CHAN 2018: Super Eagles eruola agba nke ikpeazụ

Gabriel

Ebe foto si, Super Eagles Twitter

Nkọwa foto, Gabriel bụ onye nyere ọkpụ golu nyere Naịjirịa mmeri ha meriri Sudan

Naịjirịa eruola agba nke ikpeazụ n'asọmpi CHAN afọ 2018 a na-agba na mba Morocco.

Nke a na-esote mmeri ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles ndị na-agba n'ụlọ meriri mba Sundan n'abalị ụnyaahụ.

Super Eagles gbara ha otu ọkpụ a na-asataghị.

Ọkpụ golu Okechukwu Gabriel nyere golu na mbido ya bụ asọmpi nke nyere ndị Super Eagles ọkwa ebe ha nọ ugbua.

Ha ga-agba ndị otu Atlas Lions nke mba Moroco ụbọchị ụka maka agba nke ikpeazụ asọmpi ahụ.

N'isi ụtụtụ asọmpi ahụ na nkeji iri na abụọ ka ndị Super Eagles nwere ihe imaakanaihu dịka otu onye otu ha bụ Ikechukwu Ezenwa meruru ahụ e wee webata Dele Ajiboye.

Ka nkeji atọ gara, Sudan nwere ọmarịcha ohere ịbụ ndị ndu n'asọmpị ahụ mana Ajiboye hụrụ nke a n'oge ma jikwaa ha.

Mana Naịjirịa hụrụ ohere n'otu nkeji na-eso dịka Gabriel kpara Elhadi Akram wee gbanye bọọlụ ahụ n'ihu golu.

Agbanyeghi mbọ niile ndị otu Falcon nke Jediane gbara, Super Eagles nọ na-edu oge ha gara ezumike ọkara oge.

N'ọkara nke abụọ, Super Eagles nọ na-eyi ha egwu mana adọghachiri ha azụ na nkeji iri ise na asatọ oge a chụpụrụ Ifeanyi Ifeanyi maka ajọ ọkpụkpa.

Ndị Sudan chọrọ iji ohere ahụ gbaa mbọ mana Ajiboye enyeghị ha ohere ọbụla.

Oge ọ fọrọ nkeji atọ ka ha gbasịa, ewebilatakwara ndị Sudan rue mmadụ iri oge e nyere Bakri Bachir kaadị mmemme maka igbatu Solomon Ojo.

Ajiboye dosekwara Naịjirịa n'ihu dịka ọ sọchara Super Easgles ugbo abụọ na nkeji iri itoolu.

Mmeri a Super Eagles meriri Sudan pụtara na ndị Sudan ga-agba ndị otu Mediterranean Knights na Libya ịzọ ọkwa nke atọ ụbọchị Satodee.