Kelee Buhari n'akịdị ọ gwọrọ ka ọ gwọta ọzọ - Ngige

Ebe foto si, @LabourMinNG
Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka ọrụ kwuru na Naịjirịa gaara ịgba ntụ ma ọ bụrụ na ahọpụtaghi onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọkwọ ụgbọ Naịjirịa.
Ngige onye kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Onicha nke Anambra Steeti, sị na APC bịakwutere Naịjirịa na-ezughi oke mgbe ha were ọchịchị n'aka PDP.
Ọ sịrị na ọ na-eju ya anya na ndị Naịjirịa anaghị akụrụ Buhari aka n'itute akụnaụba Naịjirịa site n'ọnwụnwụ ọnwụrụ.
Mgbe a jụrụ ya maka nsogbu dị na nchekwa, Ngige kwuru "Ekwula naanị maka akụnaụba na nchekwa, onweghi onye gaara eme nke ọma na ngalaba ndị a karịa gọọmentị anyị."
"Achọrọ m ka ị mata otu ihe nke bụ na onye ọzọ ọbụla na-achuso ọnọdụ nchekwa na akụnaụba gaara eme nke ọjọọ karịa."

Ebe foto si, @NGRPresident
"Mgbe anyị batara, ọnụ ego mmanụ gbaturu nke ọjọọ, mana anyị chịkwara akụnaụba pụta n'ime ụbịam."
"Ndị Naịjirịa kwesiri ị na-akụrụ anyị aka kwa ụbọchị, ha kelecha Chineke, ha e kele anyị. N'ihi na Chineke ji Buhari na ụfọdụ n'ime anyị mee ka Naịjirịa gaa n'ihu."
Minista a kwuru na ọchịchị Buhari ekewapụtala ọrụ karịrị nde asatọ site n'ọrụugbo na ụlọ mmepụta nkwa ahịa, kwuo na ọchịchị gara aga tụkwasiri anya naanị na mmanụ.













