọ chịrị ha gawa.

Nke a na-eme ka ha buchaara Iko Champions League n'izu gara aga.

Akụkọ ga-amasị gị