Akụkọ kachasị taa: PDP asaala APC okwu
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
PDP asaala APC okwu
Otu PDP ekwuola n'aha Gọọmenti etiti nke APC nọ n'isi ya wepụtala dika ndị ha na-ebo ebubo na ha zuru ego Naijiria n'oge ọchịchị PDP bụ awọ ikpọ awọ ibe ya wọkọ n'ihi na e nwere ọtụ ndị nọ na ọchịchị APC eborola ebubọ mmerụaka aka.

Ebe foto si, PDP Official Facebook page
N'ụbọchị Friadee, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ, Lai Mohammed, wepụtara aha ndị gọọmenti etiti na-ebo ebubo na ha zụrụ ego ala Naijiria n'oge ọchịchị PDP.
Ohaneze agbarala IPOB ọnụ

Otu Ohaneze Ndị Igbo adọla IPOB aka na nti ka ha ghara ịbia mkposa ọgbakọ maka ihazihari Najiria na mpaghara nke a kpọrọ restructuring , nke otu a na akwado.
Nke a mere, ka ha nụtara kepukepu na IPOB chọrọ ịbia kposa ọgbakọ ha na-akwadọ.
Mba Amerịka enyela ọnọdụ ọhụrụ maka inweta akwụkwọ ha

Ebe foto si, Getty Images
Ọchịchị Donald Trump nke Amerika ekwuola na ha ga-ebudo na-enyocha ihe onye obula na-achọ ịnata akwukwo ibata ala ha mere n'igwe okwu sochal midia.
Na egwuregwu, David Warner ejiri anya mmiri riọ mgbaghara

Onye egwuregwu Kriket mba Australia bụ David Warner ejiri anya mmiri riọ mgbaghara maka aka otinyere na wuruwu bọọlu nke mere na mba Saaut Afrika.
A machiri Warner na onye bụbu kaptin bụ Steve Smith otu afọ maka ebubo ikpa bọọlụ aka dịka osi megide iwu na Cape Town.









