Akụkọ kachasị n'abalị a: Imechala ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya - PDP
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa
Imechala emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya - Secondus

Ebe foto si, PDP Official Facebook page
Ihe nke ikpeazụ ị ga-eme emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya bụ okwu onyeisioche otu PDP bụ Uche Secondus.
Nke a bụ okwu ọ gwara onyeisiala Mohammadu Buhari n'emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya.
Achụọla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị secọndịrị maka otu nzuzo

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka ụlọakwụkwọ Secọndịrị n'Enugwu achụọla ụmụakwụkwọ itoolu nke Urban Girls Secọndịrị dị n'Enugwu.
Onyeisi oche otu ahụ bụ Ọkaiwu Nestor Ezeme kwuru na-achụrụ ụmụakwụkwọ ndị a maka ị nọ n'otu nzuzo.
Akụkọ mba ofesi;
Otu nwoke egbuola ndị uweojii abụọ na Belgium

Ebe foto si, EPA
Otu nwoke gbaburu ndị uweojii ụmụnwaanyị abụọ na otu onye ọzọ n'obodo Liege dị na Belgium ma kpachie otu nwaanyị bụ onye nzacha na mgbocha ụlọ
Nwoke a bụ onye na-amaghị ebumnobi gbajikwara ndị uweojii abụọ ọzọ ụkwụ tupu egbuo ya.
N'egwuregwu;

Ebe foto si, Getty Images
Onye mịnịsta egwurewgu na ndị ntoroọbịa bụ Solomon Dalung agwala ndị NFF ka ha hapụ ihe ọ bụla gbasara ntuliaka ma lekwasị anya n'iko mba ụwa nke Rọshịa 2018
O kwuru nke a maka nsogbu dị n'etiti Chris Giwa na onyeisi NFF bụ Amaju Pinnick.
Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











