Naịjirịa na Kongo agbaala otu n'otu n'asọmpi enyi na enyi

Ebe foto si, Reuters
Ka Naịjirịa na Kongo zutere onwe ha taa, olileanya ndị kwụ ha n'azụ bụ na mmeri ga-erute ndị nke ha aka.
Ndi ihe a kachasị metụta bụ ndị Naịjirịa makana ha na-ahụ asọmpi a ka ihe ndị Super Eagles ga-eji kwado iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ụbọchị ole na ole na-abịa.
Ka asọmpi ahụ bidoro, ọ dị ka ndị Super Eagles ga-enwere ụbọchị ka Troost-Ekong gbakara ọnụ goolu ndị Kongo na nkeji 14.
Mana, Kongo jiri penariti nye goolu nke ha n'elekere 78. Ngulubi tọghapụrụ ochegoolu Eagles bụ Uzoho were nye goolu ahụ.
Nke a mere ka ha gbaa onwe ha onye lawa onye lawa.





