Minsterial List: Ihe iwu Naijirịa kwuru maka nhọpụta

Lai Mohammed na Chris Ngige

Ebe foto si, Femi Adesina/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe ji nkịta ọnwụ, ọnyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na a na-akwanye ya ọkụ n'ike iwepụta aha ndị ya na ha ga-arụ ọrụ dịka Minista.

Buhari kwukwara na ndị ya na ha rụbụrụ ọrụ dịka Minista bụ ndị ọ maghị ma ncha, nke mere o jiri sị na ya chọrọ ịhọta ndi ọma ọfụma maka ya bụ ọrụ.

Ndị a ha na Buhari rụrụ ọrụ bụ ndị ọkpopụtara aha ha n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2015 - dịka omere ọnwa anọ ọ malitere ọchịchị.

Ugbua, ọkarịala otu ọnwa Buhari rigooro n'ọkwa ịchị Naịjirịa nke agba atọ ya, uche ọtụtụ mmadu bụ na ọgaghị egbu oge dịka o mere n'afọ 2015.

Kedu ndị a bụ ndị Buhari 'ma ọfụma' ga-abụ Minista?

Minista Buhari

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina

Nkọwa foto, Ndị rụbụrụ Buhari ọrụ dịka minista. A na-eche n'ụfọdụ n'ime ha ga-alaghachite

Agbanyeghi na Onyeisiala Buhari sị na ọ bụ ndị ọma ga-abụ minista, iwu Naịjirịa kwuru na ha ga-abụrịrị ndị si steeti dị iche iche na Naịjirịa.

Ya bụ, steeti niile ga-enweta opekata mpe otu onye ga-abụ minista ukwu maọbụ nke nta.

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Instagram/Bayo Omoboriowo

Nkọwa foto, Muhammadu Buhari Ekwuola na a na-akwa ya ọku maka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka minista

Usoro a bụ ihe iwu jị Naịjirịa - bụ nke Bekee kpọrọ "constitution" - kwuru.

Mpaghara 14 (3) n'ime iwu sị "Ndị ga-eso ọchịchị Naịjirịa maọbụ bụrụ mapaghara gọọmentị ọbụla ga adị n'ụdị ga-emetụta ndi bi na Naịjirịa niile."

Mpaghara a gakwara n'ihu kwuo na usoro nhọpụta a ga-abụ n'ụdị ga-akwalite atụmatụ a akpọrọ "Federal Character", nkwekọrịta obodo nakwa ịhụ na ọbụghị ndị si otu mpaghara n'achị.

Ọzọ, mpaghara nke 171 (5) sị na "Onyeisiala na-arụ ọrụ ya na mpaghara 169 - nke metụtara iwe ndị ga-arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ gọọmentị - ọ ga-etinye atụmatụ "Federal Character" na ịkwado mmekọrịta n'uche."

Dịka Maazị Joe Abah dere na Twitter ya, nhọpụta Minista dị iche na ịhọpụ ndị ga-eso onyeisiala ala dịka Ode Akwụkwọ Ukwu maọbụ Onye Aka Nri - Nke Bekee kpọrọ Secretatry to State Government na Chief of Staff.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a pụtara na ebe dị ka Ọwụwa Anyanwu ga-enwerịri opekata mpe minista ise, dika ọ bu steeti ise dị n'ime ya.

Dan Nwafor bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ APC n'Imo Steeti gwara BBC Igbo na ọ dịịrị Onyeisiala ị họrọ onye obula ọ chọrọ dịka mịnịsta

O kwuru sị, "iwu Naijiria nyere onyeisiala ikike ị họrọ onye ọbụla masịrị ya na steeti ọbụla dị na Naijiria i so ya rụọ ọrụ.

"Anyị na-atụkwa anya na ọ ga-esi na steeti dị n'ala Igbo họrọkwa ndị mmadụ.

"Ekpere anyị bụ na ndị ahụ ọ họọrọ ga-echetakwa na ha bụ ndị nnọchite anya ndị Igbo na kabinet."

Okechukwu Enelamah so na ndi rụbụru Buhari ọrụ dịka minista.

Aha onyonyo, Okechukwu Enelamah: 'Oke mbụbata ahịa anyị na-eme ugbua ga-anyụ anyị anya n'ọdịnihu'