Ngige: Anyị ekweghị na-eji otu nde naira kwaa Ekwueme

Ebe foto si, @LabourMinNG
Minista na-ahụ maka ọrụ na ikike ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na onweghị mgbe gọọmentị etiti kwere iji otu nde naira were mee akwamozu Ekwueme.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ego ahụ bụ nke eji akwado ịhe niile ga-eso na akwamozu Ekwueme dịka ịdozi okporo uzo.
Ọ sị na ihe ndị a dị na otu onyonyo na-eme ngaghari maka ndị chọrọ ị nyochapụta nke bụ eziokwu.
Cheta nụ na ebubatara ozu Ekwueme unyahụ n'ụlọ ụgbọ elụ na Abuja ma bụga ya Enugu steeti maka nkwanye ugwu ikpeazu.





