Cabinet Inauguration: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Ngige, Onu, Fashola na ndị ọzọ

Onyeisiala Buhari na Chris Ngige
Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na Chris Ngige
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Obi adịghị ndị otu ndịọrụ a kpọrọ "Nigeria Labour Congress" mma etu e si họpụta Chris Ngige dịka mịnịsta na-elekọta ndịọrụ ọzọ.

Ha kwuru na Ngige bụ onye okwu na ụka na-atọ bịrị bịrị.

Yaqub Denja, otu n'ime ndị isi NLC, kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ụbọchị Tọọzde.

Denja kwuru na o wutere ha n'obi nke ukwuu na onyeisiala Muhammadu Buharị họpụtakwara Ngige ọzọ.

"Ọ dị mwute na onyeisiala ga-akpọghachite nwoke a okwu na ụka na-atọ ka nnu."

"Onye na-aghọtaghị ihe gbasara ndị ọrụ. Onye na-amaghị etu e si eweta udo ebe ọgbaaghara dị."

"Mkpọghachi Ngige gosiri na onyeisiala chọrọ ka afọ anọ na-abịa abịa bụrụ nke juputara n'ọgbaghara n'etiti goomentị na ndị ọrụ."

Denja Yaqub

Ebe foto si, Facebook/Denja Yaqub

Nkọwa foto, Denja Yaqub

Denja gara n'ihu kwuo na "ọ bụ Ngige mere na-akwadoghi mbuli ụgwọ ọnwa opekatampe n'oge".

O kwuru na Ngige anaghị eleba anya na mkpesa ndị ọrụ ganye na ha agbaa abụbụ ọrụ.

"Ọ bụru na nghọtahie dị n'etiti ndị ọrụ, Ngige ga-eme ya ka ọkawanye njọ kama ọ ga-eweta ogbugbo."

Denja kwuru na NLC ga-ezipụ akwụkwọ ozi maka nhọpụta Ngige n'oge adịghị anya.

N'otu aka ahụ, Kelechi Nwosu, onye ihe gbasara akụnụba doro anya, kwuru na ndị ọrụ gbara abụbụọrụ ugboro ugboro n'ime afọ anọ gara aga, nke gosiri na Ngige arụghị ọrụ ya nke ọma.

"Ma ndị nkụzi mahadum, ma ndị dibia bekee, ha ncha gbachara abụbụorụ."

"Oleekwanụ ihe e ji kpọghachị ya n'ọrụ."

"Ọ bụ eziokwu na e buliri ego opekatampe ndị ọrụ, mana ọ bụghị ebe ahụ ka okwu bere."

"Ụgwọ ahụ e weliri, a kwụwala ya?"

Ogbonnaya Onu na Adamu Adamu

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ụmụ Naijiria ekwugidela nhọputagharị onyeisiala Buhari họpụtara ụfọdụ ndị mịnịsta dịka Ogbonnaya Onu na Adamu Adamu.

Dịka o siri gbasa Ogbonnaya Onu, Nwosu gwara BBC Igbo na ọtụtụ ndị mịnịsta ahụ ekwesịghị ịlaghachite azụ.

"Onu arụghị ihe ọbụla a hụrụ anya na ngalaba sayensi na teknụzụ."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

"E kwesiri ịhọpụta onye ma ihe ekwe na-akụ dịka mịnịsta teknụzụ.

"Ebe obodo Naijiria nọ n'ihe gbasara ichepụta ihe (innovation) dị anya.

"Ị jụọ m, ekwesịghị iweghachi mịnịsta a ọzọ.

"Ya na mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ (Adamu) bụ otu ihe, he ekwesịghị ka akpọghchị ha n'ọrụ".

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Mịnịsta ndị mere ọfụma

Buhari na-ekele Fashola

Ebe foto si, Twitter/"tundefashola

Nkọwa foto, Buhari na-ekele Fashola

N'aka nke ọzọ, Nwosu kwuru na Fashola, bụ mịnịsta e tinyere na ngalaba ọrụ na ụlọ obibi, mere nke ọma n'agba nke mbụ ya.

O kwuru na Fashola kwesịrị ka a kpọghachi ya azụ.

"I lee anya n'ihe gbasara ịrụ ụzọ, ọ gbalịrị agbalị nke ọma.

"I lekwaa anya n'ihe gbasara ụlọ ọ gbalịkwara.

"Ugbua, e meela ka ngalaba ọrụ na ụlọ dịịrị onwe ya, anyị na-ele anya na ọ ga-eme karịa ka o mere na mbụ."

Zainab Ahmed

Ebe foto si, Twitter/@FinMinNigeria

Nkọwa foto, Zainab Ahmed bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnụba

Gbasara Zainab Ahmed bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnụba, Nwosu kwukwara na olileanya dị na ọ ga-eme ọfuma.

"N'agbanyeghị na ọ bịara ọhụrụ, a na-enye ya nsọpụrụ pụrụ iche n'ihe gbasara atụmatụ akụnụba.

"Ọ ga-na elekọtakwa ngalaba mkpata na mmefu nakwa nhazị obodo.

"Ka anyị legodu ya anya mara ihe ga-apụta n'ime ya."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Vicky Nwogu